< Zvakazarurwa 1 >
1 Zvakazarurwa zvaJesu Kristu, zvaakapiwa naMwari kuti aratidze varanda vake zvinofanira kuitika nokukurumidza. Akazvizivisa nokutumira kwaakaita mutumwa wake kumuranda wake Johani,
Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,
2 iye anopupura zvose zvaakaona, iro shoko raMwari uye nouchapupu hwaJesu Kristu.
onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst.
3 Akaropafadzwa uyo anoverenga mashoko ouprofita uhu, uye vakaropafadzwa avo vanohunzwa uye vagochengeta pamwoyo yavo zvakanyorwa imomo, nokuti nguva yava pedyo.
Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.
4 Johani, kukereke nomwe dziri mudunhu reEzhia: Nyasha norugare ngazvive nemi zvinobva kuna iye aripo, uye akanga aripo, naiye achazouya, nokumweya minomwe iri pamberi pechigaro chake choushe,
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,
5 nokuna Jesu Kristu, iye chapupu chakatendeka, dangwe kubva kuvakafa, nomutongi wamadzimambo enyika. Kuna iye anotida uye akatisunungura kubva kuzvivi zvedu neropa rake,
sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.
6 uye akatiita ushe nouprista kuti tishumire Mwari naBaba vake, ngaave nokubwinya nesimba nokusingaperi-peri! Ameni. (aiōn )
O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn )
7 Tarirai, ari kuuya namakore, uye meso ose achamuona, kunyange naivo vakamubaya; uye marudzi ose enyika achachema nokuda kwake.
“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
8 “Ndini Arifa naOmega,” ndizvo zvinotaura Ishe Mwari, “iye aripo, akanga aripo, uye achazouya, Wamasimba Ose.”
Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
9 Ini Johani, hama yenyu nomufambidzani wenyu mumatambudziko, muumambo, nomukutsungirira nomwoyo murefu wedu muna Jesu, ndakanga ndiri pachitsuwa chePatimosi nokuda kweshoko raMwari uye nouchapupu hwaJesu.
Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
10 Pazuva raShe, ndakanga ndiri muMweya, uye ndikanzwa mushure mangu inzwi guru rinenge rehwamanda,
Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
11 richiti, “Nyora mubhuku rakapetwa zvaunoona ugozvitumira kukereke nomwe: dzokuEfeso, Simina, Pegamo, Tiatira, Sadhisi, Firadherifia neRaodhikea.”
na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”
12 Ndakatendeuka ndikatarisa kuti ndione inzwi rakanga richitaura kwandiri. Uye ndakatendeuka ndikaona zvigadziko zvemwenje,
Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ.
13 uye pakati pezvigadziko zvemwenje pakanga pano mumwe akanga “akaita somwanakomana womunhu,” akafuka nguo yaisvika kutsoka dzake uye ane bhanhire regoridhe pachipfuva chake.
Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.
14 Musoro wake nebvudzi rake zvakanga zvakachena samakushe, zvakachena sechando, uye meso ake akanga akaita somurazvo womoto.
Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
15 Tsoka dzake dzakanga dzakaita sendarira inopenya muvira romoto, uye inzwi rake rakanga rakaita somubvumo wemvura zhinji.
Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
16 Akanga akabata nyeredzi nomwe muruoko rwake rworudyi, uye mumuromo make makabuda munondo unopinza, unocheka mativi ose. Chiso chake chakanga chakaita sezuva rinopenya nokupenya kwaro kwose.
O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
17 Pandakamuona, ndakawira patsoka dzake kunge ndafa. Ipapo akaisa ruoko rwake rworudyi pamusoro pangu akati, “Usatya. Ndini Wokutanga neWokupedzisira.
Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.
18 Ndini iye Mupenyu; ndakanga ndafa, uye tarira, ndiri mupenyu nokusingaperi-peri! Uye ndakabata kiyi dzorufu neHadhesi. (aiōn , Hadēs )
Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. (aiōn , Hadēs )
19 “Naizvozvo, nyora zvawaona, zviripo zvino nezvichazoitika shure kwaizvozvi.
“Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.
20 Chakavanzika chenyeredzi nomwe dzawaona muruoko rwangu rworudyi nechezvigadziko zvinomwe zvemwenje ndechichi: Nyeredzi nomwe ndivo vatumwa vekereke nomwe, uye zvigadziko zvinomwe zvemwenje ndidzo kereke nomwe.
Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.