< Књига Исуса Навина 4 >

1 А кад сав народ пређе преко Јордана, рече Господ Исусу говорећи:
Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
2 Изаберите из народа дванаест људи, по једног човека из сваког племена,
“Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla,
3 И заповедите им и реците: Узмите одавде, из средине Јордана, с места где стоје ногама својим свештеници, дванаест каменова, и однесите их са собом, и ставите их онде где ћете ноћас ноћити.
ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”
4 Тада дозва Исус дванаест људи, које беше одредио између синова Израиљевих, по једног човека из сваког племена.
Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,
5 И рече им Исус: Идите пред ковчег Господа Бога свог усред Јордана, узмите сваки по један камен на раме своје, према броју племена синова Израиљевих,
Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,
6 Да буде знак међу вама. Кад вас после запитају синови ваши говорећи: Шта ће вам то камење?
ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’
7 Реците им: Јер се вода у Јордану раступи пред ковчегом завета Господњег, кад прелажаше преко Јордана, раступи се вода у Јордану, и ово је камење спомен синовима Израиљевим довека.
Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”
8 И учинише синови Израиљеви како заповеди Исус; и узеше дванаест каменова из средине Јордана, како беше рекао Господ Исусу, према броју племена синова Израиљевих; и однеше их са собом на ноћиште, и метнуше их онде.
Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ.
9 А и усред Јордана постави Исус дванаест каменова на месту где стајаху ногама својим свештеници носећи ковчег заветни, и онде осташе до данас.
Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
10 Свештеници пак који ношаху ковчег стајаху усред Јордана докле се не сврши све што беше Господ заповедио Исусу да каже народу, сасвим како беше Мојсије заповедио Исусу. И народ похита и пређе.
Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.
11 А кад пређе сав народ, онда пређе и ковчег Господњи и свештеници, а народ гледаше.
Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
12 Пређоше и синови Рувимови и синови Гадови и половина племена Манасијиног под оружјем пред синовима Израиљевим, као што им беше казао Мојсије.
Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.
13 Око четрдесет хиљада наоружаних пређоше пред Господом преко Јордана на бој у поље јерихонско.
Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ, ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
14 Тај дан узвиси Господ Исуса пред свим Израиљем; и бојаху га се као што су се бојали Мојсија, свега века његовог.
Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
15 И рече Господ Исусу говорећи:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,
16 Заповеди свештеницима који носе ковчег од сведочанства нека изађу из Јордана.
“Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”
17 И заповеди Исус свештеницима говорећи: Изађите из Јордана.
Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”
18 А чим свештеници који ношаху ковчег завета Господњег изађоше из среде Јордана, и стадоше на суво ногом својом, одмах се врати вода у Јордану на место своје, и потече као и пре поврх свих брегова својих.
Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.
19 А изађе народ из Јордана десетог дана првог месеца, и стадоше у логор у Галгалу, с истока Јерихону.
Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko.
20 А оних дванаест каменова, што изнесоше из Јордана, постави Исус у Галгалу,
Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal.
21 И рече синовима Израиљевим говорећи: Кад у будућности запитају синови ваши оце своје говорећи: Шта представља то камење?
Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’
22 Тада обавестите синове своје и реците им: Сувим пређе Израиљ преко овог Јордана.
Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’
23 Јер Господ Бог ваш осуши Јордан пред вама докле пређосте, као што је учинио Господ Бог ваш код Црвеног мора осушивши га пред нама докле пређосмо;
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.
24 Да би познали сви народи на земљи да је рука Господња крепка, да бисте се свагда бојали Господа Бога свог.
O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”

< Књига Исуса Навина 4 >