< Nehemia 4 >

1 Zvino Sanibharati paakanzwa kuti takanga tava kuvakazve rusvingo, akatsamwa uye akava nehasha kwazvo. Akashora vaJudha
Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo.
2 pamberi pehama dzake nehondo yeSamaria, achiti, “Ko, vaJudha avo vasina simba vari kuiteiko? Ko, vachavakazve rusvingo rwavo here? Vachapa zvibayiro here? Vachapedza nezuva rimwe chete here? Ko, vangadzorera upenyu pamatombo ayo akaunganidzwa, akatsva sezvaakaita izvi here?”
Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”
3 Tobhia muAmoni, aiva parutivi pake, akati, “Chavari kuvaka ichi, kana dai gava raikwira pamusoro pacho, raitokoromora rusvingo rwavo rwamatombo!”
Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!”
4 Haiwa, Mwari wedu, tinzwei, nokuti tiri kuzvidzwa. Dzorerai kutuka kwavo pamusoro pavo. Ngavave sevakapambwa munyika yenhapwa.
Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
5 Musafukidza kuipa kwavo kana kudzima zvivi zvavo pamberi penyu, nokuti vakakusha mashoko okutuka pamberi pavavaki.
Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.”
6 Saka takavakazve rusvingo kudzamara rwose rwasvika pahafu yokukwirira kwarwo, nokuti vanhu vaishanda nemwoyo yavo yose.
Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.
7 Asi Sanibharati, Tobhia, navaArabhu, navaAmoni navarume veAshidhodhi, vakati vanzwa kuti masvingo eJerusarema ari kugadzirwa, uye kuti makakoromoka maivakwa pakare, vakatsamwa kwazvo.
Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu.
8 Vakarangana vose pamwe chete kuti vazorwa neJerusarema uye kuti varimutsire mhirizhonga.
Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.
9 Asi takanyengetera kuna Mwari wedu tikaisawo varindi masikati nousiku kuti vapedze dambudziko rokutyisidzira uku.
Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị.
10 Zvichakadaro, vanhu vokwaJudha vakati, “Simba ravabati riri kupera, uye pachine mangwandangwanda akawanda zvokuti hatingakwanisi kuvakazve rusvingo.”
Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.
11 Uyezve vavengi vedu vakati, “Vasati vazviziva kana kutiona, tichatenge tavapo pakati pavo uye tichavauraya tigoparadza basa ravo.”
Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị.
12 Ipapo vaJudha vakanga vagere pedyo navo vakauya vakatitaurira rune gumi vachiti, “Kupi nokupi kwamuchaenda, vachauya kuzotirwisa.”
Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”
13 Naizvozvo ndakaisa vamwe vanhu seri kwenzvimbo dzakaderera dzorusvingo napanzvimbo dzakashama, ndichivaisa nemhuri dzavo, vane minondo yavo, namapfumo uye neuta.
Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị.
14 Mushure mokunge ndatarisisa zvinhu izvi, ndakasimuka ndikati kuvakuru, navabati nokuruzhinji rwavanhu, “Musavatya. Rangarirai Jehovha, iye mukuru, anotyisa, uye murwire hama dzenyu, vanakomana venyu, navanasikana venyu, vakadzi venyu nemisha yenyu.”
Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
15 Vavengi vedu pavakanzwa kuti takanga taziva rangano yavo uye kuti Mwari akanga aikonesa, tose takadzokera kurusvingo, mumwe nomumwe pabasa rake.
Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.
16 Kubva pazuva iro, zvichienda mberi hafu yavanhu vangu vakashanda basa, asi imwe hafu vakanga vakapakata mapfumo, nhoo, uta nenhumbi dzokurwa nadzo. Vatariri vakamira mumashure mavanhu vose vokwaJudha,
Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha.
17 vaivaka rusvingo. Avo vaitakura zvokuvakisa vakaita basa ravo noruoko rumwe uye rumwe ruoko vakabata chombo chokurwisa,
Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.
18 uye muvaki mumwe nomumwe akanga akapfeka munondo wake parutivi, uku achishanda. Asi munhu airidza hwamanda aiva neni.
Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya.
19 Ipapo ndakati kuvakuru, navatariri noruzhinji rwavanhu, “Basa iguru iri uye rapararira, uye isu tanyanya kuparadzana mumwe kubva kuno mumwe takatevedza rusvingo.
Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi.
20 Pose pamuchanzwa kurira kwehwamanda, muuye tibatane ikoko. Mwari wedu achatirwira.”
Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.”
21 Saka takafambira mberi nebasa, hafu yavarume yakabata mapfumo, kubva mambakwedza kusvikira nyeredzi dzichibuda.
Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.
22 Panguva iyo ndakati kuvanhu, “Murume mumwe nomumwe nomubatsiri wake ngaagare mukati meJerusarema panguva dzousiku, kuitira kuti vatibatsire kushanda savarindi usiku uyezve savashandi masikati.”
Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.
23 Zvino ini nehama dzangu kana vanhu vangu kana varindi vaiva neni hatina kubvisa nguo dzedu; mumwe nomumwe aiva nomunondo wake, kunyange paaienda kundonwa mvura.
Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.

< Nehemia 4 >