< 2 Madzimambo 5 >

1 Zvino Naamani, mukuru wehondo yamambo weAramu, aiva munhu mukuru kwazvo pamberi patenzi wake uye aikudzwa zvikuru, nokuti kubudikidza naye, Jehovha akapa mambo weAramu kukunda. Aiva murwi ane simba noumhare, asi aiva namaperembudzi.
Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta.
2 Zvino mauto eAramu akabuda kundorwa akadzoka ava nomusikana weIsraeri wavakanga vatapa, uye akashandira mukadzi waNaamani.
Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi.
3 Akati kuna tenzikadzi wake, “Dai tenzi wangu aiona muprofita ari muSamaria! Aizomuporesa pamaperembudzi ake.”
Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.”
4 Naamani akaenda kuna tenzi wake akamutaurira zvaakanga audzwa nomusikana akanga abva kuIsraeri.
Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru.
5 Mambo weAramu akati, “Zvakanaka, enda hako. Ini ndichatumirawo tsamba kuna mambo weIsraeri.” Naizvozvo Naamani akaenda, akatora matarenda gumi esirivha nezviuru zvitanhatu zvamashekeri egoridhe uye nemhando gumi dzenguo.
Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ.
6 Tsamba yaakaenda nayo kuna mambo weIsraeri yaiti: “Ndatuma muranda wangu Naamani netsamba iyi kuti umurape maperembudzi ake.”
Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.”
7 Mambo weIsraeri akati achangopedza kuverenga tsamba iyi, akabvarura nguo dzake akati, “Ndini Mwari here? Ndinogona kuuraya nokuraramisa here? Sei murume uyu atuma munhu kwandiri kuti azorapwa maperembudzi ake. Onai kuti anoedza sei kutsvaka bopoto neni!”
Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”
8 Erisha munhu waMwari, akati anzwa kuti mambo weIsraeri abvarura nguo dzake, akamutumira shoko akati, “Mabvarurireiko nguo dzenyu? Regai murume uyo auye kwandiri, uye achaziva kuti muIsraeri mune muprofita.”
Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.”
9 Naizvozvo Naamani akaenda namabhiza ake nengoro akandomira pamukova weimba yaErisha.
Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya.
10 Erisha akatuma nhume yake kwaari achiti, “Enda unoshamba kanomwe muJorodhani, ipapo nyama yako ichadzoredzerwa pakare uye uchava wakanatswa.”
Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.”
11 Asi Naamani akabvapo atsamwa akati, “Ndanga ndichifunga kuti zvirokwazvo achauya kwandiri agomira achidana kuzita raJehovha Mwari wake, agoninira ruoko rwake panzvimbo yacho agondiporesa maperembudzi.
Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m.
12 Ko, Abhana neFaripari, idzo nzizi dzeDhamasiko, hadzisi nani kupinda mvura yose yeIsraeri here? Handaigona kushamba madziri ndikanatswa here?” Naizvozvo akabvapo akaenda akatsamwa kwazvo.
Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.
13 Varanda vaNaamani vakaenda kwaari vakati, “Nhai baba, dai muprofita anga akuudzai kuti muite chinhu chikuru, hamaizochiita here? Zvino zvaati kwamuri, ‘Shambai mugonatswa!’”
Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’”
14 Saka akaburuka akandozvinyudza muna Jorodhani kanomwe, sezvaakanga audzwa nomunhu waMwari, nyama yake ikadzoredzerwa pakare ikava yakachena, seyomwana mucheche.
Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.
15 Ipapo Naamani akadzokera neboka rake rose kumunhu waMwari. Akamira pamberi pake akati, “Zvino ndava kuziva kuti hakuna Mwari panyika yose kunze kwomunyika yeIsraeri. Ndapota, gamuchirai chipo chabva kumuranda wenyu.”
Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”
16 Asi muprofita akati, “Zvirokwazvo, naJehovha mupenyu, iye wandinoshumira, handisi kuzogamuchira chinhu.” Kunyange zvazvo Naamani akamugombedzera, iye akaramba.
Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.
17 Naamani akati, “Ndapota, kana musingadi, muranda wenyu ngaapiwe hake ivhu ringatakurwa namanyurusi maviri, nokuti muranda wenyu haachambofazve akaita chipiriso chinopiswa nechibayiro kuna vamwe vamwari vapi zvavo asi kuna Jehovha.
Mgbe ahụ Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na ị gaghị anara, biko, kwerenụ ka m kporo aja nke ịnyịnya abụọ nwere ike ibu. Nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, agaghị m achụrụ chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị.
18 Asi Jehovha ngaakanganwire muranda wenyu pachinhu chimwe chete ichi: Vatenzi vangu pavanopinda mutemberi yaRimoni kundonamatamo pasi, uye vakasendamira paruoko rwangu, neni ndikakotama ndirimowo, pandinokotama mutemberi yaRimoni, Jehovha ngaakanganwire muranda wenyu pachinhu ichi.”
Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.”
19 Erisha akati, “Enda hako norugare.” Mushure mokunge Naamani afamba kwechinhambo,
Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya,
20 Gehazi muranda waErisha munhu waMwari, akati mumwoyo make, “Tenzi wangu arerutsira zvakanyanya Naamani, muAramu uyu, pakusagamuchira kubva kwaari zvaanga auya nazvo. Zvirokwazvo naJehovha mupenyu, ndichamhanya ndimutevere ndigotora chimwe chinhu kwaari.”
Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.”
21 Naizvozvo Gehazi akatevera Naamani. Zvino Naamani akati amuona achimumhanyira, akaburuka mungoro kuti andosangana naye. Akati kwaari, “Kwakanaka here?”
Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?”
22 Gehazi akapindura akati, “Kwakanaka. Tenzi wangu andituma achiti, ‘Pane majaya maviri abva kuboka ravaprofita achangosvika kwandiri achibva kunyika yamakomo yaEfuremu. Ndapota, muvape henyu tarenda resirivha nemhando mbiri dzenguo.’”
“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’”
23 Naamani akati, “Torai henyu matarenda maviri.” Akagombedzera Gehazi kuti azvigamuchire, ndokubva asungira matarenda maviri esirivha mumasaga maviri, nemhando mbiri dzenguo. Akazvipa kuvaranda vake vaviri, vakazvitakura vari mberi kwaGehazi.
Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi.
24 Gehazi akati asvika pachikomo, akatora zvinhu kubva kuvaranda akazviisa mumba make. Akadzosa varume vaya ivo ndokuenda havo.
Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.
25 Ipapo akapinda akandomira pamberi paErisha tenzi wake. Erisha akamubvunza akati, “Wanga uripiko Gehazi?” Gehazi akapindura akati, “Muranda wenyu haana kwaamboenda.”
Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
26 Asi Erisha akati kwaari, “Mweya wangu wanga usinewe here paburuka murume mungoro yake kuti azosangana newe? Ko, ino inguva yokutora mari kana kugamuchira nguo, neminda yemiorivhi, neyemizambiringa, namakwai, nemombe, kana varandarume navarandakadzi here?
Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?
27 Naizvozvo maperembudzi aNaamani achanamatira pauri iwe nezvizvarwa zvako nokusingaperi.” Ipapo Gehazi akabva pamberi paErisha ava namaperembudzi, achena sechando.
Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha.

< 2 Madzimambo 5 >