< Vatongi 13 >

1 VaIsraeri vakaitazve zvakaipa pamberi paJehovha, saka Jehovha akavaisa mumaoko avaFiristia kwamakore makumi mana.
Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
2 Mumwe murumwe weZora ainzi Manoa, aibva muimba yavaDhani, akanga ane mukadzi akanga asingabereki, asina mwana.
Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
3 Mutumwa waJehovha akazviratidza kwaari uye akati, “Iwe haubereki uye hauna mwana, asi uchava nemimba uye ugova nomwanakomana.
Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
4 Zvino uone kuti warega kunwa waini kana zvimwe zvokunwa zvakaviriswa uye kuti urege kudya chinhu chipi zvacho chisina kuchena,
Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
5 nokuti uchava nemimba uye uchabereka mwanakomana. Chisvo hachifaniri kuveura musoro wake, nokuti mukomana anofanira kuva muNaziri, akatsaurirwa kuna Mwari kubva pakuzvarwa kwake, uye ndiye achatanga kusunungura vaIsraeri kubva mumaoko avaFiristia.”
Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
6 Ipapo mukadzi akaenda kumurume wake akandomuudza akati, “Munhu waMwari asvika kwandiri. Anga achiratidzika somutumwa waMwari, anotyisa kwazvo. Handina kumubvunza kuti abva kupi, uye haana kundiudza zita rake.
Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.
7 Asi ati kwandiri, ‘Uchava nemimba uye uchabereka mwanakomana. Zvino, chirega kunwa waini kana zvimwe zvokunwa zvakaviriswa uye usadya chinhu chipi zvacho chisina kuchena, nokuti mukomana achava muNaziri waMwari kubva pakuzvarwa kwake kusvikira pazuva raanofa.’”
Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’”
8 Ipapo Manoa akanyengetera kuna Jehovha akati, “Haiwa Jehovha, ndinokukumbirai, regai munhu waMwari wamakatuma kwatiri adzokezve kuti azotidzidzisa kurera kwatingaita mukomana achazozvarwa.”
Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”
9 Mwari akanzwa Manoa, uye mutumwa waMwari akauyazve kumukadzi panguva yaakanga ari kumunda; asi murume wake Manoa akanga asipo paari.
Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.
10 Mukadzi akakurumidza kundoudza murume wake kuti, “Ari pano! Murume uya akazviratidza kwandiri zuva riya!”
Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”
11 Manoa akasimuka akatevera mukadzi wake. Akati asvika pamurume uya, akati, “Ndimi here makataura kumukadzi wangu?” Iye akati, “Ndini.”
Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”
12 Saka Manoa akamubvunza akati, “Mashoko enyu paachazadziswa, mutemo unofanira kutevedzwa paupenyu hwomukomana napabasa rake ndoupi?”
Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
13 Mutumwa waJehovha akapindura akati, “Mukadzi wako anofanira kuita zvose zvandakamuudza.
Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.
14 Haafaniri kudya chinhu chipi zvacho chinobva pamuzambiringa, uye kunwa waini ipi zvayo kana zvimwe zvokunwa zvakaviriswa kana kudya chinhu chipi zvacho chisina kuchena. Anofanira kuita zvose zvandakamurayira.”
Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”
15 Manoa akati kumutumwa waJehovha, “Tingada kuti mumbogara kusvikira takugadzirirai kambudzana.”
Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
16 Mutumwa waJehovha akapindura akati, “Kunyange dai mukandibata henyu, handingadyi chokudya chenyu chipi zvacho. Asi kana muchigadzira chipiriso chinopiswa, chipei kuna Jehovha.” (Manoa haana kuziva kuti akanga ari mutumwa Jehovha.)
Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.
17 Ipapo Manoa akabvunza mutumwa waJehovha akati, “Zita renyu ndianiko, kuitira kuti tigokukudzai pachazadziswa shoko renyu?”
Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
18 Akapindura akati, “Unobvunzireiko zita rangu? Haringanzwisisiki.”
Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”
19 Ipapo Manoa akatora kambudzana, pamwe chete nechipiriso chezviyo, akazvibayira kuna Jehovha paruware. Uye Jehovha akaita chinhu chinoshamisa, Manoa nomukadzi wake vakatarisa:
Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
20 Murazvo wemoto wakati uchikwira kubva paaritari wakananga kudenga, mutumwa waJehovha akakwira ari mumurazvo. Vakati vaona izvi, Manoa nomukadzi wake vakawira pasi nezviso zvavo.
Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi Onyenwe anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.
21 Asi mutumwa waJehovha haana kuzozviratidzazve kuna Manoa nomukadzi wake, ipapo Manoa akaziva kuti akanga ari mutumwa waJehovha.
Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.
22 Akati, “Tichafa zvirokwazvo! Taona Mwari!”
Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
23 Asi mukadzi wake akati, “Kana Jehovha anga achida kutiuraya, angadai asina kugamuchira chipiriso chinopiswa nechipiriso chezviyo kubva mumaoko edu, uye angadai asina kutiratidza zvinhu zvose izvi kana kutiudza izvi zvino.”
Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
24 Mukadzi akasununguka mwanakomana uye akamutumidza zita rokuti Samusoni. Akakura uye Jehovha akamuropafadza,
Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
25 uye Mweya waJehovha wakatanga kumumutsa paakanga ari paMahane Dhani, pakati peZora neEshitaori.
Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.

< Vatongi 13 >