< 2 Samuelova 9 >

1 I reèe David: ima li jošte ko da je ostao od doma Saulova? da mu uèinim milost radi Jonatana.
Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
2 A bijaše jedan sluga doma Saulova, po imenu Siva; i dozvaše ga k Davidu. I reèe mu car: jesi li ti Siva? A on reèe: ja sam, sluga tvoj.
Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
3 A car reèe: ima li jošte ko od doma Saulova da mu uèinim milost Božiju? A Siva reèe caru: još ima sin Jonatanov, hrom na nogu.
Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
4 I reèe mu car: gdje je? A Siva reèe caru: eno ga u domu Mahira sina Amilova u Lodevaru.
Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
5 Tada posla car David da ga dovedu iz Lodevara iz doma Mahira sina Amilova.
Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
6 A kad doðe k Davidu Mefivostej sin Jonatana sina Saulova, pade na lice svoje i pokloni se. A David reèe: Mefivosteju! A on reèe: evo sluge tvojega.
Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
7 A David mu reèe: ne boj se; jer æu ti uèiniti milost Jonatana radi oca tvojega, daæu ti natrag sve njive Saula oca tvojega; a ti æeš svagda jesti za mojim stolom.
Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
8 A on se pokloni i reèe: ko sam ja sluga tvoj, te si pogledao na mrtva psa kao što sam ja?
Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
9 I car dozva Sivu slugu Saulova, i reèe mu: što je god bilo Saulovo i svega doma njegova, dao sam sinu tvojega gospodara.
Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
10 Radi mu dakle zemlju ti i sinovi tvoji i sluge tvoje, i donosi da sin gospodara tvojega ima hljeba da jede; ali Mefivostej sin gospodara tvojega ješæe svagda za mojim stolom. Siva pak imaše petnaest sinova i dvadeset sluga.
Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
11 I reèe Siva caru: kako je car gospodar moj zapovjedio sluzi svojemu, sve æe èiniti sluga tvoj. Ali Mefivostej, reèe car, ješæe za mojim stolom kao carski sin.
Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
12 A Mefivostej imaše maloga sina, kojemu ime bješe Miha; a svi koji življahu u domu Sivinu bijahu sluge Mefivostejeve.
Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
13 A Mefivostej sjeðaše u Jerusalimu, jer svagda jeðaše za carevijem stolom, a bješe hrom na obje noge.
Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.

< 2 Samuelova 9 >