< 2 Makoronike 13 >
1 Mugore regumi namasere rokutonga kwaJerobhoamu, Abhija akava mambo weJudha.
Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam.
2 Uye akatonga muJerusarema kwamakore matatu. Zita ramai vake rainzi Maaka, mwanasikana waUrieri weGibhea. Pakava nokurwisana pakati paAbhija naJerobhoamu.
Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea. Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
3 Abhija akaenda kundorwa nehondo yaiva navarume zviuru mazana mana vaigona kurwa, uye Jerobhoamu akamurwisa navarwi zviuru mazana masere vaigona kurwa.
Abija họpụtara ndị ya dị ike nʼagha bụ ndị ọnụọgụgụ ha dị narị puku anọ, ma Jeroboam eze Izrel họpụtara ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku asatọ doo ha nʼusoro.
4 Abhija akamira paGomo reZemaraimi munyika yezvikomo yeEfuremu akati, “Iwe Jerobhoamu neIsraeri yose teererai kwandiri!
Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị!
5 Hamuzivi here kuti Jehovha Mwari waIsraeri, akapa umambo hwaIsraeri kuna Dhavhidhi navana vake nokusingaperi nesungano yemunyu?”
Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?
6 Asi Jerobhoamu mwanakomana waNebhati, mumwe wavakuru vaSoromoni, mwanakomana waDhavhidhi akapandukira mambo wake.
Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.
7 Vamwe vakapikisana naRehobhoamu mwanakomana waSoromoni paakanga achiri mudiki asati ava kugona kuzvisarudzira zvaaida uye asati asimba kuti angarwisana navo.
Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.
8 “Uye zvino mava kurangana kurwisana noumambo hwaJehovha, huri mumaoko ezvizvarwa zvaDhavhidhi. Zvirokwazvo muri hondo huru; uye mune zvimhuru zvegoridhe zvakagadzirwa naJerobhoamu kuti zvive vamwari venyu.
“Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.
9 Asi hamuna kudzinga here vaprista vaJehovha, vanakomana vaAroni navaRevhi mukagadza vaprista venyu moga sezvinoitwa navamwe vanhu vedzimwe nyika? Ani naani anenge auya kuzozvitsaura nehando diki namakondobwe manomwe anogona kuva muprista wezvisiri zvamwari.
Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.
10 “Asi kana tiri isu, Jehovha ndiye Mwari wedu, uye hatina kumurasa. Vaprista vanoshumira Jehovha vana vaAroni, uye vaRevhi vanovabatsira.
“Ma banyere anyị, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere Onyenwe anyị ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka.
11 Mangwanani namanheru oga oga vanopisa zvipiriso zvinopiswa nezvinonhuhwira kuna Jehovha. Vanoisa chingwa patafura yakanatswa uye vanobatidza mwenje iri pazvigadziko zvegoridhe manheru oga oga. Tiri kutevera zvinodikanwa naJehovha Mwari wedu asi imi makamurasa.
Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.
12 Mwari anesu; ndiye mutungamiri wedu. Vaprista vake nehwamanda dzavo vachakuridzirai mhere yehondo. Varume veIsraeri, musarwisana naJehovha, Mwari wamadzibaba enyu, nokuti hamuzokundi.”
Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”
13 Zvino Jerobhoamu akanga atuma mamwe mapoka avarwi nokushure kwavo kuitira kuti iye paainge ari mberi kwaJudha vamwe vainge vakavandira shure kwavo.
Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ.
14 VaJudha vakatendeuka vakaona kuti vakanga vava kurwiswa kwose mberi neshure. Ipapo vakachema kuna Jehovha. Vaprista vakaridza hwamanda dzavo,
Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.
15 varume veJudha vakaita mhere yehondo. Pakangonzwikwa mhere yehondo, Mwari akaparadza Jerobhoamu neIsraeri yose pamberi paAbhija navanhu veJudha.
Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.
16 VaIsraeri vakatiza pamberi paJudha uye Mwari akavaisa mumaoko avo.
Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.
17 Abhija navanhu vake vakaparadza vazhinji vavo kwazvo, zvokuti zviuru mazana mashanu zvavarume vaigona kurwa pakati paIsraeri vakafa.
Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.
18 Varume veIsraeri vakakundwa panguva iyi, uye varume veJudha vakakunda nokuti vaivimba naJehovha, Mwari wamadzibaba avo.
Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.
19 Abhija akatevera Jerobhoamu akatora kubva kwaari maguta anoti Bheteri, Jeshana, neEfuroni nemisha yawo yakapoteredza.
Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
20 Jerobhoamu haana kuzotongazve panguva yaAbhija. Uye Jehovha akamurova akafa.
Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya Onyenwe anyị tidara ya tigbuo ya.
21 Asi Abhija akakura pasimba. Akawana vakadzi gumi navana uye akava navanakomana makumi maviri nevaviri uye navanasikana gumi navatanhatu.
Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii.
22 Mamwe mabasa okutonga kwaAbhija, zvaakaita nezvaakataura, zvakanyorwa mumashoko ezvinyorwa zvamuprofita Idho.
Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.