< Zvakazarurwa 20 >
1 Uye ndakaona mutumwa achiburuka kubva kudenga, ane kiyi dzokugomba rakadzika zvisina mugumo uye akanga akabata ngetani huru muruoko rwake. (Abyssos )
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. (Abyssos )
2 Akabata shato, iyo nyoka yakare, anova ndiye dhiabhori, kana kuti Satani, uye akamusunga kwamakore chiuru.
O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ.
3 Akamukanda mugomba rakadzika zvisina mugumo, akarikiya, akaisa chisimbiso pamusoro pake, kuti amudzivise kuzonyengerazve ndudzi kusvikira makore chiuru apera. Shure kwaizvozvo, anofanira kusunungurwa kwechinguva chiduku. (Abyssos )
Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. (Abyssos )
4 Ndakaona zvigaro zvoushe zvakanga zvakagarwa navaya vakanga vapiwa simba rokutonga. Uye ndakaona mweya yavaya vakanga vagurwa misoro nokuda kwokupupura kwavo nezvaJesu uye nokuda kweshoko raMwari. Vakanga vasina kunamata chikara kana mufananidzo wacho uye vakanga vasina kugamuchira mucherechedzo pahuma dzavo kana pamaoko avo. Vakararama vakatonga pamwe chete naJesu kwamakore chiuru.
Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.
5 Vamwe vakafa havana kurarama kusvikira makore chiuru apera. Uku ndiko kumuka kwokutanga.
Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.
6 Vakaropafadzwa uye vatsvene, avo vano mugove pakumuka kwokutanga. Rufu rwechipiri haruna simba pamusoro pavo, asi vachava vaprista vaMwari nevaKristu uye vachatonga pamwe chete naye kwamakore chiuru.
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.
7 Makore chiuru paanopera, Satani achasunungurwa kubva mutorongo rake
Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.
8 uye achabuda kundonyengera ndudzi dziri kumativi mana enyika, Gogi naMagogi, kuti avaunganidzire kundorwa. Vakawanda sejecha rokumahombekombe egungwa.
Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.
9 Vakafamba vachidimbura napaupamhi hwenyika vakakomba misasa yavanhu vaMwari, iro guta raanoda. Asi moto wakaburuka uchibva kudenga ukavaparadza.
Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.
10 Uye dhiabhori, uyo akavanyengera, akakandwa mudziva rinopfuta nesafuri, makanga makandwa chikara nomuprofita wenhema. Vacharwadziwa masikati nousiku nokusingaperi-peri. (aiōn , Limnē Pyr )
Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn , Limnē Pyr )
11 Ipapo ndakaona chigaro chikuru chichena naiye akanga agere pachiri. Nyika nedenga zvakatiza pamberi pake, zvikashayirwa nzvimbo.
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.
12 Uye ndakaona vakafa, vakuru navaduku, vamire pamberi pechigaro choushe, uye mabhuku akazarurwa. Rimwe bhuku rakazarurwa, iro bhuku roupenyu. Vakafa vakatongwa maererano nezvavakanga vaita sezvazvakanga zvakanyorwa mumabhuku.
Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
13 Gungwa rakabudisa vakafa vakanga vari mariri, uye rufu neHadhesi zvakabudisa vakafa vakanga vari mazviri, uye munhu mumwe nomumwe akatongwa sezvaakabata. (Hadēs )
Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. (Hadēs )
14 Ipapo rufu neHadhesi zvakakandwa mudziva romoto. Dziva romoto ndirwo rufu rwechipiri. (Hadēs , Limnē Pyr )
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. (Hadēs , Limnē Pyr )
15 Kana munhu akawanikwa zita rake risina kunyorwa mubhuku roupenyu, akakandwa mudziva romoto. (Limnē Pyr )
Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. (Limnē Pyr )