< မထိး 16 >

1 တဒါနီံ ဖိရူၑိနး သိဒူကိနၑ္စာဂတျ တံ ပရီက္ၐိတုံ နဘမီယံ ကိဉ္စန လက္ၐ္မ ဒရ္ၑယိတုံ တသ္မဲ နိဝေဒယာမာသုး၊
Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.”
2 တတး သ ဥက္တဝါန်, သန္ဓျာယာံ နဘသော ရက္တတွာဒ် ယူယံ ဝဒထ, ၑွော နိရ္မ္မလံ ဒိနံ ဘဝိၐျတိ;
Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’
3 ပြာတးကာလေ စ နဘသော ရက္တတွာတ် မလိနတွာဉ္စ ဝဒထ, ဈဉ္ဘ္ၑဒျ ဘဝိၐျတိ၊ ဟေ ကပဋိနော ယဒိ ယူယမ် အန္တရီက္ၐသျ လက္ၐ္မ ဗောဒ္ဓုံ ၑက္နုထ, တရှိ ကာလသျဲတသျ လက္ၐ္မ ကထံ ဗောဒ္ဓုံ န ၑက္နုထ?
Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
4 ဧတတ္ကာလသျ ဒုၐ္ဋော ဝျဘိစာရီ စ ဝံၑော လက္ၐ္မ ဂဝေၐယတိ, ကိန္တု ယူနသော ဘဝိၐျဒွါဒိနော လက္ၐ္မ ဝိနာနျတ် ကိမပိ လက္ၐ္မ တာန် န ဒရ္ၑယိယျတေ၊ တဒါနီံ သ တာန် ဝိဟာယ ပြတသ္ထေ၊
Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ.
5 အနန္တရမနျပါရဂမနကာလေ တသျ ၑိၐျား ပူပမာနေတုံ ဝိသ္မၖတဝန္တး၊
Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla.
6 ယီၑုသ္တာနဝါဒီတ်, ယူယံ ဖိရူၑိနာံ သိဒူကိနာဉ္စ ကိဏွံ ပြတိ သာဝဓာနား သတရ္ကာၑ္စ ဘဝတ၊
Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”
7 တေန တေ ပရသ္ပရံ ဝိဝိစျ ကထယိတုမာရေဘိရေ, ဝယံ ပူပါနာနေတုံ ဝိသ္မၖတဝန္တ ဧတတ္ကာရဏာဒ် ဣတိ ကထယတိ၊
Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
8 ကိန္တု ယီၑုသ္တဒွိဇ္ဉာယ တာနဝေါစတ်, ဟေ သ္တောကဝိၑွာသိနော ယူယံ ပူပါနာနယနမဓိ ကုတး ပရသ္ပရမေတဒ် ဝိဝိံကျ?
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha?
9 ယုၐ္မာဘိး ကိမဒျာပိ န ဇ္ဉာယတေ? ပဉ္စဘိး ပူပဲး ပဉ္စသဟသြပုရုၐေၐု ဘောဇိတေၐု ဘက္ၐျောစ္ဆိၐ္ဋပူရ္ဏာန် ကတိ ဍလကာန် သမဂၖဟ္လီတံ;
Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru?
10 တထာ သပ္တဘိး ပူပဲၑ္စတုးသဟသြပုရုၐေၐု ဘေဇိတေၐု ကတိ ဍလကာန် သမဂၖဟ္လီတ, တတ် ကိံ ယုၐ္မာဘိရ္န သ္မရျျတေ?
Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
11 တသ္မာတ် ဖိရူၑိနာံ သိဒူကိနာဉ္စ ကိဏွံ ပြတိ သာဝဓာနာသ္တိၐ္ဌတ, ကထာမိမာမ် အဟံ ပူပါနဓိ နာကထယံ, ဧတဒ် ယူယံ ကုတော န ဗုဓျဓွေ?
Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
12 တဒါနီံ ပူပကိဏွံ ပြတိ သာဝဓာနာသ္တိၐ္ဌတေတိ နောက္တွာ ဖိရူၑိနာံ သိဒူကိနာဉ္စ ဥပဒေၑံ ပြတိ သာဝဓာနာသ္တိၐ္ဌတေတိ ကထိတဝါန်, ဣတိ တဲရဗောဓိ၊
Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
13 အပရဉ္စ ယီၑုး ကဲသရိယာ-ဖိလိပိပြဒေၑမာဂတျ ၑိၐျာန် အပၖစ္ဆတ်, ယော'ဟံ မနုဇသုတး သော'ဟံ ကး? လောကဲရဟံ ကိမုစျေ?
Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”
14 တဒါနီံ တေ ကထိတဝန္တး, ကေစိဒ် ဝဒန္တိ တွံ မဇ္ဇယိတာ ယောဟန်, ကေစိဒွဒန္တိ, တွမ် ဧလိယး, ကေစိစ္စ ဝဒန္တိ, တွံ ယိရိမိယော ဝါ ကၑ္စိဒ် ဘဝိၐျဒွါဒီတိ၊
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
15 ပၑ္စာတ် သ တာန် ပပြစ္ဆ, ယူယံ မာံ ကံ ဝဒထ? တတး ၑိမောန် ပိတရ ဥဝါစ,
Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
16 တွမမရေၑွရသျာဘိၐိက္တပုတြး၊
Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
17 တတော ယီၑုး ကထိတဝါန်, ဟေ ယူနသး ပုတြ ၑိမောန် တွံ ဓနျး; ယတး ကောပိ အနုဇသ္တွယျေတဇ္ဇ္ဉာနံ နောဒပါဒယတ်, ကိန္တု မမ သွရ္ဂသျး ပိတောဒပါဒယတ်၊
Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
18 အတော'ဟံ တွာံ ဝဒါမိ, တွံ ပိတရး (ပြသ္တရး) အဟဉ္စ တသျ ပြသ္တရသျောပရိ သွမဏ္ဍလီံ နိရ္မ္မာသျာမိ, တေန နိရယော ဗလာတ် တာံ ပရာဇေတုံ န ၑက္ၐျတိ၊ (Hadēs g86)
Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. (Hadēs g86)
19 အဟံ တုဘျံ သွရ္ဂီယရာဇျသျ ကုဉ္ဇိကာံ ဒါသျာမိ, တေန ယတ် ကိဉ္စန တွံ ပၖထိဝျာံ ဘံတ္သျသိ တတ္သွရ္ဂေ ဘံတ္သျတေ, ယစ္စ ကိဉ္စန မဟျာံ မောက္ၐျသိ တတ် သွရ္ဂေ မောက္ၐျတေ၊
Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
20 ပၑ္စာတ် သ ၑိၐျာနာဒိၑတ်, အဟမဘိၐိက္တော ယီၑုရိတိ ကထာံ ကသ္မဲစိဒပိ ယူယံ မာ ကထယတ၊
Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
21 အနျဉ္စ ယိရူၑာလမ္နဂရံ ဂတွာ ပြာစီနလောကေဘျး ပြဓာနယာဇကေဘျ ဥပါဓျာယေဘျၑ္စ ဗဟုဒုးခဘောဂသ္တဲ ရှတတွံ တၖတီယဒိနေ ပုနရုတ္ထာနဉ္စ မမာဝၑျကမ် ဧတား ကထာ ယီၑုသ္တတ္ကာလမာရဘျ ၑိၐျာန် ဇ္ဉာပယိတုမ် အာရဗ္ဓဝါန်၊
Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.
22 တဒါနီံ ပိတရသ္တသျ ကရံ ဃၖတွာ တရ္ဇယိတွာ ကထယိတုမာရဗ္ဓဝါန်, ဟေ ပြဘော, တတ် တွတ္တော ဒူရံ ယာတု, တွာံ ပြတိ ကဒါပိ န ဃဋိၐျတေ၊
Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
23 ကိန္တု သ ဝဒနံ ပရာဝရ္တျ ပိတရံ ဇဂါဒ, ဟေ ဝိဃ္နကာရိန်, မတ္သမ္မုခါဒ် ဒူရီဘဝ, တွံ မာံ ဗာဓသေ, ဤၑွရီယကာရျျာတ် မာနုၐီယကာရျျံ တုဘျံ ရောစတေ၊
Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
24 အနန္တရံ ယီၑုး သွီယၑိၐျာန် ဥက္တဝါန် ယး ကၑ္စိတ် မမ ပၑ္စာဒ္ဂါမီ ဘဝိတုမ် ဣစ္ဆတိ, သ သွံ ဒါမျတု, တထာ သွကြုၑံ ဂၖဟ္လန် မတ္ပၑ္စာဒါယာတု၊
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.
25 ယတော ယး ပြာဏာန် ရက္ၐိတုမိစ္ဆတိ, သ တာန် ဟာရယိၐျတိ, ကိန္တု ယော မဒရ္ထံ နိဇပြာဏာန် ဟာရယတိ, သ တာန် ပြာပ္သျတိ၊
Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya.
26 မာနုၐော ယဒိ သရွွံ ဇဂတ် လဘတေ နိဇပြဏာန် ဟာရယတိ, တရှိ တသျ ကော လာဘး? မနုဇော နိဇပြာဏာနာံ ဝိနိမယေန ဝါ ကိံ ဒါတုံ ၑက္နောတိ?
Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?
27 မနုဇသုတး သွဒူတဲး သာကံ ပိတုး ပြဘာဝေဏာဂမိၐျတိ; တဒါ ပြတိမနုဇံ သွသွကရ္မ္မာနုသာရာတ် ဖလံ ဒါသျတိ၊
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
28 အဟံ ယုၐ္မာန် တထျံ ဝစ္မိ, သရာဇျံ မနုဇသုတမ် အာဂတံ န ပၑျန္တော မၖတျုံ န သွာဒိၐျန္တိ, ဧတာဒၖၑား ကတိပယဇနာ အတြာပိ ဒဏ္ဍာယမာနား သန္တိ၊
“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”

< မထိး 16 >