< Књига пророка Осије 10 >
1 Израиљ је празна лоза винова, оставља род за се; што више рода има, то више умножава олтаре; што му је боља земља, то више кити ликове.
Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
2 Срце им је раздељено, зато су криви; Он ће оборити олтаре њихове, поломиће ликове њихове.
Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
3 Јер сада говоре: Немамо цара; не бојимо се Господа; и шта би нам учинио цар?
Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
4 Говоре речи кунући се лажно кад уговарају веру, и суд као отров расте у браздама на њиви мојој.
Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
5 За јунице вет-авенске уплашиће се становници самаријски; јер ће за њима жалити народ њихов, и свештеници њихови, који им се радоваху, јер ће слава њихова отићи од њих.
Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.
6 И он ће сам бити одведен у Асирску на дар цару браничу; Јефрема ће попасти стид, и Израиљ ће се осрамотити намером својом.
Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
7 Цара ће самаријског нестати као пене поврх воде.
A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
8 И обориће се висине авенске, грех Израиљев; трње ће и чкаљ расти по олтарима њиховим, и говориће горама: Покријте нас, и хумовима: Падните на нас.
a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven, ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”
9 Од времена гавајског грешио си, Израиљу; онде осташе, не стиже их у Гаваји рат на безаконике.
“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
10 По својој ћу их вољи покарати, и народи ће се скупити на њих да их заробе за двојако безакоње њихово.
Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
11 Јефрем је јуница научена, која радо врше; али ћу јој доћи на лепи врат; упрегнућу Јефрема, Јуда ће орати, Јаков ће повлачити.
Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
12 Сејте правду, жећете милост; орите крчевину, јер је време да тражите Господа, да би дошао и подаждио вам правдом.
Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
13 Орасте безбожност, жесте безакоње, једосте плод од лажи; јер си се поуздао у свој пут, у мноштво својих јунака.
Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
14 Зато ће се подигнути врева међу твојим народом, и сви ће се градови твоји раскопати као што Салман раскопа Вет-Арвел кад беше рат, мајка би размрскана са синовима.
Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu, ebe unu niile e wusiri ike ga-ada. Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha, mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
15 Тако ће вам учинити Ветиљ за велику злоћу вашу; зором ће погинути цар Израиљев.
Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel, nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu. Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.