< Nehemia 2 >

1 Mumwedzi waNisani mugore ramakumi maviri raMambo Atazekisesi, panguva yaakavigirwa waini, ndakatora waini ndikapa kuna mambo. Handina kumbenge ndambosuruvara zvakadai pamberi pake.
Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze.
2 Saka mambo akandibvunza akati, “Ko, chiso chako chinoratidza kusuwa seiko iwe usingarwari? Hapangavi nechimwe chinhu asi shungu dzomwoyo bedzi.” Ndakatya kwazvo,
Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.” Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu.
3 asi ndakati kuna mambo, “Mambo ngaararame nokusingaperi! Ko, chiso changu chingatadza kupunyaira seiko kana guta rakavigwa madzibaba angu rava dongo uye masuo aro aparadzwa nomoto?”
Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”
4 Mambo akati kwandiri, “Chii chauri kuda?” Ipapo ndakanyengetera kuna Mwari wokudenga,
Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?” Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke,
5 ndikapindura mambo ndichiti, “Kana zvichifadza mambo uye kana muranda wenyu awana nyasha pamberi pake, mambo ngaanditumire kuguta riri kuJudha kwakavigwa madzibaba angu kuitira kuti ndinorivakazve.”
ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”
6 Ipapo mambo, navahosi vakagara parutivi pake, akandibvunza akati, “Rwendo rwako runotora mazuva mangani, uye uchadzoka rinhi?” Naizvozvo zvakafadza mambo kuti anditume; saka ndakatara nguva.
Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.
7 Ndakatizve kwaari, “Kana mambo achifadzwa nazvo, ndingapiwawo tsamba here dzinoenda kuvabati vari mhiri kwaYufuratesi, kuitira kuti vagondipa mvumo yokupfuura kusvikira ndasvika muJudha?
Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.
8 Uye ndinokumbirawo tsamba inoenda kuna Asafi, muchengeti wesango ramambo, kuitira kuti azondipa matanda okuchinjika pamusoro pamasuo enhare iri patemberi uye neorusvingo rweguta neeimba yandichagara?” Mambo akandipa zvandakakumbira, nokuti ruoko rwenyasha rwaMwari wangu rwaiva pamusoro pangu.
Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.
9 Saka ndakaenda kuvabati vaiva mhiri kwaYufuratesi ndikavapa tsamba dzamambo. Zvino mambo akanga atumawo pamwe chete neni vakuru vehondo navatasvi vamabhiza.
Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
10 Sanibharati muHoroni naTobhia muranda wavaAmoni pavakazvinzwa vakashatirwa kwazvo vachiti kwauya mumwe anoda kusimudzira magariro akanaka avaIsraeri.
Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.
11 Naizvozvo ndakaenda kuJerusarema ndikagarako kwamazuva matatu.
E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,
12 Ndakamuka usiku navarume vashoma shoma. Ndakanga ndisina kumboudza munhu zvakanga zvaiswa mumwoyo mangu naMwari wangu kuti ndiite muJerusarema. Pakanga pasina chimwe chipfuwo kunze kwechandakanga ndakatasva.
eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.
13 Ndakabuda usiku ndikapinda napaSuo roMupata ndakananga nokuTsime reShato nokuSuo raMarara, ndichiongorora masvingo eJerusarema, akanga akoromorwa, uye masuo awo, akanga aparadzwa nomoto.
Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
14 Ipapo ndakapfuurira mberi ndakananga kuSuo reTsime nokuDziva raMambo, asi pakanga pasina nzvimbo yokupinda nechipfuwo changu;
Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
15 saka ndakakwidza nokumupata nousiku, ndichiongorora rusvingo. Pakupedzisira, ndakadzoka ndikapindazve napakati peSuo roMupata.
Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.
16 Vabati havana kuziva kwandakanga ndaenda kana zvandakanga ndichiita, nokuti ndakanga ndisati ndambotaura chinhu kuvaJudha kana kuvaprista kana vakuru kana vabati, kana vamwewo zvavo vaizoita basa.
Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.
17 Ipapo ndakati kwavari, “Muri kuona dambudziko ratinaro here: Jerusarema rava dongo, uye masuo aro akapiswa nomoto. Uyai, ngativakeizve rusvingo rweJerusarema, kuti tisazonyadziswazve.”
Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”
18 Ndakavaudza pamusoro poruoko rwenyasha rwaMwari wangu rwaiva pamusoro pangu uye zvakanga zvataurwa namambo kwandiri. Ivo vakati, “Ngatitangei kuvaka.” Saka vakatanga basa rakanaka iri.
Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.
19 Asi Sanibharati muHoroni, naTobhia muranda wavaAmoni naGeshemu muArabhu vakati vazvinzwa, vakatiseka uye vakatizvidza. Vakatibvunza vachiti, “Chiiko ichi chamuri kuita? Muri kumukira mambo kanhi?”
Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”
20 Ndakavapindura ndikati, “Mwari wokudenga achaita kuti tibudirire. Isu varanda vake tichatanga kuvaka asi kana murimi, hamuna mugove kana simba kana chirangaridzo paJerusarema.”
Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”

< Nehemia 2 >