< Ekisodho 1 >

1 Aya ndiwo mazita avanakomana vaIsraeri vakaenda naJakobho kuIjipiti, mumwe nomumwe nemhuri yake:
Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya.
2 Rubheni, Simeoni, Revhi naJudha;
Ruben, Simiọn, Livayị na Juda;
3 Isakari, Zebhuruni naBhenjamini;
Isaka, Zebụlọn na Benjamin;
4 Dhani naNafutari; Gadhi naAsheri.
Dan, na Naftalị; Gad na Asha.
5 Zvizvarwa zvose zvaJakobho zvakanga zviri makumi manomwe pakuwanda; Josefa akanga atova muIjipiti.
Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt.
6 Zvino Josefa nehama dzake dzose navose vezera iroro vakafa,
Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara.
7 asi vaIsraeri vakaberekana vakawanda zvikuru uye vakava vazhinji kwazvo, zvokuti nyika yakanga yazara navo.
Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.
8 Ipapo mambo mutsva, akanga asingazivi nezvaJosefa, akatanga kutonga muIjipiti.
Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt,
9 Akati kuvanhu vake, “Tarirai, vaIsraeri vanyanya kuwanda kwazvo.
ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị.
10 Uyai tivafungire zano nokuti vangazonyanya kuwanda uye kana hondo ikamuka, vangazobatana navavengi vedu, vakarwa nesu vakazobva munyika.”
Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.”
11 Saka vakagadza vatariri vebasa pamusoro pavo kuti vavadzvinyirire nebasa rechibharo, uye vakavaka Pitomu neRamesesi kuti ave maguta amatura aFaro.
Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe.
12 Asi pavakanyanya kudzvinyirirwa ndipo pavakanyanya kuwanda uye nokupararira; saka vaIjipita vakasvika pakutya vaIsraeri
Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu.
13 uye vakavashandisa zvino utsinye.
Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu,
14 Vakashungurudza upenyu hwavo nebasa rakaoma rezvidhina nedhaka uye nemhando dzose dzebasa romuminda; vaIjipita vakavashandisa noutsinye mubasa rakaoma.
mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu.
15 Mambo weIjipiti akati kuna vananyamukuta vechiHebheru vainzi Shifura naPua,
Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,
16 “Pamunobatsira vakadzi vechiHebheru pakusununguka uye mukavacherechedza vachisununguka, kana ari mukomana, mumuuraye; kana ari musikana murege ari mupenyu.”
“Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”
17 Asi, vananyamukuta vakanga vachitya Mwari, uye havana kuita zvavakanga varayirwa namambo weIjipiti kuti vaite; vakarega vanakomana vari vapenyu.
Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.
18 Ipapo mambo weIjipiti akadana vananyamukuta akavabvunza achiti, “Seiko maita izvi? Seiko marega vana vechikomana vari vapenyu?”
Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?”
19 Vananyamukuta vakapindura Faro vachiti, “Vakadzi vechiHebheru havana kufanana navakadzi veIjipiti; vane simba uye vanosununguka vananyamukuta vasati vasvika.”
Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”
20 Saka Mwari akaitira vananyamukuta zvakanaka uye vanhu vakawedzerwa vakava vazhinji kwazvo.
Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu.
21 Uye nokuda kwokuti vananyamukuta vaitya Mwari, iye akavapa mhuri dzavo pachavo.
Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
22 Ipapo Faro akarayira vanhu vose kuti, “Vanakomana vose vanoberekwa munofanira kuvakanda murwizi Nairi, asi murege vanasikana vose vari vapenyu.”
Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”

< Ekisodho 1 >