< Dhuteronomi 14 >

1 Imi muri vana vaJehovha Mwari wenyu. Musazvicheka kana kuzviveura pamberi pomusoro muchiitira vakafa,
Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.
2 nokuti muri rudzi rutsvene kuna Jehovha Mwari wenyu. Jehovha akakutsaurai kubva pakati pendudzi dzose dziri panyika kuti muve rudzi rwake runokosha.
Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya.
3 Musadya chinhu chipi zvacho chinonyangadza.
Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
4 Idzi ndidzo mhuka dzamungadya: mombe, hwai, mbudzi,
Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
5 nondo, mhara, mhembwe, ngururu, mharapara, nyati nehwai yomugomo.
na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
6 Mungadya henyu mhuka ipi neipi ina mahwanda akaparadzana kuita maviri uye inodzeya.
Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.
7 Zvisinei, pane idzo dzinodzeya kana dzina mahwanda akaparadzana, mahwanda akanyatsoparadzana, hamufaniri kudya ngamera, tsuro kana mbira. Kunyange zvazvo dzichidzeya hadzina mahwanda akaparadzana; hadzina kuchena kwamuri.
Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
8 Nguruvewo haina kuchena; kunyange zvayo ina mahwanda akaparadzana, haidzeyi. Hamufaniri kudya nyama yadzo kana kubata zvitunha zvadzo.
Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.
9 Pazvipuka zvose zvinogara mumvura, mungadya henyu zvose zvine zvimbi namakwande.
Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,
10 Asi chipi nechipi zvacho chisina zvimbi namakwande hamufaniri kudya; nokuti hachina kuchena.
ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.
11 Mungadya henyu shiri ipi neipi yakachena.
Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,
12 Asi dzamusingafaniri kudya ndeidzi: gondo, gora, gora dema,
ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii,
13 njerere tsvuku, njerere nhema, rukodzi namarudzi arwo,
na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche,
14 gunguo namarudzi aro ose,
na ugolọma ọbụla dị iche iche,
15 zizi renyanga, kazizimbori, shiri yegungwa, namarudzi ose eruvangu,
na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche,
16 zizi duku, zizi guru, zizi jena,
na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi,
17 zizi romurenje, hukurwizi nekanyururahove,
na okwolo na udele, na komorant,
18 neshuramurove namarudzi ose ekondo, nemhupupu uye nechiremwaremwa.
na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.
19 Zvipuka zvose zvina mapapiro zvinokambaira hazvina kuchena kwamuri; hamufaniri kuzvidya.
Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha,
20 Asi zvipuka zvose zvina mapapiro zvakachena mungadya henyu.
Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.
21 Musadya chii zvacho chamunoona chakafa. Mungapa zvenyu kumutorwa agere mune rimwe ramaguta enyu, uye angadya zvake kana kuti mungatengesera zvenyu kumutorwa. Asi imi muri rudzi rutsvene kuna Jehovha Mwari wenyu. Musabika mbudzana mumukaka wamai vayo.
Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.
22 Chenjera kuti utsaure chegumi chezvinhu zvose zvaunokohwa muminda yako gore negore.
Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.
23 Udye chegumi chezviyo, newaini itsva namafuta uye nezvibereko zvokutanga zvemombe dzako nezvamakwai ako pamberi paJehovha Mwari wako panzvimbo yaachasarudza kuti Zita rake rigarepo, kuitira kuti udzidze kutya Jehovha Mwari wako nguva dzose.
Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.
24 Asi kana nzvimbo yacho iri kure uye waropafadzwa naJehovha Mwari wako, uye usingagoni kutakura chegumi chako (nokuti nzvimbo ichasarudzwa naJehovha kuti Zita rake rigarepo iri kure),
Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),
25 ipapo unofanira kutsinhanisa chegumi chako nesirivha, ugotora sirivha ugoenda nayo kunzvimbo ichasarudzwa naJehovha Mwari wako.
mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.
26 Shandisa sirivha yacho kutenga zvaungada, zvakadai sezvizvi: mombe, makwai, waini kana zvimwe zvokunwa zvinobata, kana chinhu chipi zvacho chaunoda. Ipapo iwe neimba yako muchadya pamberi paJehovha Mwari wenyu mugofara.
Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.
27 Uye musazokanganwa vaRevhi vagere mumaguta enyu, nokuti havana mugove kana nhaka yavowo.
Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị.
28 Panopera makore matatu oga oga, munofanira kuuya nezvegumi zvegore iroro uye mugozvichengetera mumaguta enyu,
Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,
29 kuitira kuti vaRevhi (avo vasina mugove kana nhaka yavowo) uye nomweni, nherera nechirikadzi vanogara mumaguta enyu, vauye vagodya vachiguta, uye kuitira kuti Jehovha Mwari wenyu akuropafadzei pamabasa ose amaoko enyu.
ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.

< Dhuteronomi 14 >