< VaHebheru 6 >
1 Naizvozvo ngatisiyei dzidziso dzokutanga pamusoro paKristu uye tipfuurire mberi mukukura, tisingaisizve nheyo dzokutendeuka kubva pamabasa anotungamirira kurufu, uye nokutenda muna Mwari,
Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
2 dzidziso pamusoro pokubhabhatidzwa nedzokuisa maoko pamusoro, dzokumuka kubva kuvakafa, uye nedzokutongwa kusingaperi. (aiōnios )
na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. (aiōnios )
3 Uye kana Mwari achitendera, ndizvo zvatichaita.
Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.
4 Nokuti hazvigoni kuti vaya vakambovhenekerwa, vaya vakamboravira chipo chokudenga, vakagoverwa Mweya Mutsvene,
Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ,
5 vakaravira kunaka kweshoko raMwari uye namasimba enyika inouya, (aiōn )
ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, (aiōn )
6 kuti vatendeukezve mushure mokunge vatsauka, nokuti pakurasikirwa kwavo vanorovererazve Mwanakomana waMwari, vachimunyadzisa pachena.
ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.
7 Nyika inonwa mvura inonaya nguva nenguva pamusoro payo uye inobereka zvirimwa zvinobatsira avo vanoirima, ndiyo inoropafadzwa naMwari.
Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
8 Asi nyika inobereka minzwa norukato haibatsiri uye ine dambudziko rokuti ichatukwa. Pakupedzisira ichapiswa.
Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.
9 Kunyange zvazvo tichitaura sezvizvi, hama dzinodikanwa, tinoziva kwazvo kuti kwamuri kuchabva zvinhu zviri nani, zvinhu zvinoshanda pamwe chete noruponeso.
Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa.
10 Mwari haazi asina kururama; haangakanganwi basa renyu norudo rwamakamuratidza pamaibatsira vanhu vake uye kuti muchiri kuramba muchivabatsira.
Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.
11 Tinoda kuti mumwe nomumwe wenyu ave nokushingaira kumwe cheteko kusvikira kumagumo, kuitira kuti muve nechokwadi chetariro yenyu.
Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru.
12 Hatidi kuti muve simbe, asi kuti muve vateveri vaavo vanodya nhaka yakavimbiswa kubudikidza nokutenda nokutsungirira.
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.
13 Mwari paakaita vimbiso yake kuna Abhurahama, sezvo kwakanga kusina mumwe mukuru kwaari wokuti angapika naye, akapika naiye amene,
Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
14 achiti, “Zvirokwazvo ndichakuropafadza uye ndichakupa zvizvarwa zvizhinji.”
na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
15 Uye mushure mokumirira nomwoyo murefu, Abhurahama akagamuchira chipikirwa.
Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
16 Vanhu vanopika nomukuru kwavari, uye mhiko ndiyo inosimbisa zvinenge zvataurwa, uye inopedza gakava rose.
Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
17 Nokuti Mwari aida kuti aratidze pachena kusashanduka kwechido chake kuvadyi venhaka yakapikirwa, akakusimbisa nemhiko.
Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.
18 Mwari akaita izvi kuitira kuti, nezvinhu zviviri zvisingashanduki, zvokuti Mwari haagoni kureva nhema, isu vakatiza tikandobatisisa tariro yatakapiwa, tichasimbiswa zvikuru.
Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị.
19 Tine tariro iyi sechibatiso choMweya, chakasimba chisingazungunuswi. Inopinda mukati mechidzitiro chomutemberi,
Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi
20 makapinda Jesu akatitangira isu, akapinda akatimiririra. Akava muprista mukuru nokusingaperi worudzi rwaMerikizedheki. (aiōn )
ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. (aiōn )