< Ezira 9 >
1 Mushure mokunge zvinhu izvi zvose zvaitwa, vatungamiri vakauya kwandiri vakati, “Vanhu veIsraeri, zvichisanganisira vaprista navaRevhi, havana kuzvitsaura kubva kumarudzi avakavakidzana nawo nezvinonyangadza zvavo, zvakafanana nezvevaKenani, vaHiti, vaPerizi, vaJebhusi, vaAmoni, vaMoabhu, vaIjipita uye navaAmori.
Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.
2 Vakatora vanasikana vavo vakavapa kuti vave vakadzi vavo uye nevevanakomana vavo, uye vakasanganisa rudzi rutsvene navanhu vakavapoteredza. Uye vatungamiri namakurukota ndivo vakatanga pakusatendeka uku.”
Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.”
3 Zvino ndakati ndichinzwa izvi, ndakabvarura nguo yangu nejasi rangu, ndikadzura bvudzi kubva mumusoro mangu nendebvu dzangu uye ndikagara pasi ndashungurudzika.
Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
4 Ipapo vose vakadedera nokuda kwamashoko aMwari waIsraeri vakauya vakaungana pandiri nokuda kwokusatendeka kwavatapwa. Uye ndakagarapo ndakashungurudzika kusvikira nguva yechibayiro chamadekwana.
Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.
5 Zvino, panguva yechibayiro chamadekwana, ndakasimuka kubva pakuzvininipisa kwangu, nenguo nejasi rangu zvakabvaruka, uye ndikawira pasi namabvi angu ndikatambanudzira maoko angu kuna Jehovha Mwari wangu
Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m
6 ndikanyengetera, ndichiti: “Haiwa Mwari wangu, ndinonyara uye handisakafanira kuti ndisimudze maoko nechiso changu kwamuri, Mwari wangu, nokuti zvivi zvedu zvakakura kupfuura misoro yedu uye mhosva yedu yasvika kumatenga.
nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.
7 Kubva pamazuva amadzitateguru edu kusvikira zvino, mhosva yedu yakura kwazvo. Nokuda kwezvivi zvedu, isu namadzimambo edu uye navaprista vedu takaiswa kumunondo nokuutapwa, nokuparadzwa nokuninipiswa paruoko rwamadzimambo avatorwa sezvazviri nhasi.
Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa.
8 “Asi zvino, kwenguva duku duku, Jehovha Mwari wedu atiitira nyasha nokutisiyira vakasara uye nokutipa nzvimbo yakasimba muimba yake tsvene, naizvozvo Mwari wedu anopa chiedza kumeso edu uye norusununguko ruduku muuranda hwedu.
“Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị.
9 Kunyange zvedu tiri varanda, Mwari wedu haana kutisiya tiri muuranda hwedu. Akatinzwira tsitsi pamberi pamadzimambo ePezhia: Akatipa, upenyu hutsva kuti tivakezve imba yaMwari wedu nokugadzira matongo ayo, uye atipa rusvingo rwokutidzivirira muJudha nomuJerusarema.
Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.
10 “Asi zvino, nhai Mwari wedu, tichatiiko mushure meizvi? Nokuti takarasa mirayiro
“Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị,
11 yamakapa kubudikidza navaranda venyu vaprofita pamakati, ‘Nyika yamuri kupinda kuti ive yenyu inyika yakasvibiswa nokuora kwavanhu vayo. Nezvinonyangadza zvavo vakaizadza noutsvina hwavo kubva kuno rumwe rutivi kusvika kuno rumwe rutivi.
nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.
12 Naizvozvo, musapa vanasikana venyu kuti vawanikwe navanakomana vavo kana kutora vanasikana vavo kuti vawanikwe navanakomana venyu. Musaita chibvumirano kana ushamwari navo panguva ipi zvayo, kuitira kuti musimbe uye mudye zvinhu zvakanaka zvenyika uye mugoisiyira kuvana venyu senhaka isingaperi.’
Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’
13 “Zvakaitika kwatiri zvakaitika nokuda kwamabasa edu akaipa nemhosva yedu huru, asi kunyange zvakadaro, imi Mwari wedu makatiranga zvishoma kupfuura zvaikodzera zvivi zvedu uye makatipa vakasara vakadai.
“Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ.
14 Tingaputsazve here mirayiro yenyu nokuwanana namarudzi anoita zvinhu zvinonyangadza zvakadai? Hamungatitsamwiri zvakafanira kutiparadza, muchitisiya pasina mupenyu kana angasara here?
Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye?
15 Imi Jehovha, Mwari waIsraeri, makarurama! Tasara nhasi isu sevakasara. Zvino tiri pano pamberi penyu nemhosva yedu, kunyange pasina kana mumwe chete wedu angamira pamberi penyu nokuda kwechivi ichi.”
Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”