< 1 Madzimambo 16 >

1 Zvino shoko raJehovha rakasvika kuna Jehu mwanakomana waHanani richipikisana naBhaasha richiti,
Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya,
2 “Ndakakusimudza kubva muguruva ndikakuita mutungamiri wavanhu vangu Israeri, asi wakafamba munzira dzaJerobhoamu ukaita kuti vanhu vangu Israeri vaite chivi, nokuita kuti nditsamwe nokuda kwezvivi zvavo.
“Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha.
3 Naizvozvo ndava kuda kuparadza Bhaasha neimba yake, uye ndichaita kuti imba yako ifanane neimba yaJerobhoamu mwanakomana waNebhati.
Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat.
4 Imbwa dzichadya vose vaBhaasha vachafira muguta, uye shiri dzedenga dzichadya avo vachafira kusango.”
Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.”
5 Kana zviri zvimwe zvakaitika panguva yokutonga kwaBhaasha, nesimba rake, hazvina kunyorwa here mubhuku renhoroondo dzegore negore dzamadzimambo eIsraeri?
Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel?
6 Bhaasha akazorora namadzibaba ake uye akavigwa muTiza. Zvino Era, mwanakomana wake, akamutevera paumambo.
Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.
7 Pamusoro paizvozvo, shoko raJehovha rakauyawo nokumuprofita Jehu mwanakomana waHanani kuna Bhaasha neimba yake, nokuda kwezvakaipa zvose zvaakanga aita pamberi paJehovha achimutsamwisa nezvaakaita, achifanana neimba yaJerobhoamu, uyewo nokuti akaiparadza.
Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ.
8 Mugore ramakumi maviri namatanhatu raAsa mambo weJudha, Era, mwanakomana waBhaasha akava mambo weIsraeri, uye akatonga muTiza kwamakore maviri.
Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.
9 Zimuri, mumwe wamachinda ake, aitungamirira hafu yengoro dzake, akamumukira. Era akanga ari muTiza panguva iyoyo, achidhakwa zvake pamba paAza, murume aichengeta muzinda wamambo paTiza.
Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.
10 Zimuri akapinda, akamubaya akamuuraya, mugore ramakumi maviri namanomwe raAsa, mambo weJudha. Ipapo akabva amutevera paumambo.
Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.
11 Paakatanga kutonga, achangogara pachigaro choushe, akauraya mhuri yose yaBhaasha. Haana kusiya murume mumwe chete, hama kana shamwari.
Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.
12 Saizvozvo Zimuri akaparadza mhuri yose yaBhaasha, sezvakanga zvarehwa neshoko raJehovha rakataurwa richipikisa Bhaasha nokumuprofita Jehu,
Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu.
13 nokuda kwezvivi zvose zvakanga zvaitwa naBhaasha nomwanakomana wake Era nezvaakaita kuti Israeri iite, zvokuti vakaita kuti Jehovha, Mwari waIsraeri, atsamwe, nokuda kwezvifananidzo zvavo zvisina maturo.
Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.
14 Kana zviri zvimwe zvakaitika panguva yokutonga kwaEra, nezvose zvaakaita, hazvina kunyorwa here mubhuku renhoroondo dzegore negore dzamadzimambo eIsraeri?
Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?
15 Mugore ramakumi maviri namanomwe raAsa, mambo weJudha, Zimuri akatonga muTiza kwamazuva manomwe. Varwi vakanga vakadzika misasa pedyo neGibhetoni, guta ravaFiristia.
Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.
16 VaIsraeri vakanga vari kumisasa pavakanzwa kuti Zimuri akanga amukira mambo akamuuraya, vakagadza Omuri mutungamiri wehondo, kuti ave mambo weIsraeri musi iwoyo mumusasa.
Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile.
17 Zvino Omuri, navaIsraeri vose vaaiva navo, vakabva kuGibhetoni vakauya kuzokomba Tiza.
Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.
