< Zvirevo 20 >
1 Waini museki uye doro mupopoti; ani naani anotsauswa nazvo haana kuchenjera.
Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
2 Kutsamwa kwamambo kwakafanana nokuomba kweshumba; uyo anomutsamwisa anotadzira upenyu hwake.
Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
3 Munhu achakudzwa kana akagara kure nokukakavara, asi benzi rimwe nerimwe rinokurumidza kupopota.
Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
4 Simbe hairimi mumwaka wokurima; saka panguva yokukohwa anotsvaka asi hapana chaanowana.
Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
5 Zvinangwa zvomwoyo womunhu imvura yakadzika, asi munhu akachenjera achaichera.
Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
6 Vanhu vazhinji vanoti vane rudo rusingagumi, asi munhu akatendeka angawanikwa kupiko?
Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
7 Munhu akarurama anorarama upenyu hwakanaka; vana vake vanomutevera vakaropafadzwa.
Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
8 Kana mambo achinge agara pachigaro chake kuti atonge, anopepeta zvakaipa zvose nameso ake.
Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
9 Ndiani angati, “Ndakachengeta mwoyo wangu wakachena; ndakachena uye handina zvivi”?
Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
10 Zviereso zvakasiyana nezvipimo zvakasiyana Jehovha anozvivenga zvose.
Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
11 Kunyange mwana anozivikanwa nezvaanoita, kuti tsika dzake dzakanaka uye kuti dzakarurama here.
Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
12 Nzeve dzinonzwa nameso anoona, Jehovha ndiye akazviita zvose zviri zviviri.
Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
13 Usafarira kurara kana kuti uchava murombo; svinudza meso ako ipapo uchava nezvokudya zvakawanda.
Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
14 “Hazvina kunaka, hazvina kunaka!” ndizvo zvinotaura mutengi; ipapo hoyo oenda achizvirumbidza pamusoro pezvaatenga.
“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
15 Goridhe riripo, uye matombo anokosha amarubhi azere, asi miromo inotaura zivo ndicho chinhu chinokosha chisipo.
Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
16 Mutorerei nguo yake, uyo anoitira mutorwa rubatso; itorei sorubatso kana azviitira mukadzi asingazvibati.
Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
17 Zvokudya zvakawanikwa nokunyengera zvinonaka kumunhu, asi achapedzisira ava nomukanwa mazara jecha.
Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
18 Ita urongwa nokutsvaga mazano; kana uchironga hondo, tsvaka kutungamirirwa.
Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
19 Guhwa rinoputsa chivimbo; saka furatira munhu anotaurisa.
Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
20 Kana munhu akatuka baba vake kana mai vake, mwenje wake uchadzimwa parima guru.
Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
21 Nhaka yakakurumidza kuwanikwa pakutanga haingaropafadzwi pamagumo ayo.
Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
22 Usati, “Ndichatsiva zvawanditadzira izvi!” Mirira Jehovha, uye iye achakubatsira.
A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
23 Jehovha anovenga zviereso zvinosiyana, uye zviero zvinonyengera hazvimufadzi.
Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
24 Kufamba kwomunhu kunotungamirirwa naJehovha. Zvino munhu anganzwisisa sei nzira yake?
Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
25 Musungo kumunhu kuti akumikidze chimwe chinhu nokukurumidza uye ozorangarira mhiko dzake pava paya.
Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
26 Mambo akachenjera anopepeta zvakaipa; anofambisa vhiri rokupura pamusoro pavo.
Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
27 Mwenje waJehovha unonzvera mweya womunhu; unonzvera zviri mukatikati make.
Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
28 Rudo nokutendeka zvinochengetedza mambo; kubudikidza norudo chigaro chake chinosimbiswa.
Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
29 Kukudzwa kwamajaya ndiro simba ravo, bvudzi jena kubwinya kwavakwegura.
Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
30 Kurohwa nokukuvadzwa zvinobvisa zvakaipa, uye kurohwa neshamhu kunovaka munhu womukati.
Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.