< ယောဟနး 9 >

1 တတး ပရံ ယီၑုရ္ဂစ္ဆန် မာရ္ဂမဓျေ ဇန္မာန္ဓံ နရမ် အပၑျတ်၊
Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
2 တတး ၑိၐျာသ္တမ် အပၖစ္ဆန် ဟေ ဂုရော နရောယံ သွပါပေန ဝါ သွပိတြား ပါပေနာန္ဓော'ဇာယတ?
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
3 တတး သ ပြတျုဒိတဝါန် ဧတသျ ဝါသျ ပိတြေား ပါပါဒ် ဧတာဒၖၑောဘူဒ ဣတိ နဟိ ကိန္တွနေန ယထေၑွရသျ ကရ္မ္မ ပြကာၑျတေ တဒ္ဓေတောရေဝ၊
Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
4 ဒိနေ တိၐ္ဌတိ မတ္ပြေရယိတုး ကရ္မ္မ မယာ ကရ္တ္တဝျံ ယဒါ ကိမပိ ကရ္မ္မ န ကြိယတေ တာဒၖၑီ နိၑာဂစ္ဆတိ၊
Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
5 အဟံ ယာဝတ္ကာလံ ဇဂတိ တိၐ္ဌာမိ တာဝတ္ကာလံ ဇဂတော ဇျောတိးသွရူပေါသ္မိ၊
Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
6 ဣတျုက္တ္တာ ဘူမော် နိၐ္ဌီဝံ နိက္ၐိပျ တေန ပင်္ကံ ကၖတဝါန္
Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
7 ပၑ္စာတ် တတ္ပင်္ကေန တသျာန္ဓသျ နေတြေ ပြလိပျ တမိတျာဒိၑတ် ဂတွာ ၑိလောဟေ 'ရ္ထာတ် ပြေရိတနာမ္နိ သရသိ သ္နာဟိ၊ တတောန္ဓော ဂတွာ တတြာသ္နာတ် တတး ပြန္နစက္ၐု ရ္ဘူတွာ ဝျာဃုဋျာဂါတ်၊
Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
8 အပရဉ္စ သမီပဝါသိနော လောကာ ယေ စ တံ ပူရွွမန္ဓမ် အပၑျန် တေ ဗက္တ္တုမ် အာရဘန္တ ယောန္ဓလောကော ဝရ္တ္မနျုပဝိၑျာဘိက္ၐတ သ ဧဝါယံ ဇနး ကိံ န ဘဝတိ?
Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
9 ကေစိဒဝဒန် သ ဧဝ ကေစိဒဝေါစန် တာဒၖၑော ဘဝတိ ကိန္တု သ သွယမဗြဝီတ် သ ဧဝါဟံ ဘဝါမိ၊
Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
10 အတဧဝ တေ 'ပၖစ္ဆန် တွံ ကထံ ဒၖၐ္ဋိံ ပါပ္တဝါန်?
Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
11 တတး သောဝဒဒ် ယီၑနာမက ဧကော ဇနော မမ နယနေ ပင်္ကေန ပြလိပျ ဣတျာဇ္ဉာပယတ် ၑိလောဟကာသာရံ ဂတွာ တတြ သ္နာဟိ၊ တတသ္တတြ ဂတွာ မယိ သ္နာတေ ဒၖၐ္ဋိမဟံ လဗ္ဓဝါန်၊
Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
12 တဒါ တေ 'ဝဒန် သ ပုမာန် ကုတြ? တေနောက္တ္တံ နာဟံ ဇာနာမိ၊
Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
13 အပရံ တသ္မိန် ပူရွွာန္ဓေ ဇနေ ဖိရူၑိနာံ နိကဋမ် အာနီတေ သတိ ဖိရူၑိနောပိ တမပၖစ္ဆန် ကထံ ဒၖၐ္ဋိံ ပြာပ္တောသိ?
Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
14 တတး သ ကထိတဝါန် သ ပင်္ကေန မမ နေတြေ 'လိမ္ပတ် ပၑ္စာဒ် သ္နာတွာ ဒၖၐ္ဋိမလဘေ၊
Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
15 ကိန္တု ယီၑု ရွိၑြာမဝါရေ ကရ္ဒ္ဒမံ ကၖတွာ တသျ နယနေ ပြသန္နေ'ကရောဒ် ဣတိကာရဏာတ် ကတိပယဖိရူၑိနော'ဝဒန္
Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
16 သ ပုမာန် ဤၑွရာန္န ယတး သ ဝိၑြာမဝါရံ န မနျတေ၊ တတောနျေ ကေစိတ် ပြတျဝဒန် ပါပီ ပုမာန် ကိမ် ဧတာဒၖၑမ် အာၑ္စရျျံ ကရ္မ္မ ကရ္တ္တုံ ၑက္နောတိ?
Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
17 ဣတ္ထံ တေၐာံ ပရသ္ပရံ ဘိန္နဝါကျတွမ် အဘဝတ်၊ ပၑ္စာတ် တေ ပုနရပိ တံ ပူရွွာန္ဓံ မာနုၐမ် အပြာက္ၐုး ယော ဇနသ္တဝ စက္ၐုၐီ ပြသန္နေ ကၖတဝါန် တသ္မိန် တွံ ကိံ ဝဒသိ? သ ဥက္တ္တဝါန် သ ဘဝိၑဒွါဒီ၊
Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
18 သ ဒၖၐ္ဋိမ် အာပ္တဝါန် ဣတိ ယိဟူဒီယာသ္တသျ ဒၖၐ္ဋိံ ပြာပ္တသျ ဇနသျ ပိတြော ရ္မုခါဒ် အၑြုတွာ န ပြတျယန်၊
Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
19 အတဧဝ တေ တာဝပၖစ္ဆန် ယုဝယော ရျံ ပုတြံ ဇန္မာန္ဓံ ဝဒထး သ ကိမယံ? တရှီဒါနီံ ကထံ ဒြၐ္ဋုံ ၑက္နောတိ?
Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
20 တတသ္တသျ ပိတရော် ပြတျဝေါစတာမ် အယမ် အာဝယေား ပုတြ အာ ဇနေရန္ဓၑ္စ တဒပျာဝါံ ဇာနီဝး
Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
21 ကိန္တွဓုနာ ကထံ ဒၖၐ္ဋိံ ပြာပ္တဝါန် တဒါဝါံ န် ဇာနီဝး ကောသျ စက္ၐုၐီ ပြသန္နေ ကၖတဝါန် တဒပိ န ဇာနီဝ ဧၐ ဝယးပြာပ္တ ဧနံ ပၖစ္ဆတ သွကထာံ သွယံ ဝက္ၐျတိ၊
Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
22 ယိဟူဒီယာနာံ ဘယာတ် တသျ ပိတရော် ဝါကျမိဒမ် အဝဒတာံ ယတး ကောပိ မနုၐျော ယဒိ ယီၑုမ် အဘိၐိက္တံ ဝဒတိ တရှိ သ ဘဇနဂၖဟာဒ် ဒူရီကာရိၐျတေ ယိဟူဒီယာ ဣတိ မန္တြဏာမ် အကုရွွန္
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
23 အတသ္တသျ ပိတရော် ဝျာဟရတာမ် ဧၐ ဝယးပြာပ္တ ဧနံ ပၖစ္ဆတ၊
Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
24 တဒါ တေ ပုနၑ္စ တံ ပူရွွာန္ဓမ် အာဟူယ ဝျာဟရန် ဤၑွရသျ ဂုဏာန် ဝဒ ဧၐ မနုၐျး ပါပီတိ ဝယံ ဇာနီမး၊
Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
25 တဒါ သ ဥက္တ္တဝါန် သ ပါပီ န ဝေတိ နာဟံ ဇာနေ ပူရွာမန္ဓ အာသမဟမ် အဓုနာ ပၑျာမီတိ မာတြံ ဇာနာမိ၊
Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
26 တေ ပုနရပၖစ္ဆန် သ တွာံ ပြတိ ကိမကရောတ်? ကထံ နေတြေ ပြသန္နေ 'ကရောတ်?
Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
27 တတး သောဝါဒီဒ် ဧကကၖတွောကထယံ ယူယံ န ၑၖဏုထ တရှိ ကုတး ပုနး ၑြောတုမ် ဣစ္ဆထ? ယူယမပိ ကိံ တသျ ၑိၐျာ ဘဝိတုမ် ဣစ္ဆထ?
Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
28 တဒါ တေ တံ တိရသ္ကၖတျ ဝျာဟရန် တွံ တသျ ၑိၐျော ဝယံ မူသား ၑိၐျား၊
Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
29 မူသာဝက္တြေဏေၑွရော ဇဂါဒ တဇ္ဇာနီမး ကိန္တွေၐ ကုတြတျလောက ဣတိ န ဇာနီမး၊
Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
30 သောဝဒဒ် ဧၐ မမ လောစနေ ပြသန္နေ 'ကရောတ် တထာပိ ကုတြတျလောက ဣတိ ယူယံ န ဇာနီထ ဧတဒ် အာၑ္စရျျံ ဘဝတိ၊
Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
31 ဤၑွရး ပါပိနာံ ကထာံ န ၑၖဏောတိ ကိန္တု ယော ဇနသ္တသ္မိန် ဘက္တိံ ကၖတွာ တဒိၐ္ဋကြိယာံ ကရောတိ တသျဲဝ ကထာံ ၑၖဏောတိ ဧတဒ် ဝယံ ဇာနီမး၊
Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
32 ကောပိ မနုၐျော ဇန္မာန္ဓာယ စက္ၐုၐီ အဒဒါတ် ဇဂဒါရမ္ဘာဒ် ဧတာဒၖၑီံ ကထာံ ကောပိ ကဒါပိ နာၑၖဏောတ်၊ (aiōn g165)
Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. (aiōn g165)
33 အသ္မာဒ် ဧၐ မနုၐျော ယဒီၑွရာန္နာဇာယတ တရှိ ကိဉ္စိဒပီဒၖၑံ ကရ္မ္မ ကရ္တ္တုံ နာၑက္နောတ်၊
Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
34 တေ ဝျာဟရန် တွံ ပါပါဒ် အဇာယထား ကိမသ္မာန် တွံ ၑိက္ၐယသိ? ပၑ္စာတ္တေ တံ ဗဟိရကုရွွန်၊
Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
35 တဒနန္တရံ ယိဟူဒီယဲး သ ဗဟိရကြိယတ ယီၑုရိတိ ဝါရ္တ္တာံ ၑြုတွာ တံ သာက္ၐာတ် ပြာပျ ပၖၐ္ဋဝါန် ဤၑွရသျ ပုတြေ တွံ ဝိၑွသိၐိ?
Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”
36 တဒါ သ ပြတျဝေါစတ် ဟေ ပြဘော သ ကော ယတ် တသ္မိန္နဟံ ဝိၑွသိမိ?
Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”
37 တတော ယီၑုး ကထိတဝါန် တွံ တံ ဒၖၐ္ဋဝါန် တွယာ သာကံ ယး ကထံ ကထယတိ သဧဝ သး၊
Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”
38 တဒါ ဟေ ပြဘော ဝိၑွသိမီတျုက္တွာ သ တံ ပြဏာမတ်၊
Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
39 ပၑ္စာဒ် ယီၑုး ကထိတဝါန် နယနဟီနာ နယနာနိ ပြာပ္နုဝန္တိ နယနဝန္တၑ္စာန္ဓာ ဘဝန္တီတျဘိပြာယေဏ ဇဂဒါဟမ် အာဂစ္ဆမ်၊
Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
40 ဧတတ် ၑြုတွာ နိကဋသ္ထား ကတိပယား ဖိရူၑိနော ဝျာဟရန် ဝယမပိ ကိမန္ဓား?
Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”
41 တဒါ ယီၑုရဝါဒီဒ် ယဒျန္ဓာ အဘဝတ တရှိ ပါပါနိ နာတိၐ္ဌန် ကိန္တု ပၑျာမီတိ ဝါကျဝဒနာဒ် ယုၐ္မာကံ ပါပါနိ တိၐ္ဌန္တိ၊
Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”

< ယောဟနး 9 >