< Vatongi 1 >

1 Mushure mokufa kwaJoshua, vaIsraeri vakabvunza Jehovha vakati, “Ndiani pakati pedu achatanga kukwidza kundorwa navaKenani?”
Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?”
2 Jehovha akapindura akati, “Judha ngaaende; ndapa nyika mumaoko ake.”
Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”
3 Ipapo varume veJudha vakati kuvaSimeoni hama dzavo, “Ngatiendei tose kunyika yatakagoverwa, kuti tindorwa navaKenani. Nesuwo tichaenda nemi kumugove wenyu.” Saka vaSimeoni vakaenda navo.
Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.
4 Judha paakarwisa, Jehovha akaisa vaKenani navaPerizi mumaoko avo uye vakauraya varume zviuru gumi paBhezeki.
Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.
5 Ipapo ndipo pavakawana Adhoni Bhezeki vakarwa naye.
Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.
6 Adhoni Bhezeki akatiza, asi vakamudzinganisa vakamubata, vakagura zvigunwe zvake zvikuru zvomumaoko nezvigunwe zvake zvikuru zvomumakumbo.
Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.
7 Ipapo Adhoni Bhezeki akati, “Madzimambo makumi manomwe, vagurwa zvigunwe zvikuru zvomumaoko nezvigunwe zvikuru zvokumakumbo, vakanonga zvimedu zvezvokudya pasi petafura yangu. Zvino Mwari anditsiva pane zvandakaita kwavari.” Vakaenda naye kuJerusarema akandofira ikoko.
Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
8 Varume veJudha vakarwisawo Jerusarema vakaritora. Vakakunda guta nomunondo uye vakaripisa.
Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.
9 Shure kwaizvozvo, varume veJudha vakaburuka vakandorwa navaKenani vaigara munyika yezvikomo, kuNegevhi uye nomujinga mezvikomo zvokumavirira.
Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.
10 Vakaenda vakandorwa navaKenani vaigara muHebhuroni (rainzi Kiriati Abha kare) vakakunda Sheshai, Ahimani neTarimai.
Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.
11 Vachibva ipapo, vakaenda vakandorwa navanhu vaigara muDhebhiri (rainzi Kiriati Seferi kare.)
Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).
12 Uye Karebhu akati, “Ndichapa mwanasikana wangu Akisa kuti ave mukadzi kumurume acharwisa uye achatapa Kiriati Seferi.”
Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
13 Otinieri mwanakomana waKenazi, mununʼuna waKarebhu, akarikunda, saka Karebhu akapa mwanasikana wake Akisa kuti awanikwe naye.
Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
14 Rimwe zuva akati achisvika kuna Otinieri, akamukurudzira kuti akumbire munda kuna baba vake. Akati aburuka pambongoro yake, Karebhu akamubvunza akati, “Ndingakuitireiko?”
Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
15 Iye akapindura akati, “Ndiitirei zvakanaka. Sezvo makandipa nyika kuNegevhi, ndipeiwo matsime emvura.” Ipapo Karebhu akamupa matsime okumusoro neezasi.
Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
16 Zvizvarwa zvatezvara vaMozisi, vaKeni, vakakwidza vachibva kuGuta reMichindwe vaine varume veJudha kuti vandogara pakati pavanhu vokuGwenga reJudha riri kuNegevhi pedyo neAradhi.
Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.
17 Ipapo varume veJudha vakaenda navaSimeoni hama dzavo vakandorwisa vaKenani vaigara muZefati, uye vakaparadza guta iri zvachose. Naizvozvo rakatumidzwa kuti Horima.
Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.
18 Varume veJudha vakakundazve Gaza, Ashikeroni neEkironi, guta rimwe nerimwe nenyika yaro.
Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.
19 Jehovha akanga ana vanhu veJudha. Vakatora nyika yezvikomo kuti ive yavo, asi havana kugona kudzinga vanhu vaibva mumapani, nokuti vakanga vane ngoro dzesimbi.
Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.
20 Sokuvimbisa kwaMozisi, Hebhuroni yakapiwa kuna Karebhu, uyo akabudisa mairi vanakomana vatatu vaAnaki.
E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.
21 Kunyange zvakadaro, vaBhenjamini vakatadza kudzinga vaJebhusi, vaigara muJerusarema; kusvikira nhasi vaJebhusi vageremo navaBhenjamini.
Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.
22 Zvino veimba yaJosefa vakarwisa Bheteri, uye Jehovha aiva navo.
Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.
23 Vakati vatuma vanhu kundosora Bheteri (rainzi Ruzi kare),
Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,
24 Vasori vakaona murume achibuda muguta vakati kwaari, “Tiratidze kuti tingapinda sei muguta tigokuitira zvakanaka.”
ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”
25 Saka akavaratidza, uye vakakunda guta nomunondo asi vakaponesa murume uya nemhuri yake.
Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.
26 Ipapo akaenda kunyika yavaHiti, kwaakandovaka guta akaritumidza kuti Ruzi, rinova ndiro zita raro nanhasi.
Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.
27 Asi Manase haana kudzinga vanhu veBheti Shani kana veTanaki kana veDhori kana veIbhireami kana veMegidho uye nenzvimbo dzavo dzokugara dzakapoteredza, nokuti vaKenani vakanga vazvipira kuti vagare munyika iyoyo.
Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ.
28 VaIsraeri vakati vasimba vakamanikidza vaKenani kuti vashande basa rechibharo asi havana kumbovadzinga zvachose.
Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ.
29 Uye Efuremu haana kudzingawo vaKenani vaigara muGeeri, asi vaKenani vakaramba vagere pakati pavo.
Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ.
30 NaZebhuruniwo haana kudzinga vaKenani vaigara muKitironi kana muNaharori, avo vakaramba vagere pakati pavo; asi vakaita kuti vaite basa rechibharo.
Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike.
31 Uye Asheri haanawo kudzinga vaya vaigara muAko kana veSidhoni kana Ahirabhi kana Akizibhi kana Heribha kana Afeki kana Rehobhi,
Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.
32 uye nokuda kwaizvozvo vanhu veAsheri vakagara pakati pavaKenani avo vaigara munyika.
Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.
33 Nafutari haana kudzinga avo vaigara muBheti Shemeshi kana muBheti Anati; asi vaNafutari vakagarawo pakati pavaKenani vaigara munyika, uye vaya vaigara muBheti Shemeshi neBheti Anati vakava vashandi vebasa rechibharo.
Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.
34 VaAmori vakasundira vaDhani kunyika yezvikomo, vakasavatendera kuburuka kuti vauye kumapani.
Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
35 Uye vaAmori vakashingirira kuti varambe vari muGomo reHeresi, Aijaroni neShaaribhimi, asi simba reimba yaJosefa rakati richiwanda, naivowo vakamanikidzwa kushanda basa rechibharo.
Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.
36 Muganhu wavaAmori waibva paMupata weChinyavada uchisvika kuSera uye uchipfuurira mberi.
Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.

< Vatongi 1 >