< Ezekieri 23 >
1 Shoko raJehovha rakasvika kwandiri richiti,
Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị m,
2 “Mwanakomana womunhu, kwakanga kuna vakadzi vaviri, vanasikana vamai vamwe chete.
“Nwa nke mmadụ, ọ dị ndị inyom abụọ nke otu nne mụrụ.
3 Vakava zvifeve muIjipiti, vakaita ufeve vachiri vadiki. Munyika imomo, mazamu oumhandara hwavo akabatwa-batwa uye zvipfuva zvavo zvakabatwa-batwa.
Ha ghọrọ ndị akwụna nʼala Ijipt site na mgbe ha bụ agbọghọ. Nʼala ahụ, a bịagidere ara ha aka, pịakwa ọnụ ara agbọghọ ha aka nʼọnọdụ igwuri egwu.
4 Zita romukoma rainzi Ohora, uye mununʼuna wake ainzi Ohoribha. Ivo vakanga vari vangu uye vakabereka vanakomana navanasikana. Ohora ndiye Samaria uye Ohoribha ndiye Jerusarema.
Aha nke okenye bụ Ohola. Aha nwanne ya nwanyị bụ Oholiba. Ha bụrịị nkem, ha mụtakwara m ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị. Ohola bụ Sameria, Oholiba bụkwa Jerusalem.
5 “Ohora akaita ufeve iye achiri wangu; akachiva zvikomba zvake, ivo vaAsiria, varwi
“Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa,
6 vakanga vakapfeka nguo dzebhuruu, vabati navatungamiri vehondo, vakanga vari majaya akanaka chose, uye vari vatasvi vamabhiza.
ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya.
7 Akaita ufeve navapamusoro-soro vose veAsiria uye akazvisvibisa nezvifananidzo zvose zvavose vaaichiva.
O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya.
8 Haana kurega ufeve hwaakatangira kuIjipiti, paakavata navarume achiri muduku, vakabata-bata chipfuva choumhandara hwake uye vakadurura ruchiva rwavo pamusoro pake.
Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya.
9 “Naizvozvo ndakamuisa kuzvikomba zvake, ivo vaAsiria, vaakanga achichiva.
“Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.
10 Vakamubvisa nguo akasara asina, ashama, vakatora vanakomana vake navanasikana ndokubva vamuuraya nomunondo. Akabva ava shumo pakati pavakadzi uye akarangwa.
Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ.
11 “Mununʼuna wake Ohoribha akazviona izvozvo, asi nokuda kworuchiva rwake noufeve hwake, akanyanya ufeve kupfuura mukoma wake.
“Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.
12 Akachivawo vaAsiria, vatongi navatungamiri vehondo, varwi vakapfeka zvakakwana, vatasvi vaifamba namabhiza, namajaya akanaka ose.
Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.
13 Ndakaona kuti naiyewo akazvisvibisa; vose vari vaviri vakafamba nenzira imwe cheteyo.
Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.
14 “Asi akaenderera mberi noufeve hwake. Akaona mifananidzo yavarume pamadziro, mifananidzo yavaKaradhea mitsvuku,
“O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta,
15 vana mabhandi akamonera muzviuno zvavo nenguwani dzemicheka dzairembera pamisoro yavo; vakaita samachinda engoro dzeBhabhironi, vagari veKaradhea.
ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
16 Paakangovaona, akabva avachiva ndokutumira nhume kwavari muKaradhea.
Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.
17 Ipapo vaBhabhironi vakauya kwaari, kunhoo yorudo, mukuchiva kwavo, vakamusvibisa. Shure kwokusvibiswa kwake navo, akavafuratira kwazvo.
Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi.
18 Paakaenderera mberi noufeve hwake pachena uye akaratidza kushama kwake, ndakamufuratira zvandisembura, sokufuratira kwandakanga ndaita mukoma wake.
Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.
19 Asi akaramba achiwedzera unzenza hwake achirangarira mazuva ouduku hwake, paakanga ari chifeve muIjipiti.
Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.
20 Akachiva zvikomba zvake ikoko, vane mitezo yakaita sembongoro uye zvinobuda mavari zvakaita sezvamabhiza.
Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.
21 Saka wakapanga unzenza hwouduku hwako, pawaiva muIjipiti chipfuva chako chakabatwa-batwa uye mazamu ouduku hwako akabatwa-batwa.
Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.
22 “Naizvozvo, Ohoribha, zvanzi naIshe Jehovha: Ndichakumutsira zvikomba zvako kuti zvikurwise, ivo vawakasemburwa navo ukavafuratira, ndichavauyisa kuzorwa newe vachibva kumativi ose,
“Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.
23 vaBhabhironi navaKaradhea vose, varume vePekodhi neveShowa neKowa, uye vaAsiria vose pamwe chete navo, majaya akanaka, vose vari vabati nevatungamiri vamauto, namachinda engoro navarume vezvigaro zvapamusoro, vose vakatasva mabhiza.
Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.
24 Vachauya kuzorwa newe vaine zvombo, nengoro uye neboka ravanhu vazhinji, vachagadzirira kuti varwe newe kumativi ose nenhoo huru neduku uye nenguwani dzokurwa nadzo. Ndichakudzorera kwavari kuti urangwe, uye vachakuranga sezvakafanira mitemo yavo.
Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.
25 Ndichamutsa godo rangu kuti ndirwe newe, uye ivo vachakurwisa nehasha. Vachagura mhino yako nenzeve dzako, uye vakasara venyu vachaurayiwa nomunondo. Vachakutorerai vanakomana venyu navanasikana venyu, uye vachasara venyu vachaparadzwa nomoto.
Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa.
26 Vachakubvisai nguo dzenyu uye vachakutorerai ukomba hwenyu hwakaisvonaka.
Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
27 Saka ndichagumisa unzenza hwenyu noufeve hwamakatangira muIjipiti. Hamuchazotariri zvinhu izvi muchizvishuva kana kuzorangarira Ijipiti zvakare.
Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.
28 “Nokuti zvanzi naIshe Jehovha: Ndava kuzokuisa mumaoko avanhu vaunovenga, kuna avo vawakafuratira wasemburwa navo.
“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
29 Ivo vachakuitira ruvengo vagokutorera zvinhu zvose zvawakashandira. Vachakusiya usina kupfeka wakashama, uye kunyadzisa kwoufeve hwako kuchaiswa pachena. Unzenza hwako nokupata kwako
Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị
30 zvakaisa izvi pamusoro pako, nokuti iwe wakachiva ndudzi ndokuzvisvibisa nezvifananidzo zvadzo.
emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.
31 Wakafamba nenzira yomununʼuna wako; saka ndichaisa mukombe wake muruoko rwako.
Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.
32 “Zvanzi naIshe Jehovha: “Uchanwa mukombe womukoma wako, mukombe mukuru wakadzika; uchakuvigira kusekwa nokumhurwa, nokuti une zvakawanda.
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
33 Uchazadzwa nokudhakwa nokusuwa, mukombe wokuparadza nokuputsa, mukombe womukoma wako Samaria.
Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ, nʼihi iko mbibi na ntikpọsi, bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
34 Uchanwa zvokupedza kuti tsvai; uchauputsa ukava zvaenga uye uchacheka mazamu ako. Ndini ndazvitaura, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.
Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
35 “Naizvozvo zvanzi naIshe Jehovha: Sezvo wakandikanganwa ukandirasira shure kwako, unofanira kuzvitakurira matambudziko ounzenza hwako noufeve hwako.”
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
36 Jehovha akati kwandiri, “Mwanakomana womunhu unganditongerewo Ohora naOhoribha here? Ipapo uvazivise zvinonyangadza zvavanoita,
Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
37 nokuti vakaita ufeve uye ropa riri mumaoko avo. Vakaita ufeve nezvifananidzo zvavo; vakasvika pakubayira vana vavo, vavakandiberekera ini, kuti zvive zvokudya zvavo.
Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.
38 Vakaitawo izvi kwandiri: Panguva imwe cheteyo vakasvibisa nzvimbo yangu tsvene vakasvibisa maSabata angu.
Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
39 Pazuva ravakabayira vana vavo, kuzvifananidzo zvavo, vakapinda munzvimbo yangu tsvene vakaisvibisa. Ndizvo zvavakaita mumba mangu.
Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.
40 “Vakatuma kunyange nenhume kundodana varume uye pavakasvika iwe wakazvishambidza nokuda kwavo, ukazodza meso ako ndokuzvishongedza noukomba.
“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
41 Wakagara panhoo yakaisvonaka ine tafura yakagadzikwa pamberi payo pawakanga wakaisa zvinonhuhwira namafuta akanga ari angu.
Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.
42 “Mheremhere yavanhu vakanga vasina hanya yakanga yakamukomberedza: VaSabhea vakaunzwa kubva kugwenga pamwe chete navarume vaibva pamhomho yavanhu vezhowezhowe, uye vakashongedza mabhenguro mumaoko omukadzi nomununʼuna wake nekorona dzakaisvonaka pamisoro yavo.
“Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi.
43 Ipapo ndakati pamusoro paiye akanga apera noufeve, ‘Zvino ngavamushandise sechifeve, nokuti ndizvo zvaari.’
Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’
44 Ipapo vakavata naye. Sokuvata kunoita varume nechifeve, saizvozvo vakavata navakadzi nzenza, ivo vanaOhora naOhoribha.
Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.
45 Asi vanhu vakarurama vachavatonga nechirango chinopiwa vakadzi vanoita ufeve uye vanoteura ropa, nokuti ivo zvifeve uye ropa riri pamaoko avo.
Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
46 “Zvanzi naIshe Jehovha: Uyai neboka ravarwi vazovarwisa muvatyise uye muvapambe.
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
47 Mhomho ichavatema namabwe uye igovabaya neminondo; vachauraya vanakomana vavo navanasikana vavo vagopisa dzimba dzavo.
Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.
48 “Saka ndichagumisa unzenza panyika, kuti vakadzi vose vayambirwe vagorega kutevedzera.
“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
49 Ucharangwa nokuda kwounzenza hwako uye uchatakura mubayiro wezvivi zvokufeva kwako. Ipapo uchaziva kuti ndini Ishe Jehovha.”
Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”