< Галатима 3 >
1 О неразумни Галати! Ко вас је опчинио да се не покоравате истини? Ви, којима пред очима беше написан Исус Христос, а сад се међу вама разапе.
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst.
2 Ово једно хоћу од вас да дознам, или Духа примисте кроз дела закона или кроз чувење вере?
Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?
3 Тако ли сте неразумни? Почевши Духом, сад телом свршујете?
Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ?
4 Тако ли узалуд пострадасте? Кад би било само узалуд!
Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu?
5 Који вам дакле даје Духа и чини чудеса међу вама, чини ли делима закона или чувењем вере?
Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?
6 Као што Авраам верова Богу, и прими му се у правду.
Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.
7 Познајте дакле да су они синови Авраамови који су од вере.
Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham.
8 А писмо видевши унапред да Бог вером незнабошце правда, напред објави Аврааму: У теби ће се благословити сви незнабошци.
Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
9 Тако који су од вере, благословиће се с верним Авраамом.
Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.
10 Јер који су год од дела закона под клетвом су, јер је писано: Проклет сваки који не остане у свему што је написано у књизи законској да чини.
Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.”
11 А да се законом нико не оправдава пред Богом, познато је: јер праведник од вере живеће.
Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
12 А закон није од вере; него човек који то твори живеће у томе.
Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”
13 Христос је нас искупио од клетве законске поставши за нас клетва, јер је писано: Проклет сваки који виси на дрвету:
Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.”
14 Да међу незнабошцима буде благослов Аврамов у Христу Исусу, да обећање Духа примимо кроз веру.
Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.
15 Браћо, по човеку говорим, нико човечији потврђен завет не одбацује нити му шта домеће.
Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a.
16 А Аврааму и семену његовом речена бише обећања. А не вели: и семенима, као за многа, него као за једно: и семену твом, које је Христос.
Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.
17 Ово пак велим: завет, који је од Бога потврђен за Христа, не одбацује закон, који је постао после четири стотине и тридесет година, да укине обећање.
Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga.
18 Јер ако је наследство од закона, онда већ није од обећања, а Аврааму обећањем дарова Бог.
Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.
19 Шта ће дакле закон? Ради греха додаде се докле дође семе које му се обећа, и поставили су га анђели руком посредника.
Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire.
20 Али посредник није једног; а Бог је један.
Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu.
21 Еда ли је дакле закон противан обећањима Божјим? Боже сачувај! Јер да је дан закон који може оживети, заиста би од закона била правда.
Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.
22 Али писмо затвори све под грех, да се обећање даде кроз веру Исуса Христа онима који верују.
Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
23 А пре доласка вере бисмо под законом чувани и затворени за веру која се хтела показати.
Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè.
24 Тако нам закон би чувар до Христа, да се вером оправдамо.
Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe.
25 А кад дође вера, већ нисмо под чуваром.
Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.
26 Јер сте ви сви синови Божји вером Христа Исуса;
Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.
27 Јер који се год у Христа крстисте, у Христа се обукосте.
Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
28 Нема ту Јеврејина ни Грка, нема роба ни господара, нема мушког рода ни женског; јер сте ви сви једно у Христу Исусу.
E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.
29 А кад сте ви Христови, онда сте семе Авраамово, и по обећању наследници.
Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.