< Первая книга Паралипоменон 10 >
1 Филистими же воеваша противу Израиля, и бежаша мужие Израилевы от лица иноплеменническа и падоша ранени на горе Гелвуи.
Nʼoge a ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
2 И погнаша иноплеменницы вслед Саула и вслед сынов его: и убиша иноплеменницы Ионафана и Аминадава и Мелхисуа, сынов Сауловых.
Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
3 И отягчися брань на Саула, и обретоша его стрелцы в луках и в трудех, и изнеможе от стрел.
Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ.
4 И рече Саул к носящему оружие его: извлецы мечь твой и прободи мя им, да не когда приидут необрезаннии сии и поругаются мне. И не восхоте носяй оружие его, яко убояся зело. И взя Саул мечь и нападе нань.
Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
5 И виде носяй оружие его, яко умре Саул, и нападе и он на мечь свой и умре.
Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa.
6 И умре Саул и три сына его в день он: и весь дом его купно умре.
Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ.
7 И видеша вси мужие Израилевы, иже во юдоли, яко побежа Израиль, и яко умре Саул и сынове его, и оставиша грады своя и побегоша: и приидоша иноплеменницы и вселишася в них.
Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
8 И бысть заутра, и приидоша иноплеменницы совлачати падших корысти, и обретоша Саула и сынов его падших на горе Гелвуи:
Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
9 и обнажиша его, и взяша главу его и оружие его, и послаша в землю иноплеменничу, да обносится (и покажется) идолом их и людем:
Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile.
10 оружия же их положиша в капищи бога своего: и главу его поткнуша в капищи Дагонове.
Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn.
11 И услышаша вси живущии во Иависе Галаадстем вся, яже Филистими сотвориша Саулу и сыном его и Израилю:
Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
12 и восташа от Галаада вси мужие крепцыи, и приидоша и взяша труп Саулов и труп сынов его, и принесоша их во Иавис, и погребоша кости их под дубом во Иависе: и постишася седмь дний.
ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
13 И умре Саул за беззакония своя, имиже беззаконнова Господеви по словеси Господню, понеже не сохрани, яко вопроси Саул волшебницы еже вопросити, и отвеща ему Самуил пророк.
Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase,
14 И не взыска Господа Саул: сего ради уби его и возврати царство его Давиду сыну Иессееву.
ma ọ jụghị ase site nʼọnụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere Onyenwe anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.