< Zvirevo 3 >
1 Mwanakomana wangu, usakanganwa kudzidzisa kwangu, asi uchengete mirayiro yangu mumwoyo mako,
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.
2 nokuti zvichawedzera makore mazhinji kuupenyu hwako, uye nokubudirira.
Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
3 Rudo nokutendeka ngazvirege kukusiya; uzvisungirire pamutsipa wako, zvinyore pahwendefa romwoyo wako.
Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4 Ipapo uchawana nyasha nezita rakanaka pamberi paMwari navanhu.
Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
5 Vimba naJehovha nomwoyo wako wose urege kuzendamira panjere dzako;
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
6 munzira dzako dzose umutungamidze, uye acharuramisa nzira dzako.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
7 Usazviita munhu akachenjera pamaonero ako; itya Jehovha uvenge zvakaipa.
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8 Izvi zvichava utano pamuviri wako uye nokusimbiswa kwamapfupa ako.
Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
9 Kudza Jehovha nepfuma yako, zvokutanga zvezvirimwa zvako;
Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
10 ipapo matura ako achazadzwa kusvikira pakufashukira, uye makate ako achazara kusvika pamusoro newaini itsva.
Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
11 Mwanakomana wangu, usazvidza kuranga kwaJehovha, uye usatsamwira kutsiura kwake,
Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
12 nokuti Jehovha anoranga avo vaanoda, sababa nomwanakomana wavanofarira.
Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
13 Akaropafadzwa munhu anowana uchenjeri, munhu anowana kunzwisisa,
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
14 nokuti hwakanyanya kunaka kupfuura sirivha, uye hunopfumisa kupfuura goridhe.
Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15 Hunokosha kupfuura marubhi; zvose zvaunoshuva hazvingafananidzwi nahwo.
Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
16 Mazuva mazhinji oupenyu ari muruoko rwahwo rworudyi; muruboshwe rwahwo mune upfumi nokukudzwa.
Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
17 Nzira dzahwo dzinofadza, uye makwara ahwo ose rugare.
Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
18 Ndihwo muti woupenyu kuna vose vanohumbundikira; vose vanohubata vacharopafadzwa.
Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
19 Nouchenjeri Jehovha akateya nheyo dzenyika, nokunzwisisa akaisa matenga munzvimbo dzawo;
Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
20 noruzivo rwake mvura dzakadzika dzakapatsanurwa, uye makore akadonhedza dova.
Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
21 Mwanakomana wangu, chengetedza kutonga kwakanaka nokungwara, usazvirega zvichibva pameso ako;
Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
22 zvichava upenyu kwauri, chishongo chakanaka pamutsipa wako.
nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
23 Ipapo uchafamba panzira yako murugare, uye rutsoka rwako harungagumburwi;
Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
24 paunovata pasi, haungatyi; paunovata pasi, hope dzako dzichava dzakanaka.
Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
25 Usatya zvako dambudziko rinovhundutsa kana kuparadza kunokunda vakaipa,
Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
26 nokuti Jehovha achava chivimbo chako uye achachengeta rutsoka rwako kuti rurege kubatwa.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
27 Usarega kuitira zvakanaka kuno uyo akafanirwa nazvo, kana zviri musimba rako kuzviita.
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
28 Usati kumuvakidzani wako, “Ugodzoka imwe nguva; ndichazokupa mangwana,” iwe uchitova nazvo pauri.
A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
29 Usaronga kuitira muvakidzani wako zvakaipa, anogara nechivimbo pedyo newe.
Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
30 Usapomera munhu mhosva pasina chikonzero, iye asina zvaakutadzira.
Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
31 Usachiva munhu anoita zvinhu nechisimba, kana kusarudza ipi zvayo yenzira dzake,
Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.
32 nokuti Jehovha anovenga munhu akatsauka, asi anoudza akarurama zvaanoda kuita.
Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
33 Kutuka kwaJehovha kuri paimba yeakaipa, asi anoropafadza musha womunhu akarurama.
Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
34 Anoseka vaseki vanozvikudza, asi anoitira nyasha vanozvininipisa.
Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
35 Vakachenjera vanowana kukudzwa, asi mapenzi anozviwanira kunyadziswa.
Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.