< 1 Madzimambo 21 >

1 Kwapera nguva yakati, pane imwe nyaya yakaitika pamusoro pomunda wemizambiringa waNabhoti muJezireeri. Munda wemizambiringa uyu waiva muJezireeri, pedyo nomuzinda waAhabhu mambo weSamaria.
Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye Jezril, nwere ubi vaịnị dị na Jezril, nʼakụkụ ụlọeze Ehab bụ eze Sameria.
2 Ahabhu akati kuna Nabhoti, “Ndipe munda wako wemizambiringa kuti ndiuite bindu romuriwo, sezvo uri pedyo nomuzinda wangu. Ini ndichatsinhanhisa nokukupa munda wemizambiringa uri nani, kana kuti, kana uchida, ndichakuripa mari inoenderana nomutengo wawo.”
Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.”
3 Asi Nabhoti akapindura akati, “Jehovha ngaazvirambidze kuti ndikupei nhaka yamadzibaba angu.”
Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.”
4 Saka Ahabhu akaenda kumba akasuwa uye akashatirwa nokuti Nabhoti muJezireeri akanga ati, “Handisi kuzokupai nhaka yamadzibaba angu.” Akarara pamubhedha wake akazvidya mwoyo, akaramba kudya.
Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla.
5 Jezebheri, mukadzi wake, akapindamo akamubvunza akati, “Sei makasuwa kudai? Sei musiri kudya?”
Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?”
6 Akamupindura akati, “Nokuti ndati kuna Nabhoti muJezireeri, ‘Nditengesere munda wako wemizambiringa; kana kuti, kana uchida, ndichakupa mumwe munda wemizambiringa kune imwe nzvimbo kuti, utsive uyu.’ Asi iye ati, ‘Handisi kuzokupai munda wangu wemizambiringa.’”
Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.”
7 Jezebheri, mukadzi wake akati, “Izvi ndizvo here zvamunoita samambo weIsraeri? Simukai mudye! Faranukai. Ndichakuwanirai munda wemizambiringa waNabhoti muJezireeri.”
Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.”
8 Naizvozvo akanyora matsamba muzita raAhabhu, akadhinda chidhindo chake padziri, akadzitumira kuvakuru nokumachinda aaigara nawo muguta raNabhoti.
Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.
9 Mumatsamba aya akanyora akati: “Daidzirai zuva rokutsanya mugogadzika Nabhoti panzvimbo yakakwirira pakati pavanhu.
Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa.
10 Asi gadzai nhubu mbiri pakatarisana naye uye mugoita kuti dzipupure dzichiti akatuka Mwari namambo. Ipapo mutorei muende naye kunze mugomutaka namabwe kusvikira afa.”
Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.”
11 Saka vakuru namachinda vaigara muguta raNabhoti vakaita sezvakanga zvarayirwa naJezebheri mumatsamba aakanga avanyorera.
Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.
12 Vakadaidzira zuva rokutsanya ndokugadzika Nabhoti panzvimbo yakakwirira pakati pavanhu.
Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa.
13 Ipapo nhubu mbiri dzakauya dzikagara dzakatarisana naye dzikapomera Nabhoti mhosva pamberi pavanhu, dzichiti, “Nabhoti akatuka Mwari namambo.” Naizvozvo vakamutora vakaenda naye kunze kweguta vakamutaka namabwe kusvikira afa.
Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.
14 Ipapo vakatumira shoko kuna Jezebheri vachiti, “Nabhoti atakwa namabwe uye afa.”
Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla.
15 Jezebheri paakangonzwa chete kuti Nabhoti akanga atakwa namabwe akafa, akati kuna Ahabhu, “Simukai muende mundotora munda wemizambiringa waNabhoti muJezireeri waakaramba kukutengeserai. Haachisiri mupenyu, asi afa.”
Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”
16 Ahabhu paakanzwa kuti Nabhoti akanga afa, akasimuka akaenda kundotora munda wemizambiringa waNabhoti.
Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.
17 Zvino shoko raJehovha rakasvika kuna Eria muTishibhi richiti,
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,
18 “Buruka pasi undosangana naAhabhu mambo weIsraeri, uyo ari kutonga muSamaria. Iye zvino ari mumunda wemizambiringa waNabhoti, waaenda kundotora.
“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.
19 Uti kwaari, ‘Zvanzi naJehovha: Hauna here kuuraya munhu ukamutorera zvinhu zvake?’ Ipapo uti kwaari, ‘Zvanzi naJehovha: Panzvimbo yakananzvwa ropa raNabhoti nembwa, imbwa dzichananzva ropa rakowo ipapo, hongu, rako!’”
Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’”
20 Ahabhu akati kuna Eria, “Saka wandiwanaka, muvengi wangu!” Akapindura akati, “Ndakuwana nokuti wazvitengesa kuti uite zvakaipa pamberi paJehovha.
Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
21 ‘Ndichauyisa dambudziko guru pamusoro pako. Ndichaparadza vana vako ndigouraya murume wose weimba yaAhabhu muIsraeri, muranda neasiri muranda.
Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.
22 Ndichaita kuti imba yako ifanane neyaJerobhoamu mwanakomana waNebhati neyaBhaasha mwanakomana waAhija, nokuti waita kuti ndishatirwe uye waita kuti Israeri iite chivi.’
Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’
23 “Zvino kana ari Jezebheriwo, Jehovha anoti: ‘Imbwa dzichadya Jezebheri pamasvingo eJezireeri.’
“Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’
24 “Imbwa dzichadya avo vaAhabhu vachafira muguta, uye shiri dzedenga dzichadya avo vachafira musango.”
“Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”
25 Hapana kumbova nomunhu akaita saAhabhu, akazvitengesa kuti aite zvakaipa pamberi paJehovha, achikurudzirwa naJezebheri mukadzi wake.
(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.
26 Akaita zvinonyangadza kwazvo nokutevera zvifananidzo, sezvakanga zvaitwa navaAmori, avo vakanga vadzingwa naJehovha pamberi pavaIsraeri.
Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.)
27 Ahabhu paakanzwa mashoko aya, akabvarura nguo dzake, akapfeka masaga akatsanya. Akapfeka masaga akafamba achizvininipisa.
Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.
28 Ipapo shoko raJehovha rakauya kuna Eria muTishibhi richiti,
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya,
29 “Waona here kuti Ahabhu azvininipisa sei pamberi pangu? Nokuti azvininipisa, handichauyisa dambudziko guru iri mumazuva ake, asi ndichariuyisa paimba yake mumazuva omwanakomana wake.”
“Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”

< 1 Madzimambo 21 >