< Revhitiko 7 >

1 “‘Iyi ndiyo mirayiro yechipiriso chemhosva chitsvene-tsvene.
“‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ.
2 Chipiriso chemhosva chinofanira kubayirwa panzvimbo panobayirwa chipiriso chinopiswa uye ropa racho rinofanira kusaswa paaritari kumativi ose.
A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
3 Mafuta acho ose achapiswa sechipiriso, chimuswe chakakora namafuta akafukidza zvomukati,
Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,
4 itsvo mbiri namafuta ari padziri pedyo nechiuno, uye zvakafukidza chiropa, zvinofanira kubviswa pamwe chete neitsvo.
na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.
5 Muprista anofanira kuzvipisa paaritari sechipiriso chinoitirwa Jehovha nomoto. Ichi chipiriso chemhosva.
Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
6 Munhurume upi zvake weimba yomuprista angachidya, asi chinofanira kudyirwa munzvimbo tsvene; chitsvene-tsvene.
Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
7 “‘Chipiriso chemhosva chinofanira kuitwa sezvinoitwa nechipiriso chezvivi: ndechomuprista anoyananisira nazvo.
“‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.
8 Muprista anopisa chipiriso chinopiswa chomunhu upi zvake anogona kuzvichengetera dehwe racho.
Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya.
9 Zvipiriso zvose zvezviyo zvinobikwa muchitofu kana zvinobikwa mugango kana muhari ndezvomuprista anozvipa,
A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.
10 uye zvipiriso zvose zvezviyo zvingava zvakasangana namafuta kana zvakaoma, ndezvavanakomana vaAroni, mumwe nomumwe, zvakamuringana.
Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.
11 “‘Iyi ndiyo mirayiro yechipiriso chokuwadzana, chinogona kupiwa nomunhu kuna Jehovha.
“‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:
12 “‘Kana akachipa sechiratidzo chokuvonga ipapo pamwe chete nechipiriso chokuvonga ichi, anofanira kupa makeke echingwa chakabikwa chisina mbiriso, chakaiswa mafuta, makeke matete akabikwa pasina mbiriso, akazorwa mafuta, namakeke oupfu hwakatsetseka akanyatsokanywa akaiswa mafuta.
“‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya.
13 Pamwe chete nechipiriso chake chokuwadzana chokuvonga anofanira kupa chipiriso chamakeke akabikwa nembiriso.
Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.
14 Anofanira kuuya nemhando imwe neimwe sechipiriso, chikamu chinopiwa kuna Jehovha; ndezvomuprista anosasa ropa nezvipiriso zvokuwadzana.
Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
15 Nyama yechipiriso chake chokuwadzana chokuvonga inofanira kudyiwa musi wainopiwa. Haafaniri kusiya imwe kusvikira mangwanani.
Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi.
16 “‘Kana chipiriso chake chiri chemhiko kana kuti chiri chipiriso chokungopawo, chibayiro ichocho chichadyiwa musi wachinopiwa, asi chinhu chose chinosara chinogona kudyiwa musi unotevera.
“‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
17 Nyama yose yechibayiro inosara kusvikira zuva rechitatu inofanira kupiswa.
Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
18 Kana nyama yechipiriso chokuwadzana ikadyiwa nomusi wechitatu haizogamuchirwi. Hazvigamuchirwi panzvimbo yomunhu anenge azvipa nokuti hazvina kuchena, munhu achadya chikamu chipi chazvo achava nemhosva yacho.
Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.
19 “‘Nyama inogunzva chisina kucheneswa haifaniri kudyiwa, inofanira kupiswa. Kana iri imwe nyama, munhu wose akacheneswa anogona kuidya.
“‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
20 Asi kana munhu asina kuchena akadya nyama iyi yokuwadzana yaJehovha, munhu iyeye anofanira kubviswa pakati pavanhu vokwake.
A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
21 Kana munhu akabata chinhu chisina kuchena, kunyange kusachena kwavanhu, kana mhuka isina kuchena, kana chose chisina kuchena, chinhu chinonyangadza, uye akazodya nyama ipi yechipiriso chokuwadzana chaJehovha, munhu iyeye anofanira kubviswa pakati pavanhu vokwake.’”
Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’”
22 Jehovha akati kuna Mozisi,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
23 “Uti kuvana veIsraeri, ‘Musadya mafuta api zvawo emombe, makwai kana mbudzi.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.
24 Mafuta echipfuwo chinenge chawanikwa chakafa kana chabvamburwa nezvikara zvesango anogona kushandiswa pana mamwe mabasa asi hamufaniri kuadya.
Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ.
25 Munhu wose anodya mafuta emhuka inoitwa nayo chipiriso chinoitirwa Jehovha nomoto anofanira kubviswa pakati pavanhu vokwake.
A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
26 Kwose kwose kwamunogara hamufaniri kudya ropa reshiri kana mhuka ipi zvayo.
Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi.
27 Kana munhu upi zvake akadya ropa, munhu iyeye anofanira kubviswa pakati pavanhu vokwake.’”
Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’”
28 Jehovha akati kuna Mozisi,
Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
29 “Uti kuvana veIsraeri, ‘Munhu wose anouya nechipiriso chokuwadzana kuna Jehovha anofanira kuuya nechikamu chacho sechibayiro kuna Jehovha.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị.
30 Namaoko ake anofanira kuuya nechipiriso chinoitirwa Jehovha nomoto, anofanira kuuya namafuta pamwe chete nechityu, agoninira chityu kuna Jehovha sechipiriso chokuninira.
Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
31 Muprista achapisa mafuta paaritari, asi chityu ndechaAroni navanakomana vake.
Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom.
32 Munofanira kupa bandauko rorudyi pazvipiriso zvenyu zvokuwadzana kumuprista somugove wakewo.
Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
33 Mwanakomana waAroni anopa ropa namafuta echipiriso chokuwadzana achatora bandauko rokurudyi somugove wake.
Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.
34 Kubva kuzvipiriso zvokuwadzana zvavana veIsraeri ndatora chityu chinoninirwa nebandauko rinouyiswa ndikazvipa kuna Aroni muprista navanakomana vake somugove wavo wavanofanira kugara vachiwana kubva kuvaIsraeri.’”
Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’”
35 Uyu ndiwo mugove wezvibayiro zvinoitirwa Jehovha nomoto zvakapiwa kuna Aroni navanakomana vake pazuva ravakagadzwa kuti vashumire Jehovha savaprista.
Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.
36 Pazuva ravakazodzwa, Jehovha akarayira kuti vaIsraeri vape izvi kwavari somugove wavanofanira kugara vachiwana kuzvizvarwa zvichatevera.
Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
37 Zvino iyi ndiyo mirayiro yezvipiriso zvinopiswa, chipiriso chezviyo, chipiriso chechivi, chipiriso chemhosva, chipiriso chokugadzwa nechipiriso chokuwadzana,
Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.
38 zvakapiwa Mozisi naJehovha paGomo reSinai pazuva raakarayira vaIsraeri kuti vauye nezvipiriso kuna Jehovha muGwenga reSinai.
Onyenwe anyị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara Onyenwe anyị onyinye nʼọzara Saịnaị.

< Revhitiko 7 >