< Jeremia 30 >

1 Iri ndiro shoko rakauya kuna Jeremia richibva kuna Jehovha richiti,
Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
2 “Zvanzi naJehovha, Mwari waIsraeri, ‘Nyora mubhuku mashoko ose andakakuudza.
“Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.
3 Mazuva anouya,’ ndizvo zvinotaura Jehovha, ‘andichadzosa vanhu vangu, vaIsraeri navaJudha kubva kuutapwa. Uye ndichavadzosera kunyika yandakapa madzitateguru avo kuti ive yavo,’ ndizvo zvinotaura Jehovha.”
Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
4 Aya ndiwo mashoko akataurwa naJehovha pamusoro peIsraeri neJudha:
Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.
5 “Zvanzi naJehovha: “‘Tinonzwa kuchema kwevanotya, kwokutyisidzirwa, kwete kworugare.
“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
6 Bvunzai muone: Ko, murume angagona kusununguka mwana here? Zvino, seiko ndichiona murume mumwe nomumwe akasimba akabata padumbu pake namaoko ake somukadzi orwadziwa, zviso zvose zvachenuruka?
Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
7 Haiwa, zuva iro richatyisa seiko! Hakuna richafanana naro. Ichava nguva yaJakobho yokutambudzika, asi achaponeswa pairi.
Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
8 “‘Pazuva iro,’ ndizvo zvinotaura Jehovha Wamasimba Ose, ‘Ndichavhuna joko pamitsipa yavo uye ndichadambura zvisungo zvavo; havachazoitwizve varanda navatorwa.
“‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
9 Asi, vachashumira Jehovha Mwari wavo naDhavhidhi mambo wavo, iye wandichavamutsira.
Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
10 “‘Saka, usatya, iwe Jakobho muranda wangu; usavhunduka, iwe Israeri,’ ndizvo zvinotaura Jehovha. ‘Zvirokwazvo ndichakuponesa kubva kunyika iri kure, zvizvarwa zvako kubva kunyika youtapwa hwavo. Jakobho achavazve norunyararo uye nokuchengetedzeka, uye hakuna achazomutyisa.
“‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
11 Ndinewe uye ndichakuponesa,’ ndizvo zvinotaura Jehovha. ‘Kunyange zvazvo ndakaparadza chose ndudzi dzose dzandakakuparadzira pakati padzo, handingazokuparadze zvachose iwe. Ndichakuranga asi nokururamisira chete; handingakusiyi usina kurangwa zvachose.’
Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
12 “Zvanzi naJehovha: “‘Ronda rako harirapiki, kukuvadzwa kwako hakupori.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
13 Hakuna anokureverera mhaka yako, vanga rako harina mushonga, hapana kuporeswa kwako.
O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
14 Vose vaikuda vakakukanganwa; havachina hanya newe. Ndakakurova sezvinoitwa nomuvengi ndikakuranga sezvinoitwa neano utsinye nokuti mhosva yako ihuru uye zvivi zvako zvakawanda.
Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
15 Unochemeiko pamusoro pevanga rako, nokurwadziswa kwako kusingarapike? Nokuda kwokukura kwemhaka yako nezvivi zvizhinji ndakaita zvinhu izvi kwauri.
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
16 “‘Asi vose vanokudya iwe vachadyiwawo; vavengi vako vose vachaenda kuutapwa. Vanokupamba, vachapambwawo; vose vanokuparadza, ndichavaparadzawo.
“‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
17 Asi ndichakudzorera pautano uye ndichaporesa maronda ako,’ ndizvo zvinotaura Jehovha, ‘nokuti iwe wakanzi murashwa, Zioni zvaro risina ane hanya naro.’
Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
18 “Zvanzi naJehovha: “‘Ndichadzosazve pfuma yamatende aJakobho uye ndichanzwira ugaro hwake tsitsi; guta richavakwazve pamatongo aro, nomuzinda uchamira panzvimbo yawo yakafanira.
“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
19 Nziyo dzokuvonga dzichabva kwavari uye nenzwi romufaro. Ndichawedzera kuwanda kwavo, uye havangatapudzwi; ndichavavigira kukudzwa, uye havangadukupiswi,
Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.
20 Vana vavo vachava sepamazuva ekare, uye ungano yavo ichasimbiswa pamberi pangu; ndicharanga vose vanovamanikidza.
Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
21 Mutungamiri wavo achava mumwe wokwavo; anovabata ushe achamutswa pakati pavo. Ndichamuswededza pedyo uye iye achaswedera pedyo neni, nokuti ndianiko achazvipira kuti ave pedyo neni?’ ndizvo zvinotaura Jehovha.
Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
22 ‘Saka muchava vanhu vangu, neni ndichava Mwari wenyu.’”
‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’”
23 Tarirai, dutu raJehovha richaputika mukutsamwa kwake, mhepo inovhuvhuta ichimona pamisoro yavakaipa.
Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.
24 Kutsamwa kunotyisa kwaJehovha hakungadzoki, kusvikira apedza zvinovavarirwa nomwoyo wake. Mumazuva anouya muchanzwisisa izvozvi.
Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.

< Jeremia 30 >