< Vatongi 21 >
1 Varume veIsraeri vakanga vaita mhiko paMizipa vachiti: “Hapana mumwe wedu acharoodza mwanasikana wake kumuBhenjamini.”
Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.”
2 Vanhu vakaenda kuBheteri, uko kwavakagara pamberi paMwari kusvikira madekwana, vachisimudza manzwi avo uye vachichema zvikuru.
Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.
3 Vakachema vachiti, “Haiwa Jehovha, Mwari waIsraeri, seiko izvi zvakaitika kuIsraeri? Seiko rumwe rudzi rwashayikwa muIsraeri nhasi?”
“Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”
4 Mangwanani ezuva rakatevera, vanhu vakavaka aritari vakapa zvipiriso zvinopiswa nezvipiriso zvokuwadzana.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.
5 Ipapo vaIsraeri vakabvunza vakati, “Ndianiko kubva kumarudzi ose aIsraeri akatadza kuungana navamwe pamberi paJehovha?” Nokuti vakanga vaita mhiko kuti ani zvake anotadza kuungana navamwe pamberi paJehovha paMizipa anofanira kuurayiwa zvirokwazvo.
Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.
6 Zvino vaIsraeri vakasuwa nokuda kwehama dzavo, vaBhenjamini. Vakati, “Nhasi rumwe rudzi rwabviswa pana Israeri.
Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya.
7 Tichapa seiko vakadzi kuna avo vakasara, sezvo takapika kuna Jehovha kuti tirege kupa upi zvake wavanasikana vedu kuti awanikwe navo.”
Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?”
8 Ipapo vakabvunza vakati, “Ndavapiko pamarudzi aIsraeri vakatadza kuungana navamwe pamberi paJehovha paMizipa?” Vakawana kuti kwakanga kusina munhu aibva kuJabheshi Gireadhi akanga auya kumusasa kuungano.
Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.
9 Nokuti vakati vaverenga vanhu, vakaona kuti kwakanga kusina munhu weJabheshi Gireadhi akanga aripo.
Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa.
10 Saka ungano yakatuma varume vehondo zviuru gumi nezviviri vakavarayira kuti vaende kuJabheshi Gireadhi vandouraya nomunondo vanhu vaigarako, kusanganisira vakadzi navana.
Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị.
11 Vakati, “Hezvi zvamunofanira kuita: Urayai murume mumwe nomumwe nomukadzi mumwe nomumwe asiri mhandara.”
Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.”
12 Vakawana pakati pavanhu vaigara muJabheshi Gireadhi mhandara mazana mana vakanga vasina kumbovata navarume, vakaenda navo kumusasa paShiro muKenani.
Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.
13 Ipapo ungano yose yakatuma nhume neshoko rorugare kuvaBhenjamini paruware rweRimoni.
Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.
14 Saka vaBhenjamini vakadzoka panguva iyoyo vakapiwa vakadzi veJabheshi Gireadhi vakanga vasara. Asi vakanga vasina kuvakwanira vose.
Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.
15 Vanhu vakasuwa nokuda kweBhenjamini, nokuti Jehovha akanga aisa mukaha mumarudzi avaIsraeri.
Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu.
16 Uye vakuru veungano vakati, “Sezvo vakadzi veBhenjamini vakaparadzwa, tichawanira seiko varume vakasara vakadzi?”
Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?
17 Vakati, “VaBhenjamini vakasara vanofanira kuva navadyi venhaka kuitira kuti rudzi rwaIsraeri rurege kurova.
Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.
18 Hatigoni kuvapa vanasikana vedu kuti vave vakadzi vavo sezvo isu vaIsraeri takapika tichiti, ‘Ngaatukwe munhu anopa mukadzi kumuBhenjamini.’
Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’
19 Asi tarirai, kune mutambo waJehovha wegore negore paShiro, nechokumusoro kweBheteri, kumabvazuva omugwagwa unobva kuBheteri uchienda kuShekemu, nezasi kweRebhona.”
Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”
20 Saka vakarayira vaBhenjamini vakati, “Endai mundovanda muminda yemizambiringa
Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,
21 uye mutarire. Vasikana veShiro pavanobuda kuti vandotamba navamwe, ipapo mumhanye muchibva muminda yemizambiringa mumwe nomumwe wenyu azvitorere mukadzi kubva kuvasikana veShiro mugoenda henyu kunyika yavaBhenjamini.
ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu.
22 Madzibaba avo kana hanzvadzi dzavo pavanouya kuzomhanʼara kwatiri, isu tichati kwavari, ‘Tiitirei henyu zvakanaka nokuvabatsira, nokuti hatina kuvawanira vakadzi panguva yehondo, uye imi hamuna mhosva, sezvo musina kupa vanasikana venyu kwavari.’”
Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’”
23 Saka ndizvo zvakaitwa navaBhenjamini. Vasikana vachiri kutamba, murume mumwe nomumwe akabata musikana ndokuenda naye kuti ave mukadzi wake. Ipapo vakadzokera kunhaka yavo uye vakavakazve maguta vakagara maari.
Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya.
24 Panguva iyoyo vaIsraeri vakabva panzvimbo iyo vakaenda kumusha kumarudzi avo nokudzimba dzavo, mumwe nomumwe kunhaka yake pachake.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.
25 Mumazuva iwayo kwakanga kusina mambo pakati paIsraeri; mumwe nomumwe aiita zvaaifunga kuti zvakanaka.
Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.