< Jobho 9 >

1 Ipapo Jobho akapindura akati:
Job zara sị:
2 “Zvirokwazvo ndinoziva kuti ichokwadi. Asi munhu anofa angava akarurama pamberi paMwari seiko?
“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
3 Kunyange dai mumwe aida kuita nharo naye, haaizogona kumupindura kamwe chete pamibvunzo chiuru.
Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
4 Uchenjeri hwake hwakadzika, simba rake iguru kwazvo. Ndianiko akamudzivisa akabuda asina vanga?
Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
5 Anofambisa makomo iwo asingazivi agoapidigura mukutsamwa kwake kukuru.
Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
6 Anozungunusa nyika ikabva panzvimbo yayo uye anoita kuti mbiru dzayo dzidengenyeke.
Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
7 Anotaura kuzuva iro ndokurega kuvhenekera; anodzivira chiedza chenyeredzi.
Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
8 Iye oga anotambanudza matenga uye anofamba pamusoro pamafungu egungwa.
Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
9 Ndiye Muiti weNyeredzi dzeAkutiro neOrioni, dzeChimunomwe namapoka enyeredzi dzenyasi.
Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
10 Anoita minana isingagoni kunzwisisiswa, nezvishamiso zvisingagoni kuverengwa.
Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
11 Paanondipfuura, handigoni kumuona; paanoenda napo handingamuoni.
Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
12 Kana achibvuta, ndiani angamudzivisa? Ndiani angati kwaari, ‘Unoiteiko?’
Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
13 Mwari haadzori kutsamwa kwake; kunyange boka ravarwi raRahabhi rakawira patsoka dzake nokutya.
Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
14 “Zvino ndingakakavadzana naye seiko? Ndingawana seiko mashoko okuita nharo naye?
“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
15 Kunyange ndakanga ndisina mhaka, handaigona kumupindura; ndaingokumbira hangu nyasha kuMutongi wangu.
Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
16 Kunyange dai ndaimudana hangu uye akandipindura, handitendi kuti aizowana nguva yokundinzwa.
A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
17 Aizondiparadza nedutu uye achizowedzera maronda angu pasina mhosva.
Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
18 Haaizonditenderazve kuti nditure mafemo, asi aizondizadza namatambudziko.
Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
19 Kana zviri zvesimba, iye ane simba guru! Uye kana zviri zvokururamisira, ndianiko angamudana kuti amutonge?
Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
20 Kunyange dai ndisina mhosva, muromo wangu waizongondipa mhaka; dai zvangu ndakarurama, iwo waizongondipa mhaka.
A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
21 “Kunyange ndisina mhosva, handina hangu hanya nazvo; ndinozvidza upenyu hwangu pachangu.
“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.
22 Zvakangofanana; ndokusaka ndichiti, ‘Iye anoparadza vasina mhosva nevakaipa.’
Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’
23 Kana dambudziko rikauyisa rufu nokukurumidza, achaseka kushaya tariro kwavasina mhosva.
Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.
24 Panowira nyika mumaoko avakaipa, vatongi vayo anovapofumadza. Kana asiri iye, zvino ndianiko?
Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
25 “Mazuva angu anokurumidza kupfuura mumhanyi; anobhururuka oenda asina kumboona mufaro.
“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
26 Anopfuura sezvikepe zvenhokwe, kufanana namakondo anomhanyira nyama yawo.
Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
27 Kana ndikati, ‘Ndichakanganwa kunyunyuta kwangu, ndichashandura chiso changu, ndigonyemwerera,’
Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
28 ndinongotya kutambura kwangu, nokuti ndinoziva kuti imi hamuregi kundipa mhosva.
Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
29 Sezvo ndatopiwa hangu mhosva, ko, ndichagotamburirei pasina?
Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
30 Kunyange dai ndikazvishambidza nesipo uye ndikashamba maoko angu nesoda,
A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
31 imi muchandinyudza mugomba rematope zvokuti kunyange nenguo dzangu dzichandisema.
ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
32 “Iye haasi munhu akafanana neni kuti ndimupindure, kuti zvimwe iye neni tisangane mudare redzimhosva.
“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
33 Dai chete paingova nomumwe angamira pakati pedu, kuti aise ruoko rwake patiri tose,
A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
34 mumwe zvake angabvise shamhu yaMwari kwandiri, kuti kutyisa kwake kurege kundivhundutsazve.
onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.
35 Ipapo ndichataura ndisingamutyi, asi sezvazvakaita kwandiri iye zvino, handingakwanisi.
Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

< Jobho 9 >