< Dhuteronomi 24 >
1 Kana murume akawana mukadzi akasafadzwa naye nokuti awana chinhu chisina kufanira paari, akamupa rugwaro rwokumuramba, uye akamudzinga kubva mumba make,
Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya.
2 uye kana mushure mokunge abva mumba make akandowanikwa nomumwe murume,
Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya,
3 uye murume wake wechipiri akasamufarira, akamupa rugwaro rwokumuramba, uye akamudzinga kubva mumba make, kana kuti murume uyu akafa,
ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ,
4 ipapo murume wake wokutanga, akambomuramba, haabvumirwi kumuwana zvakare mushure mokunge asvibiswa. Izvozvo zvinonyangadza pamberi paJehovha. Musauyisa chivi pamusoro penyika yamuri kupiwa naJehovha Mwari wenyu senhaka.
nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
5 Kana murume achangobva kuwana, haafaniri kuendeswa kuhondo kana kupiwa rimwe basa zvaro rokuita. Kwegore rimwe chete anofanira kusununguka kuti agare pamba agofadza mukadzi wake waakawana.
Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.
6 Usatora guyo kana huyo sorubatso rwechikwereti, nokuti unenge watora zvinoraramisa munhu sorubatso.
Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
7 Kana munhu akawanikwa achitapa hama yake yomuIsraeri uye achimubata senhapwa kana kumutengesa, nyakubata munhu anofanira kufa. Munofanira kubvisa chakaipa pakati penyu.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị.
8 Muchenjere kwazvo pachirwere chamaperembudzi kuti muite chaizvoizvo zvamakarayirwa navaprista vanova vaRevhi. Munofanira kuchenjerera kutevera zvandakavarayira.
Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.
9 Murangarire zvakaitwa naJehovha Mwari wenyu kuna Miriamu panzira mushure mokunge mabuda muIjipiti.
Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
10 Kana ukakweretesa chinhu chipi zvacho kumuvakidzani wako, usapinda mumba momuvakidzani wako kundotora zvaari kukupa sorubatso.
Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.
11 Gara panze urege munhu wauri kupa chikwereti akuvigire rubatso.
Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.
12 Kana munhu uyu ari murombo, usaende kundovata une rubatso rwake.
Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
13 Dzosera jasi rake kwaari pakuvira kwezuva kuti agovata mariri. Ipapo achakutenda, uye zvigoonekwa sokuita kwakarurama pamberi paJehovha Mwari wako.
Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume.
14 Usamanikidza mushandi wako kana ari murombo kana munhu anoshayiwa, hazvinei kuti ihama yako muIsraeri kana kuti mutorwa anogara mune rimwe ramaguta enyu.
Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.
15 Mupe mubayiro wake zuva risati ravira, nokuti iye murombo akatotarirawo pamugove wake. Nokuti angazochema kuna Jehovha pamusoro pako, uye uchazova nemhosva yokutadza.
Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo Onyenwe anyị megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie.
16 Madzibaba haafaniri kuurayiwa nokuda kwevana vavo, kana vana kuurayiwa nokuda kwamadzibaba avo; mumwe nomumwe achafira chivi chake.
Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
17 Usarega kururamisira mutorwa kana nherera, uye usatora nguo yechirikadzi sorubatso.
Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.
18 Murangarire kuti maimbova varanda muIjipiti uye Jehovha Mwari wenyu akakudzikinurai kubva ikoko. Ndokusaka ndichikurayirai kuti muite izvi.
Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.
19 Kana uchikohwa munda wako ukakanganwa chisote, usachidzokera kundochitora. Chisiyire mutorwa, nherera kana chirikadzi, kuitira kuti Jehovha Mwari wako agokuropafadza mumabasa ose amaoko ako.
Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba.
20 Kana wazunza miti yako yamaorivhi, usandozunzazve rwechipiri. Siyira asara kumutorwa, nherera nechirikadzi.
Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.
21 Kana uchikohwa mazambiringa mumunda wako womuzambiringa, usadzokorora kukohwa. Siyira zvinosara kumutorwa, nherera nechirikadzi.
Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
22 Murangarire kuti maiva varanda muIjipiti. Ndokusaka ndichikurayirai kuti muite izvi.
Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.