< ယောဟနး 6 >

1 တတး ပရံ ယီၑု ရ္ဂာလီလ် ပြဒေၑီယသျ တိဝိရိယာနာမ္နး သိန္ဓေား ပါရံ ဂတဝါန်၊
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
2 တတော ဝျာဓိမလ္လောကသွာသ္ထျကရဏရူပါဏိ တသျာၑ္စရျျာဏိ ကရ္မ္မာဏိ ဒၖၐ္ဋွာ ဗဟဝေါ ဇနာသ္တတ္ပၑ္စာဒ် အဂစ္ဆန်၊
Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
3 တတော ယီၑုး ပရွွတမာရုဟျ တတြ ၑိၐျဲး သာကမ်၊
Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
4 တသ္မိန် သမယ နိသ္တာရောတ္သဝနာမ္နိ ယိဟူဒီယာနာမ ဥတ္သဝ ဥပသ္ထိတေ
Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
5 ယီၑု ရ္နေတြေ ဥတ္တောလျ ဗဟုလောကာန် သွသမီပါဂတာန် ဝိလောကျ ဖိလိပံ ပၖၐ္ဋဝါန် ဧတေၐာံ ဘောဇနာယ ဘောဇဒြဝျာဏိ ဝယံ ကုတြ ကြေတုံ ၑကြုမး?
Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
6 ဝါကျမိဒံ တသျ ပရီက္ၐာရ္ထမ် အဝါဒီတ် ကိန္တု ယတ် ကရိၐျတိ တတ် သွယမ် အဇာနာတ်၊
Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
7 ဖိလိပး ပြတျဝေါစတ် ဧတေၐာမ် ဧကဲကော ယဒျလ္ပမ် အလ္ပံ ပြာပ္နောတိ တရှိ မုဒြာပါဒဒွိၑတေန ကြီတပူပါ အပိ နျူနာ ဘဝိၐျန္တိ၊
Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
8 ၑိမောန် ပိတရသျ ဘြာတာ အာန္ဒြိယာချး ၑိၐျာဏာမေကော ဝျာဟၖတဝါန္
Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
9 အတြ ကသျစိဒ် ဗာလကသျ သမီပေ ပဉ္စ ယာဝပူပါး က္ၐုဒြမတ္သျဒွယဉ္စ သန္တိ ကိန္တု လောကာနာံ ဧတာဝါတာံ မဓျေ တဲး ကိံ ဘဝိၐျတိ?
“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
10 ပၑ္စာဒ် ယီၑုရဝဒတ် လောကာနုပဝေၑယတ တတြ ဗဟုယဝသသတ္တွာတ် ပဉ္စသဟသ္တြေဘျော နျူနာ အဓိကာ ဝါ ပုရုၐာ ဘူမျာမ် ဥပါဝိၑန်၊
Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
11 တတော ယီၑုသ္တာန် ပူပါနာဒါယ ဤၑွရသျ ဂုဏာန် ကီရ္တ္တယိတွာ ၑိၐျေၐု သမာရ္ပယတ် တတသ္တေ တေဘျ ဥပဝိၐ္ဋလောကေဘျး ပူပါန် ယထေၐ္ဋမတ္သျဉ္စ ပြာဒုး၊
Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
12 တေၐု တၖပ္တေၐု သ တာနဝေါစဒ် ဧတေၐာံ ကိဉ္စိဒပိ ယထာ နာပစီယတေ တထာ သရွွာဏျဝၑိၐ္ဋာနိ သံဂၖဟ္လီတ၊
Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
13 တတး သရွွေၐာံ ဘောဇနာတ် ပရံ တေ တေၐာံ ပဉ္စာနာံ ယာဝပူပါနာံ အဝၑိၐ္ဋာနျခိလာနိ သံဂၖဟျ ဒွါဒၑဍလ္လကာန် အပူရယန်၊
Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
14 အပရံ ယီၑောရေတာဒၖၑီမ် အာၑ္စရျျကြိယာံ ဒၖၐ္ဋွာ လောကာ မိထော ဝက္တုမာရေဘိရေ ဇဂတိ ယသျာဂမနံ ဘဝိၐျတိ သ ဧဝါယမ် အဝၑျံ ဘဝိၐျဒွက္တ္တာ၊
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
