< Ekisodho 23 >
1 “Usaparadzira mashoko enhema. Usabatsira munhu akaipa nokuva chapupu chakaipa.
“Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu.
2 “Usatevedzera vanhu vazhinji pakuita zvakaipa. Paunopa umboo mudare redzimhosva, usaminamisa kururamisira uchienda kurutivi rworuzhinji,
“Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi.
3 uye usatsaura munhu murombo uchienda kudivi rake pamhaka yake.
Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.
4 “Kana ukaona nzombe yomuvengi wako kana mbongoro yake yarasika, ona kuti waidzosera kwaari.
“Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ.
5 Kana ukaona mbongoro yomunhu anokuvenga yawira pasi nokuda kwokuremerwa, usaisiya ipapo; iva nechokwadi kuti wamubatsira pairi.
Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ.
6 “Usaramba kururamisira varombo vavanhu vokwako pamatare edzimhosva.
“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.
7 Usava nechokuita nokupomerwa kwemhosva yenhema uye usatongera rufu munhu asina mhosva, kana munhu akatendeka, nokuti ini handizopembedzi munhu ane mhosva.
Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.
8 “Usagamuchira fufuro, nokuti fufuro inopofumadza vaya vanoona uye inomonyorora mashoko owakarurama.
“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
9 “Musadzvinyirira mutorwa; imi pachenyu munoziva kuti zvakaita sei kuva mutorwa, nokuti makanga muri vatorwa muIjipiti.
“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.
10 “Makore matanhatu munofanira kudyara minda yenyu mugokohwa zvirimwa,
“Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya.
11 asi pagore rechinomwe nyika ngairege kurimwa kana kushandiswa. Ipapo varombo vari pakati pavanhu venyu vangawanawo zvokudya kubva mairi, uye zvikara zvesango zvigodya zvavanenge vasiya. Muitewo zvimwe chetezvo kuminda yenyu yemizambiringa neyemiorivhi.
Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
12 “Muite basa renyu mazuva matanhatu, asi pazuva rechinomwe musashanda, kuitira kuti nzombe yako nembongoro yako zvizorore uye nhapwa yakaberekerwa mumba mako, nomutorwa, vazororewo.
“Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
13 “Muchenjerere kuti muite zvose zvandakareva kwamuri. Musareva mazita avamwe vamwari; ngaarege kunzwikwa pamiromo yenyu.
“Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.
14 “Katatu pagore munofanira kupemberera mutambo kwandiri.
“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.
15 “Mupemberere Mutambo weChingwa Chisina Mbiriso; mazuva manomwe, munofanira kudya chingwa chisina mbiriso, sezvandakakurayirai. Muite izvi panguva dzakatarwa mumwedzi waAbhibhi, nokuti mumwedzi iwoyo ndipo pamakabuda kubva muIjipiti. “Hakuna munhu anofanira kumira pamberi pangu asina chinhu.
“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.
16 “Mupemberere Mutambo woKukohwa nezvibereko zvokutanga zvezvirimwa zvamakadyara muminda yenyu. “Mupemberere Mutambo woKuunganidza pakupera kwegore, pamunounganidza zvirimwa zvenyu kubva mumunda.
“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.
17 “Varume vose vanofanira kumira pamberi paIshe Jehovha katatu pagore.
“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
18 “Musapa ropa rechibayiro kwandiri pamwe chete nechinhu chipi zvacho chine mbiriso. “Mafuta ezvipiriso zvangu zvomutambo haafaniri kuchengetwa kusvikira mangwana mangwanani.
“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.
19 “Muuye nezvakanakisisa zvezvibereko zvokutanga zvevhu renyu kuimba yaJehovha Mwari wenyu. “Musabika mbudzana mumukaka wamai vayo.
“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
20 “Tarirai, ndiri kutumira mutumwa pamberi penyu kuti akuchengetei munzira uye kuti akusvitsei kunzvimbo yandakakugadzirirai.
“Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu.
21 Murerekere nzeve dzenyu kwaari mugoteerera zvaanoreva. Musamumukira; iye haangazoregereri kumukira kwenyu, sezvo Zita rangu riri maari.
Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.
22 Kana mukanyatsoteerera kune zvaanoreva nokuita zvose zvandinoreva, ini ndichava muvengi kuvavengi venyu uye ndichapikisa avo vanokupikisai.
Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu.
23 Mutumwa wangu achakutungamirirai uye achakupinzai munyika yavaAmori, vaHiti, vaPerezi, vaKenani, vaHivhi navaJebhusi, uye ndichavapedza chose.
Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.
24 Musapfugamira vamwari vavo kana kuvanamata kana kuwadzana namabasa avo. Munofanira kuvaparadza uye mugoputsa matombo avo anoyera.
Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha.
25 Namatai Jehovha Mwari wenyu, uye ipapo maropafadzo ake achava pane zvokudya zvenyu nemvura yenyu. Ndichabvisa urwere kubva pakati penyu,
Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
26 uye hakuna achabva pamuviri kana asingabereki munyika yenyu. Ndichakupai upenyu huzere.
Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.
27 “Ndichatuma kuvhundutsa kwangu pamberi penyu uye ndichauyisa nyonganiso pamusoro pendudzi dzose dzamunosangana nadzo. Ndichaita kuti vavengi venyu vose vatendeuke vagotiza.
“Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.
28 Ndichatuma mago pamberi penyu kuti adzinge vaHivhi, vaKenani navaHiti kuti vabve munzira yenyu.
Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu.
29 Asi handizovadzingi mugore rimwe chete, nokuti nyika ingazoita sango uye mhuka dzesango dzikakuwandirai.
Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu.
30 Ndichavabvisa pamberi penyu zvishoma zvishoma, kusvikira manyatsowanda kuti mutore nyika.
Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.
31 “Ndichasimbisa miganhu yenyu kubva kuGungwa Dzvuku kusvikira kuGungwa ravaFiristia, uye kubva kuRenje kusvikira kuRwizi. Ndichaisa mumaoko enyu vanhu vagere munyika iyi uye imi muchavadzinga pamberi penyu.
“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.
32 Musaita sungano navo kana navamwari vavo.
Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla.
33 Musavatendera kuti vagare munyika yenyu kuti varege kukuitai kuti munditadzire, nokuti kunamata vamwari vavo kuchava musungo kwamuri zvirokwazvo.”
Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”