< Mabasa 15 >
1 Zvino vamwe vakaburuka kubva kuJudhiya, vakadzidzisa hama kuti: Kana musingadzingiswi netsika yaMozisi, hamugoni kuponeswa.
Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”
2 Naizvozvo, kwakati kwava nekupesana nekupikisana kusati kuri kudiki kwaPauro naBhanabhasi navo, vakaronga kuti Pauro naBhanabhasi nevamwezve vavo vakwire kuJerusarema kuvaapositori nevakuru, pamusoro peshoko iri.
Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.
3 Naizvozvo vakati vachiperekedzwa nekereke, vakagura neFenike neSamaria, vachirondedzera zvekutendeuka kwevahedheni; vakaitira hama dzese mufaro mukuru.
Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.
4 Zvino vakati vasvika kuJerusarema, vakagamuchirwa nekereke nevaapositori nevakuru, vakarondedzera zvese Mwari zvaakaita navo.
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.
5 Asi kwakamuka vamwe vebato reVaFarisi vaitenda, vachiti: Zvinofanira kuvadzingisa, nekuvaraira kuchengeta murairo waMozisi.
Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”
6 Vaapositori nevakuru vakaungana pamwe kuti vaongorore zveshoko iri.
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
7 Zvino kwakava nekukakavadzana kukuru, Petro wakasimuka akati kwavari: Varume hama, imwi munoziva kuti kubva pamazuva akare Mwari wakasarudza pakati pedu, kuti nemuromo wangu vahedheni vanzwe shoko reevhangeri, uye vatende.
Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.
8 Uye Mwari muzivi wemoyo wakapupura kwavari, achivapa Mweya Mutsvene, sekwatiriwo;
Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.
9 uye haana kuisa mutsauko pakati pedu navo, achichenura moyo yavo nerutendo.
O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.
10 Naizvozvo ikozvino munoidzirei Mwari, kuisa joko pamutsipa wevadzidzi, ratisina kugona kutakura kana madzibaba edu kana isu?
Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ?
11 Asi nenyasha dzaIshe Jesu Kristu tinotenda kuti tinoponeswa, nenzira imwe savowo.
Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”
12 Chaunga chese ndokunyarara; ndokuteerera Bhanabhasi naPauro vachirondedzera kuti zvikuru sei zviratidzo nezvishamiso Mwari zvaakaita navo pakati pevahedheni.
Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.
13 Zvino ivo vakati vanyarara, Jakobho akapindura achiti: Varume hama, nditeererei:
Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
14 Simioni warondedzera kuti Mwari wakashanyira vahedheni sei pakutanga kuti atorere zita rake vanhu kwavari.
Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
15 Nemashoko evaporofita anobvumirana neizvi, sezvazvakanyorwa zvichinzi:
Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
16 Shure kweizvi ndichadzoka, uye ndichavakazve tabhenakeri yaDhavhidhi yakawa; uye ndichavakazve matongo aro, uye ndicharimisazve;
“‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
17 kuti vakasara vevanhu vatsvake Ishe, nevechirudzi vese, pavanodanwa nezita rangu, ndizvo zvinoreva Ishe anoita zvinhu izvi zvese.
ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
18 Anozikanwa kuna Mwari mabasa ake ese kubva pakusingaperi. (aiōn )
Nke a amaara site na mgbe ochie. (aiōn )
19 Naizvozvi ini ndinogura kuti tirege kutambudza vakabva kuvahedheni vakatendeukira kuna Mwari;
“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
20 asi tivanyorere kuti vabve pazvakashatiswa zvezvifananidzo neupombwe nezvakadzipwa neropa.
kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
21 Nokuti Mozisi anavo kubva pamazera akare vanomuparidza paguta rimwe nerimwe, achiverengwa mumasinagoge sabata rimwe nerimwe.
Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”
22 Ipapo zvikaonekwa zvakanaka kuvaapositori nevakuru vane kereke yese, kuti vatume varume vakasarudzwa pakati pavo kuAndiyokiya pamwe naPauro naBhanabhasi: Judhasi wainzi Bharisabhasi, naSirasi, varume vatungamiriri pakati pehama,
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.
23 vakanyora seizvi neruoko rwavo: Vaapositori nevakuru nehama, kuhama dzekuvahedheni paAndiyokiya neSiriya neKirikia, kwaziwai;
Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.
24 sezvatakanzwa kuti vamwe vakabuda kwatiri vakakutambudzai nemashoko, vachikanganisa mweya yenyu, vachiti mudzingiswe nekuchengeta murairo, ivo vatisina kuraira;
E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.
25 zvaonekwa zvakanaka kwatiri tava nemoyo umwe, kutuma kwamuri varume vakasarudzwa, pamwe nevadikanwi vedu Bhanabhasi naPauro,
Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,
26 vanhu vakazvipira upenyu hwavo nekuda kwezita raIshe wedu Jesu Kristu.
ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
27 Naizvozvo tatuma Judhasi naSirasi, ivo vachataurawo zvimwe chete neshoko remuromo.
Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.
28 Nokuti zvakaonekwa zvakanaka kuMweya Mutsvene, nekwatiri, kuti tirege kuchikutakudzai mutoro mukuru, kunze kwezvinhu izvi zvakafanira:
Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa.
29 Kuti mubve pazvakabairwa zvifananidzo neropa nechakadzipwa neupombwe; kana mukazvisunungura pazviri, muchaita zvakanaka. Sarai zvakanaka.
Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.
30 Zvino vakati vaendeswa vakasvika kuAndiyokiya; vakati vaunganidza chaunga, vakakumikidza tsamba.
Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ.
31 Zvino vakati vaverenga, vakafara pamusoro pekukurudzirwa.
Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara.
32 Judhasiwo naSirasi, vaiva vaporofitawo pachavo, vakakurudzira hama nenhaurwa zhinji, nekuvasimbisa.
Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.
33 Vakati vagara kwenguva, vakaendeswa nehama murugare kuvaapositori,
Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.
34 asi zvakaonekwa zvakanaka kuna Sirasi kuti asarepo.
Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.
35 Paurowo naBhanabhasi vakasara muAndiyokiya vachidzidzisa nekuparidza shoko raIshe, nevamwewo vazhinji.
Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.
36 Zvino shure kwemamwe mazuva Pauro wakati kuna Bhanabhasi: Ngatidzokere ikozvino tishanyire hama dzedu muguta rimwe nerimwe, matakaparidza shoko raIshe, tione kuti vakadini.
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”
37 Zvino Bhanabhasi wakange aronga kutora Johwani wainzi Mariko, kuti afambe navo.
Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.
38 Asi Pauro wakafunga kuti zvakanaka kusamutora afambe navo uyu wakavasiya kubva paPamufiriya, akasaenda navo kubasa.
Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.
39 Zvino kwakauya kukakavadzana kukuru, zvekuti vakaparadzana, umwe kubva kune umwe; Bhanabhasi ndokutora Mariko kufamba naye, akaenda kuSaipuresi nechikepe;
Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
40 asi Pauro wakasarudza Sirasi akabuda akaenda, akumikidzwa nehama panyasha dzaMwari.
Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.
41 Ndokugura neSiriya neKirikia, achisimbisa makereke.
O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.