15 အတဧဝ လောကာ အာဂတျ တမာကြမျ ရာဇာနံ ကရိၐျန္တိ ယီၑုသ္တေၐာမ် ဤဒၖၑံ မာနသံ ဝိဇ္ဉာယ ပုနၑ္စ ပရွွတမ် ဧကာကီ ဂတဝါန်၊
Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
16 သာယံကာလ ဥပသ္ထိတေ ၑိၐျာ ဇလဓိတဋံ ဝြဇိတွာ နာဝမာရုဟျ နဂရဒိၑိ သိန္ဓော် ဝါဟယိတွာဂမန်၊
Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
17 တသ္မိန် သမယေ တိမိရ ဥပါတိၐ္ဌတ် ကိန္တု ယီၐုသ္တေၐာံ သမီပံ နာဂစ္ဆတ်၊
ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
18 တဒါ ပြဗလပဝနဝဟနာတ် သာဂရေ မဟာတရင်္ဂေါ ဘဝိတုမ် အာရေဘေ၊
Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
19 တတသ္တေ ဝါဟယိတွာ ဒွိတြာန် ကြောၑာန် ဂတား ပၑ္စာဒ် ယီၑုံ ဇလဓေရုပရိ ပဒ္ဘျာံ ဝြဇန္တံ နော်ကာန္တိကမ် အာဂစ္ဆန္တံ ဝိလောကျ တြာသယုက္တာ အဘဝန္
Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
20 ကိန္တု သ တာနုက္တ္တဝါန် အယမဟံ မာ ဘဲၐ္ဋ၊
Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
21 တဒါ တေ တံ သွဲရံ နာဝိ ဂၖဟီတဝန္တး တဒါ တတ္က္ၐဏာဒ် ဥဒ္ဒိၐ္ဋသ္ထာနေ နော်ရုပါသ္ထာတ်၊
Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
22 ယယာ နာဝါ ၑိၐျာ အဂစ္ဆန် တဒနျာ ကာပိ နော်ကာ တသ္မိန် သ္ထာနေ နာသီတ် တတော ယီၑုး ၑိၐျဲး သာကံ နာဂမတ် ကေဝလား ၑိၐျာ အဂမန် ဧတတ် ပါရသ္ထာ လောကာ ဇ္ဉာတဝန္တး၊
Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
23 ကိန္တု တတး ပရံ ပြဘု ရျတြ ဤၑွရသျ ဂုဏာန် အနုကီရ္တ္တျ လောကာန် ပူပါန် အဘောဇယတ် တတ္သ္ထာနသျ သမီပသ္ထတိဝိရိယာယာ အပရာသ္တရဏယ အာဂမန်၊
Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
24 ယီၑုသ္တတြ နာသ္တိ ၑိၐျာ အပိ တတြ နာ သန္တိ လောကာ ဣတိ ဝိဇ္ဉာယ ယီၑုံ ဂဝေၐယိတုံ တရဏိဘိး ကဖရ္နာဟူမ် ပုရံ ဂတား၊
Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
25 တတသ္တေ သရိတ္ပတေး ပါရေ တံ သာက္ၐာတ် ပြာပျ ပြာဝေါစန် ဟေ ဂုရော ဘဝါန် အတြ သ္ထာနေ ကဒါဂမတ်?
Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
26 တဒါ ယီၑုသ္တာန် ပြတျဝါဒီဒ် ယုၐ္မာနဟံ ယထာရ္ထတရံ ဝဒါမိ အာၑ္စရျျကရ္မ္မဒရ္ၑနာဒ္ဓေတော ရ္န ကိန္တု ပူပဘောဇနာတ် တေန တၖပ္တတွာဉ္စ မာံ ဂဝေၐယထ၊
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
27 က္ၐယဏီယဘက္ၐျာရ္ထံ မာ ၑြာမိၐ္ဋ ကိန္တွန္တာယုရ္ဘက္ၐျာရ္ထံ ၑြာမျတ, တသ္မာတ် တာဒၖၑံ ဘက္ၐျံ မနုဇပုတြော ယုၐ္မာဘျံ ဒါသျတိ; တသ္မိန် တာတ ဤၑွရး ပြမာဏံ ပြာဒါတ်၊ (aiōnios g166)
Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” (aiōnios g166)
28 တဒါ တေ'ပၖစ္ဆန် ဤၑွရာဘိမတံ ကရ္မ္မ ကရ္တ္တုမ် အသ္မာဘိး ကိံ ကရ္တ္တဝျံ?
Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
29 တတော ယီၑုရဝဒဒ် ဤၑွရော ယံ ပြဲရယတ် တသ္မိန် ဝိၑွသနမ် ဤၑွရာဘိမတံ ကရ္မ္မ၊
Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
30 တဒါ တေ ဝျာဟရန် ဘဝတာ ကိံ လက္ၐဏံ ဒရ္ၑိတံ ယဒ္ဒၖၐ္ဋွာ ဘဝတိ ဝိၑွသိၐျာမး? တွယာ ကိံ ကရ္မ္မ ကၖတံ?
Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
31 အသ္မာကံ ပူရွွပုရုၐာ မဟာပြာန္တရေ မာန္နာံ ဘောက္တ္တုံ ပြာပုး ယထာ လိပိရာသ္တေ၊ သွရ္ဂီယာဏိ တု ဘက္ၐျာဏိ ပြဒဒေါ် ပရမေၑွရး၊
Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”
32 တဒါ ယီၑုရဝဒဒ် အဟံ ယုၐ္မာနတိယထာရ္ထံ ဝဒါမိ မူသာ ယုၐ္မာဘျံ သွရ္ဂီယံ ဘက္ၐျံ နာဒါတ် ကိန္တု မမ ပိတာ ယုၐ္မာဘျံ သွရ္ဂီယံ ပရမံ ဘက္ၐျံ ဒဒါတိ၊
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
33 ယး သွရ္ဂာဒဝရုဟျ ဇဂတေ ဇီဝနံ ဒဒါတိ သ ဤၑွရဒတ္တဘက္ၐျရူပး၊
Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
34 တဒါ တေ ပြာဝေါစန် ဟေ ပြဘော ဘက္ၐျမိဒံ နိတျမသ္မဘျံ ဒဒါတု၊
Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
35 ယီၑုရဝဒဒ် အဟမေဝ ဇီဝနရူပံ ဘက္ၐျံ ယော ဇနော မမ သန္နိဓိမ် အာဂစ္ဆတိ သ ဇာတု က္ၐုဓာရ္တ္တော န ဘဝိၐျတိ, တထာ ယော ဇနော မာံ ပြတျေတိ သ ဇာတု တၖၐာရ္တ္တော န ဘဝိၐျတိ၊
Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
36 မာံ ဒၖၐ္ဋွာပိ ယူယံ န ဝိၑွသိထ ယုၐ္မာနဟမ် ဣတျဝေါစံ၊
Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37 ပိတာ မဟျံ ယာဝတော လောကာနဒဒါတ် တေ သရွွ ဧဝ မမာန္တိကမ် အာဂမိၐျန္တိ ယး ကၑ္စိစ္စ မမ သန္နိဓိမ် အာယာသျတိ တံ ကေနာပိ ပြကာရေဏ န ဒူရီကရိၐျာမိ၊
Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
38 နိဇာဘိမတံ သာဓယိတုံ န ဟိ ကိန္တု ပြေရယိတုရဘိမတံ သာဓယိတုံ သွရ္ဂာဒ် အာဂတောသ္မိ၊
Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
39 သ ယာန် ယာန် လောကာန် မဟျမဒဒါတ် တေၐာမေကမပိ န ဟာရယိတွာ ၑေၐဒိနေ သရွွာနဟမ် ဥတ္ထာပယာမိ ဣဒံ မတ္ပြေရယိတုး ပိတုရဘိမတံ၊
Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
40 ယး ကၑ္စိန် မာနဝသုတံ ဝိလောကျ ဝိၑွသိတိ သ ၑေၐဒိနေ မယောတ္ထာပိတး သန် အနန္တာယုး ပြာပ္သျတိ ဣတိ မတ္ပြေရကသျာဘိမတံ၊ (aiōnios g166)
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” (aiōnios g166)
41 တဒါ သွရ္ဂာဒ် ယဒ် ဘက္ၐျမ် အဝါရောဟတ် တဒ် ဘက္ၐျမ် အဟမေဝ ယိဟူဒီယလောကာသ္တသျဲတဒ် ဝါကျေ ဝိဝဒမာနာ ဝက္တ္တုမာရေဘိရေ
Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
42 ယူၐဖး ပုတြော ယီၑု ရျသျ မာတာပိတရော် ဝယံ ဇာနီမ ဧၐ ကိံ သဧဝ န? တရှိ သွရ္ဂာဒ် အဝါရောဟမ် ဣတိ ဝါကျံ ကထံ ဝက္တ္တိ?
Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
43 တဒါ ယီၑုသ္တာန် ပြတျဝဒတ် ပရသ္ပရံ မာ ဝိဝဒဓွံ
Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
44 မတ္ပြေရကေဏ ပိတြာ နာကၖၐ္ဋး ကောပိ ဇနော မမာန္တိကမ် အာယာတုံ န ၑက္နောတိ ကိန္တွာဂတံ ဇနံ စရမေ'ဟ္နိ ပြောတ္ထာပယိၐျာမိ၊
O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
45 တေ သရွွ ဤၑွရေဏ ၑိက္ၐိတာ ဘဝိၐျန္တိ ဘဝိၐျဒွါဒိနာံ ဂြန္ထေၐု လိပိရိတ္ထမာသ္တေ အတော ယး ကၑ္စိတ် ပိတုး သကာၑာတ် ၑြုတွာ ၑိက္ၐတေ သ ဧဝ မမ သမီပမ် အာဂမိၐျတိ၊
E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
46 ယ ဤၑွရာဒ် အဇာယတ တံ ဝိနာ ကောပိ မနုၐျော ဇနကံ နာဒရ္ၑတ် ကေဝလး သဧဝ တာတမ် အဒြာက္ၐီတ်၊
O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
47 အဟံ ယုၐ္မာန် ယထာရ္ထတရံ ဝဒါမိ ယော ဇနော မယိ ဝိၑွာသံ ကရောတိ သောနန္တာယုး ပြာပ္နောတိ၊ (aiōnios g166)
Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
48 အဟမေဝ တဇ္ဇီဝနဘက္ၐျံ၊
Abụ m achịcha nke ndụ.
49 ယုၐ္မာကံ ပူရွွပုရုၐာ မဟာပြာန္တရေ မန္နာဘက္ၐျံ ဘူက္တ္တာပိ မၖတား
Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
50 ကိန္တု ယဒ္ဘက္ၐျံ သွရ္ဂာဒါဂစ္ဆတ် တဒ် ယဒိ ကၑ္စိဒ် ဘုင်္က္တ္တေ တရှိ သ န မြိယတေ၊
Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
51 ယဇ္ဇီဝနဘက္ၐျံ သွရ္ဂာဒါဂစ္ဆတ် သောဟမေဝ ဣဒံ ဘက္ၐျံ ယော ဇနော ဘုင်္က္တ္တေ သ နိတျဇီဝီ ဘဝိၐျတိ၊ ပုနၑ္စ ဇဂတော ဇီဝနာရ္ထမဟံ ယတ် သွကီယပိၑိတံ ဒါသျာမိ တဒေဝ မယာ ဝိတရိတံ ဘက္ၐျမ်၊ (aiōn g165)
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” (aiōn g165)
52 တသ္မာဒ် ယိဟူဒီယား ပရသ္ပရံ ဝိဝဒမာနာ ဝက္တ္တုမာရေဘိရေ ဧၐ ဘောဇနာရ္ထံ သွီယံ ပလလံ ကထမ် အသ္မဘျံ ဒါသျတိ?
Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
53 တဒါ ယီၑုသ္တာန် အာဝေါစဒ် ယုၐ္မာနဟံ ယထာရ္ထတရံ ဝဒါမိ မနုၐျပုတြသျာမိၐေ ယုၐ္မာဘိ ရ္န ဘုက္တ္တေ တသျ ရုဓိရေ စ န ပီတေ ဇီဝနေန သာရ္ဒ္ဓံ ယုၐ္မာကံ သမ္ဗန္ဓော နာသ္တိ၊
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
54 ယော မမာမိၐံ သွာဒတိ မမ သုဓိရဉ္စ ပိဝတိ သောနန္တာယုး ပြာပ္နောတိ တတး ၑေၐေ'ဟ္နိ တမဟမ် ဥတ္ထာပယိၐျာမိ၊ (aiōnios g166)
Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. (aiōnios g166)
55 ယတော မဒီယမာမိၐံ ပရမံ ဘက္ၐျံ တထာ မဒီယံ ၑောဏိတံ ပရမံ ပေယံ၊
Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
56 ယော ဇနော မဒီယံ ပလလံ သွာဒတိ မဒီယံ ရုဓိရဉ္စ ပိဝတိ သ မယိ ဝသတိ တသ္မိန္နဟဉ္စ ဝသာမိ၊
Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
57 မတ္ပြေရယိတြာ ဇီဝတာ တာတေန ယထာဟံ ဇီဝါမိ တဒွဒ် ယး ကၑ္စိန် မာမတ္တိ သောပိ မယာ ဇီဝိၐျတိ၊
Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
58 ယဒ္ဘက္ၐျံ သွရ္ဂာဒါဂစ္ဆတ် တဒိဒံ ယန္မာန္နာံ သွာဒိတွာ ယုၐ္မာကံ ပိတရော'မြိယန္တ တာဒၖၑမ် ဣဒံ ဘက္ၐျံ န ဘဝတိ ဣဒံ ဘက္ၐျံ ယော ဘက္ၐတိ သ နိတျံ ဇီဝိၐျတိ၊ (aiōn g165)
Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
59 ယဒါ ကဖရ္နာဟူမ် ပုရျျာံ ဘဇနဂေဟေ ဥပါဒိၑတ် တဒါ ကထာ ဧတာ အကထယတ်၊
O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
60 တဒေတ္ထံ ၑြုတွာ တသျ ၑိၐျာဏာမ် အနေကေ ပရသ္ပရမ် အကထယန် ဣဒံ ဂါဎံ ဝါကျံ ဝါကျမီဒၖၑံ ကး ၑြောတုံ ၑကြုယာတ်?
Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
61 ကိန္တု ယီၑုး ၑိၐျာဏာမ် ဣတ္ထံ ဝိဝါဒံ သွစိတ္တေ ဝိဇ္ဉာယ ကထိတဝါန် ဣဒံ ဝါကျံ ကိံ ယုၐ္မာကံ ဝိဃ္နံ ဇနယတိ?
Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
62 ယဒိ မနုဇသုတံ ပူရွွဝါသသ္ထာနမ် ဦရ္ဒွွံ ဂစ္ဆန္တံ ပၑျထ တရှိ ကိံ ဘဝိၐျတိ?
Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
63 အာတ္မဲဝ ဇီဝနဒါယကး ဝပု ရ္နိၐ္ဖလံ ယုၐ္မဘျမဟံ ယာနိ ဝစာံသိ ကထယာမိ တာနျာတ္မာ ဇီဝနဉ္စ၊
Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
64 ကိန္တု ယုၐ္မာကံ မဓျေ ကေစန အဝိၑွာသိနး သန္တိ ကေ ကေ န ဝိၑွသန္တိ ကော ဝါ တံ ပရကရေၐု သမရ္ပယိၐျတိ တာန် ယီၑုရာပြထမာဒ် ဝေတ္တိ၊
Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
65 အပရမပိ ကထိတဝါန် အသ္မာတ် ကာရဏာဒ် အကထယံ ပိတုး သကာၑာတ် ၑက္တ္တိမပြာပျ ကောပိ မမာန္တိကမ် အာဂန္တုံ န ၑက္နောတိ၊
Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
66 တတ္ကာလေ'နေကေ ၑိၐျာ ဝျာဃုဋျ တေန သာရ္ဒ္ဓံ ပုန ရ္နာဂစ္ဆန်၊
Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
67 တဒါ ယီၑု ရ္ဒွါဒၑၑိၐျာန် ဥက္တ္တဝါန် ယူယမပိ ကိံ ယာသျထ?
Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”
68 တတး ၑိမောန် ပိတရး ပြတျဝေါစတ် ဟေ ပြဘော ကသျာဘျရ္ဏံ ဂမိၐျာမး? (aiōnios g166)
Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
69 အနန္တဇီဝနဒါယိနျော ယား ကထာသ္တာသ္တဝဲဝ၊ ဘဝါန် အမရေၑွရသျာဘိၐိက္တ္တပုတြ ဣတိ ဝိၑွသျ နိၑ္စိတံ ဇာနီမး၊
Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
70 တဒါ ယီၑုရဝဒတ် ကိမဟံ ယုၐ္မာကံ ဒွါဒၑဇနာန် မနောနီတာန် န ကၖတဝါန်? ကိန္တု ယုၐ္မာကံ မဓျေပိ ကၑ္စိဒေကော ဝိဃ္နကာရီ ဝိဒျတေ၊
Jisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
71 ဣမာံ ကထံ သ ၑိမောနး ပုတြမ် ဤၐ္ကရီယောတီယံ ယိဟူဒါမ် ဥဒ္ဒိၑျ ကထိတဝါန် ယတော ဒွါဒၑာနာံ မဓျေ ဂဏိတး သ တံ ပရကရေၐု သမရ္ပယိၐျတိ၊
Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.

< ယောဟနး 6 >