18 Zimuri paakaona kuti guta rakanga ratorwa, akaenda kunhare yomuzinda wamambo akabva azvipisira mumuzinda. Naizvozvo akafa,
Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ,
19 nokuda kwezvivi zvaakanga aita, achiita zvakaipa pamberi paJehovha uye achifamba munzira dzaJerobhoamu nomuchivi chaakanga aita, uye nechivi chaakanga aita kuti Israeri iite.
nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.
20 Kana zviri zvimwe zvakaitika panguva yokutonga kwaZimuri, nokumukira kwake kwaakaita, hazvina kunyorwa here mubhuku renhoroondo dzegore negore dzamadzimambo aIsraeri?
Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
21 Ipapo vanhu veIsraeri vakaparadzana vakaita zvikwata zviviri; hafu ikatevera Tibhini, mwanakomana waGinati, kuti ave mambo, uye imwe hafu ikatevera Omuri.
Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat.
22 Asi vateveri vaOmuri vakakunda vateveri vaTibhini, mwanakomana waGinati. Saka Tibhini akafa, Omuri akava mambo.
Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel.
23 Mugore ramakumi matatu nerimwe raAsa, mambo weJudha, Omuri akava mambo weIsraeri, uye akatonga kwamakore gumi namaviri, matanhatu acho muTiza.
Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza.
24 Akatenga gomo reSamaria kubva kuna Shemeri namatarenda maviri esirivha uye akavaka guta pagomo iri, achiritumidza kuti Samaria, zvichibva pana Shemeri, zita rouyo aimbova muridzi wegomo.
Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.
25 Asi Omuri akaita zvakaipa pamberi paJehovha, akatadza kupfuura vose vakanga vamutangira.
Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ.
26 Akafamba munzira dzose dzaJerobhoamu mwanakomana waNebhati nomuchivi chake, chaakaita kuti Israeri iite, zvokuti vakaita kuti Jehovha, Mwari waIsraeri, atsamwe nokuda kwezvifananidzo zvavo zvisina maturo.
Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.
27 Kana zviri zvimwe zvakaitika panguva yokutonga kwaOmuri, nezvaakaita, hazvina kunyorwa here mubhuku renhoroondo dzegore negore dzamadzimambo eIsraeri?
Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
28 Omuri akazorora namadzibaba ake akavigwa muSamaria. Uye Ahabhu mwanakomana wake akamutevera paumambo.
Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
29 Mugore ramakumi matatu namasere raAsa, mambo weJudha, Ahabhu, mwanakomana waOmuri, akava mambo weIsraeri, uye akatonga Israeri muSamaria kwamakore makumi maviri namaviri.
Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria.
30 Ahabhu, mwanakomana waOmuri, akaita zvakaipa pamberi paJehovha kupfuura vose vakamutangira.
Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ.
31 Akazviona zviri zvinhu zvidiki kuita zvivi zvaJerobhoamu mwanakomana waNebhati, uye pamusoro pezvo akawana Jezebheri mwanasikana waEtibhaari mambo wavaSidhoni, akatanga kushandira Bhaari uye akamunamata.
Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe.
32 Akavakira Bhaari aritari mutemberi yaBhaari yaakavaka muSamaria.
O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria.
33 Ahabhu akagadzirawo danda raAshera akaita kuti Jehovha, Mwari waIsraeri, atsamwe kupfuura zvakaita madzimambo akamutangira.
Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee.
34 Munguva yaAhabhu, Hieri wokuBheteri akavakazve Jeriko. Mwanakomana wake wedangwe, Abhiramu, akafa paakavaka hwaro hweguta, uye mwanakomana wake wegotwe Segubhi akafa paakamisa masuo aro, sezvazvakarehwa neshoko raJehovha naJoshua mwanakomana waNuni.
Mgbe Ehab na-achị, ka Hiel, onye Betel, wughachiri obodo Jeriko. Ọkpara ya bụ Abiram nwụrụ, mgbe ọ tọrọ ntọala obodo ahụ, ka ọ guzobere ọnụ ụzọ ama ya ọtọ, nwa ya nwoke nke nta aha ya bụ Segub nwụrụ, imezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Joshua nwa Nun.

< 1 Madzimambo 16 >