< Isaya 20 >
1 Mugore rokusvika kwomutungamiri mukuru, kuAshidhodhi, atumwa naSarigoni mambo weAsiria, akairwisa uye akaitapa,
Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka ọ gaa buso Ashdọd agha. Ọ gara meriekwa ya nʼagha.
2 panguva iyoyo Jehovha akataura kubudikidza naIsaya mwanakomana waAmozi. Akati kwaari, “Bvisa nguo yesaga pamuviri wako neshangu mumakumbo mako.” Iye akaita saizvozvo, akafamba asina nguo uye asina shangu.
Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. Ọ sịrị ya, “Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ.” O mere otu a, ọ gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.
3 Ipapo Jehovha akati, “Sezvakaita Isaya muranda wangu akafamba asina nguo, uye asina shangu kwamakore matatu, sechiratidzo nechishamiso pamusoro peIjipiti neEtiopia,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, ọ bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush.
4 saizvozvo mambo weAsiria achaenda navatapwa veIjipiti, navakadzingwa veEtiopia, vadiki navakuru, uye magaro ari panze, kuti chive chinyadziso kuIjipiti.
Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere.
5 Avo vaivimba neEtiopia uye vaizvikudza neIjipiti vachatya uye vachanyadziswa.
Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha.
6 Pazuva iro, vanhu vaigara pamhenderekedzo ino vachati, ‘Tarirai zvaitika kuna vaya vataivimba navo, vaya vataitizira kwavari kuti vatibatsire uye vatinunure kubva kuna mambo weAsiria! Zvino isu tichapunyuka sei?’”
Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’”