< 2 Madzimambo 8 >

1 Zvino Erisha akanga ati kumukadzi waakararamisira mwanakomana wake, “Enda kure iwe neimba yako unogara chero paunogona kugara, nokuti Jehovha akarayira nzara ichapedza makore manomwe panyika.”
Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”
2 Naizvozvo mukadzi akasimuka akaita sezvakanga zvarehwa nomunhu waMwari. Akaenda iye neveimba yake akandogara kwamakore manomwe kunyika yavaFiristia.
Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.
3 Makore manomwe akati akapera, akadzoka kunyika yavaFiristia akaenda kuna mambo akandokumbira kuti adzorerwe imba yake nomunda wake.
Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.
4 Zvino mambo akanga achitaurirana naGehazi, muranda womunhu waMwari, uye akanga ati kwaari, “Nditaurirewo pamusoro pezvinhu zvikuru zvose zvakaitwa naErisha.”
Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”
5 Gehazi achiri kutaurira mambo kuti Erisha akanga araramisa sei mukomana akanga afa, mukadzi aiva nomwanakomana akanga araramiswa naErisha akabva asvika kuti azokumbira imba yake nomunda wake kuna mambo. Gehazi akati, “Uyu ndiye mukadzi wacho, ishe wangu mambo, uye uyu ndiye mwanakomana wake akararamiswa naErisha.”
Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”
6 Zvino mambo akabvunza mukadzi pamusoro paizvozvo, iye akamutaurira. Ipapo akatuma mubati kuti aone nezvenyaya yomukadzi uyu akati, “Mudzorerei zvake zvose pamwe nezvibereko zvinobva pamunda wake kubvira pazuva raakabva munyika ino kusvikira zvino.”
Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.
7 Erisha akaenda kuDhamasiko uye Bheni-Hadhadhi mambo wavaAramu airwara. Mambo akati audzwa kuti, “Munhu waMwari asvika kuno,”
Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.”
8 iye akati kuna Hazaeri, “Tora chipo uende nacho unosangana nomunhu waMwari. Undibvunzirewo Jehovha kubudikidza naye; umubvunze kuti, ‘Ndichaporawo here pakurwara uku?’”
Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’”
9 Hazaeri akaenda kundosangana naErisha, akamuvigira chipo chezvipfeko zvose zvakanga zvakanaka kwazvo zveDhamasiko zvaitakurwa namakumi mana engamera. Akapinda mumba akamira pamberi pake, akati, “Mwanakomana wenyu Bheni-Hadhadhi mambo wavaAramu andituma kuti ndizobvunza kuti, ‘Ndichaporawo here pakurwara uku?’”
Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’”
10 Erisha akapindura akati, “Enda unoti kwaari, Zvirokwazvo muchapora, asi Jehovha akandiratidza kuti vachafa zvirokwazvo.”
Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.”
11 Akaramba akamutarisa kusvikira Hazaeri anyara. Ipapo munhu waMwari akatanga kuchema.
Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.
12 Hazaeri akamubvunza akati, “Seiko ishe wangu achichema?” Iye akapindura akati, “Nokuti ndinoziva zvakaipa zvauchaitira vaIsraeri. Uchapisa nhare dzavo nomoto, uchauraya majaya avo nomunondo, ucharovera pwere dzavo pasi, uye uchatumbura vakadzi vavo vane mimba.”
Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”
13 Hazaeri akati, “Ko, muranda wenyu chiiko, iyo imbwa zvayo, kuti angaita chinhu chakakura kudai?” Erisha akapindura akati, “Jehovha akandiratidza kuti iwe uchava mambo wavaAramu.”
Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”
14 Ipapo Hazaeri akabva pana Erisha akadzokera kuna tenzi wake. Bheni-Hadhadhi paakabvunza achiti, “Erisha akati kudini kwauri?” Hazaeri akapindura akati, “Akandiudza kuti zvirokwazvo muchapora.”
Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”
15 Asi nezuva raitevera akatora jira akarinyika mumvura akapfumbira chiso chamambo kusvikira afa. Ipapo Hazaeri akamutevera paumambo.
Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
16 Mugore rechishanu raJoramu mwanakomana waAhabhu mambo weIsraeri, Jehoshafati ari mambo weJudha, Jehoramu mwanakomana waJehoshafati akatanga kutonga kwake samambo weJudha.
Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda.
17 Akanga ava namakore makumi matatu namaviri paakava mambo, uye akatonga muJerusarema kwamakore masere.
Ọ dị iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
18 Akafamba munzira dzamadzimambo eIsraeri, sezvakaita imba yaAhabhu, nokuti akawana mwanasikana waAhabhu. Akaita zvakaipa pamberi paJehovha.
O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
19 Kunyange zvakadaro, Jehovha akanga asingadi kuparadza Judha, nokuda kwomuranda wake Dhavhidhi. Akanga avimbisa kupa mwenje kwaari nokuvana vake nokusingaperi.
Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi.
20 Munguva yaJehoramu, Edhomu yakapandukira Judha ikazvigadzira mambo wayo.
Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
21 Naizvozvo Jehoramu akaenda kuZairi nengoro dzake dzose. VaEdhomu vakamukomba iye navakuru vake vengoro, asi akamuka usiku akavarwisa; uye hondo yake yakatizira kumusha.
Ya mere, Jehoram duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha.
22 Naizvozvo vaEdhomu vakabva vamukira vaJudha kusvikira nhasi. Ribhina yakapandukawo panguva imwe cheteyo.
Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ.
23 Zvimwe zvakaitwa pamazuva okutonga kwaJehoramu nezvose zvaakaita, hazvina kunyorwa here mubhuku renhoroondo dzamadzimambo aJudha?
Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha?
24 Jehoramu akavata namadzibaba ake akavigwa pamwe chete navo muguta raDhavhidhi. Ahazia mwanakomana wake akamutevera paumambo.
Joram sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri nna ya ha nʼobodo Devid. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
25 Mugore regumi namaviri raJoramu, mwanakomana waAhabhu, mambo weIsraeri, Ahazia, mwanakomana waJehoramu, mambo weJudha akatanga kutonga.
Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị.
26 Ahazia akanga ana makore makumi maviri namaviri paakava mambo, akatonga muJerusarema kwegore rimwe chete. Zita ramai vake rainzi Ataria, muzukuru waOmuri, mambo weIsraeri.
Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya, nwa nwa Omri, eze Izrel
27 Akafamba munzira dzeimba yaAhabhu akaita zvakaipa pamberi paJehovha, sezvakaitwa neimba yaAhabhu, nokuti akanga ari mukuwasha kumhuri yaAhabhu.
O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.
28 Ahazia akaenda naJoramu mwanakomana waAhabhu kundorwa naHazaeri, mambo weAramu, paRamoti Gireadhi. VaAramu vakakuvadza Joramu;
Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ.
29 naizvozvo mambo Joramu akadzokera kuJezireeri kuti ambondopora maronda aakanga akakuvadzwa navaAramu paRamoti mukurwa kwake naHazaeri mambo weAramu. Ipapo Ahazia mwanakomana waJehoramu, mambo weJudha, akadzika kuJezireeri kundoona Joramu, mwanakomana waAhabhu, nokuti akanga akuvadzwa.
Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.

< 2 Madzimambo 8 >