< Jeremías 38 >

1 Sefatías hijo de Matán, Gedalías hijo de Pasur, Jucal hijo de Selemías, y Pasur hijo de Malquías oyeron lo que Jeremías decía a todos:
Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha,
2 Esto es lo que dice el Señor: El que se quede en esta ciudad morirá de guerra, de hambre y de enfermedad, pero el que se pase a los babilonios vivirá. Su recompensa será salvar su vida.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’
3 Esto es lo que dice el Señor: Estén seguros de esto: Jerusalén será entregada al ejército del rey de Babilonia. Él va a capturarla.
Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’”
4 Los oficiales le dijeron al rey: “Este hombre merece morir porque está desmoralizando a los defensores que quedan en la ciudad, y también a todo el pueblo, al decirles esto. Este hombre no trata de ayudar a esta gente, sólo va a destruirla”.
Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”
5 “Bueno, puedes hacer lo que quieras con él”, respondió el rey Sedequías. “No puedo detenerte”.
Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”
6 Así que tomaron a Jeremías y lo pusieron en la cisterna que pertenecía a Malquías, el hijo del rey, que estaba en el patio de la guardia. Bajaron a Jeremías con cuerdas a la cisterna. No tenía agua, sólo barro, y Jeremías se hundió en el barro.
Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.
7 Ebed-melec el cusita, un funcionario real del palacio del rey, descubrió que habían metido a Jeremías en la cisterna. El rey estaba sentado en la puerta de Benjamín,
Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin,
8 Entonces Ebed-melec salió del palacio y fue a hablar con el rey
Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya,
9 “Mi señor el rey, todas estas cosas terribles que estos hombres le han hecho al profeta Jeremías son malas. Lo han metido en la cisterna, y allí morirá de hambre porque ya no queda pan en la ciudad”.
“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”
10 Entonces el rey dio la orden a Ebed-melec el cusita: “Toma treinta hombres contigo y ve a sacar al profeta Jeremías de la cisterna antes de que muera”.
Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”
11 Ebed-melec tomó a los hombres y se dirigió al almacén bajo el palacio. Tomó de allí algunos trapos y ropas viejas y se dirigió a la cisterna donde los bajó con cuerdas a Jeremías.
Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.
12 Ebed-melec, el cusita, llamó a Jeremías: “Ponte estos trapos y ropas viejas bajo los brazos para protegerte de las cuerdas”. Jeremías así lo hizo,
Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya.
13 y con las cuerdas lo levantaron y lo sacaron de la cisterna. Jeremías se quedó allí en el patio de la guardia.
Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.
14 Entonces el rey Sedequías mandó llamar al profeta Jeremías y se reunió con él en la tercera entrada del Templo. “Necesito pedirte algo”, le dijo el rey a Jeremías. “No debes ocultarme nada”.
Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
15 “Si te lo digo, seguro que haces que me maten”, respondió Jeremías. “Aunque te diera un consejo, de todos modos no me escucharías”.
Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”
16 El rey Sedequías le prometió solemnemente a Jeremías en privado: “Vive el Señor, que nos dio esta vida, que no te haré matar, ni te entregaré a los que quieren matarte”.
Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”
17 Entonces Jeremías le dijo a Sedequías: “Esto es lo que dice el Señor Dios Todopoderoso, el Dios de Israel: ‘Si te entregas a los oficiales del rey de Babilonia, entonces vivirás. Jerusalén no será incendiada, y tú y tu familia sobrevivirán.
Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.
18 Pero si no te entregas a los oficiales del rey de Babilonia, esta ciudad será entregada a los babilonios. Ellos la incendiarán, y tú mismo no escaparás de ser capturado’”.
Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’”
19 Pero el rey Sedequías le dijo a Jeremías: “Tengo miedo de la gente de Judá que se ha pasado a los babilonios, porque los babilonios podrían entregarme a ellos para que abusen de mí”.
Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”
20 “No te entregarán”, respondió Jeremías. “Si obedeces lo que dice el Señor haciendo lo que te digo, las cosas te irán bien y vivirás.
“Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị.
21 Pero si te niegas a entregarte, esto es lo que me ha dicho el Señor:
Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:
22 Todas las mujeres que queden en el palacio del rey de Judá serán sacadas y entregadas a los funcionarios del rey de Babilonia Esas mujeres dirán: ‘¡Esos buenos amigos tuyos! Te han acogido y te han conquistado. Tus pies se atascaron en el medio, por lo que te abandonaron’.
A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
23 Todas tus esposas e hijos serán entregados a los caldeos. Y tú mismo no escaparás, pues serás capturado por el rey de Babilonia, y Jerusalén será incendiada”.
“A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.”
24 Sedequías advirtió a Jeremías: “Nadie puede enterarse de esta conversación, pues de lo contrario morirás.
Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ.
25 Si los oficiales se enteran de que he hablado contigo, y vienen a preguntarte: ‘¡Dinos de qué hablaron tú y el rey! No nos ocultes nada, o te mataremos;’
Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’
26 entonces les dirás: ‘Le estaba pidiendo al rey que me concediera mi petición de no devolverme a la casa de Jonatán para morir allí’”.
mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’”
27 Cuando todos los oficiales vinieron a Jeremías queriendo saber, él les repitió exactamente lo que el rey le había dicho que dijera. Entonces no le preguntaron nada más, porque nadie había oído lo que se había dicho.
Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru.
28 Jeremías permaneció allí, en el patio de la guardia, hasta el día en que Jerusalén fue capturada.
Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. Otu a ka esi were Jerusalem.

< Jeremías 38 >