< ဣဖိၐိဏး 4 >

1 အတော ဗန္ဒိရဟံ ပြဘော ရ္နာမ္နာ ယုၐ္မာန် ဝိနယေ ယူယံ ယေနာဟွာနေနာဟူတာသ္တဒုပယုက္တရူပေဏ
Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu.
2 သရွွထာ နမြတာံ မၖဒုတာံ တိတိက္ၐာံ ပရသ္ပရံ ပြမ္နာ သဟိၐ္ဏုတာဉ္စာစရတ၊
Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.
3 ပြဏယဗန္ဓနေန စာတ္မန ဧကျံ ရက္ၐိတုံ ယတဓွံ၊
Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.
4 ယူယမ် ဧကၑရီရာ ဧကာတ္မာနၑ္စ တဒွဒ် အာဟွာနေန ယူယမ် ဧကပြတျာၑာပြာပ္တယေ သမာဟူတား၊
E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu.
5 ယုၐ္မာကမ် ဧကး ပြဘုရေကော ဝိၑွာသ ဧကံ မဇ္ဇနံ, သရွွေၐာံ တာတး
Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.
6 သရွွောပရိသ္ထး သရွွဝျာပီ သရွွေၐာံ ယုၐ္မာကံ မဓျဝရ္တ္တီ စဲက ဤၑွရ အာသ္တေ၊
Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.
7 ကိန္တု ခြီၐ္ဋသျ ဒါနပရိမာဏာနုသာရာဒ် အသ္မာကမ် ဧကဲကသ္မဲ ဝိၑေၐော ဝရော'ဒါယိ၊
Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị.
8 ယထာ လိခိတမ် အာသ္တေ, "ဦရ္ဒ္ဓွမ် အာရုဟျ ဇေတၖန် သ ဝိဇိတျ ဗန္ဒိနော'ကရောတ်၊ တတး သ မနုဇေဘျော'ပိ သွီယာန် ဝျၑြာဏယဒ် ဝရာန်။ "
Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.”
9 ဦရ္ဒ္ဓွမ် အာရုဟျေတိဝါကျသျာယမရ္ထး သ ပူရွွံ ပၖထိဝီရူပံ သရွွာဓးသ္ထိတံ သ္ထာနမ် အဝတီရ္ဏဝါန်;
(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ?
10 ယၑ္စာဝတီရ္ဏဝါန် သ ဧဝ သွရ္ဂာဏာမ် ဥပရျျုပရျျာရူဎဝါန် ယတး သရွွာဏိ တေန ပူရယိတဝျာနိ၊
Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)
11 သ ဧဝ စ ကာံၑ္စန ပြေရိတာန် အပရာန် ဘဝိၐျဒွါဒိနော'ပရာန် သုသံဝါဒပြစာရကာန် အပရာန် ပါလကာန် ဥပဒေၑကာံၑ္စ နိယုက္တဝါန်၊
O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.
12 ယာဝဒ် ဝယံ သရွွေ ဝိၑွာသသျေၑွရပုတြဝိၐယကသျ တတ္တွဇ္ဉာနသျ စဲကျံ သမ္ပူရ္ဏံ ပုရုၐရ္ထဉ္စာရ္ထတး ခြီၐ္ဋသျ သမ္ပူရ္ဏပရိမာဏသျ သမံ ပရိမာဏံ န ပြာပ္နုမသ္တာဝတ္
Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst;
13 သ ပရိစရျျာကရ္မ္မသာဓနာယ ခြီၐ္ဋသျ ၑရီရသျ နိၐ္ဌာယဲ စ ပဝိတြလောကာနာံ သိဒ္ဓတာယာသ္တာဒၖၑမ် ဥပါယံ နိၑ္စိတဝါန်၊
tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.
14 အတဧဝ မာနုၐာဏာံ စာတုရီတော ဘြမကဓူရ္တ္တတာယာၑ္ဆလာစ္စ ဇာတေန သရွွေဏ ၑိက္ၐာဝါယုနာ ဝယံ ယဒ် ဗာလကာ ဣဝ ဒေါလာယမာနာ န ဘြာမျာမ ဣတျသ္မာဘိ ရျတိတဝျံ,
Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie.
15 ပြေမ္နာ သတျတာမ် အာစရဒ္ဘိး သရွွဝိၐယေ ခြီၐ္ဋမ် ဥဒ္ဒိၑျ ဝရ္ဒ္ဓိတဝျဉ္စ, ယတး သ မူရ္ဒ္ဓါ,
Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.
16 တသ္မာစ္စဲကဲကသျာင်္ဂသျ သွသွပရိမာဏာနုသာရေဏ သာဟာယျကရဏာဒ် ဥပကာရကဲး သရွွဲး သန္ဓိဘိး ကၖတ္သ္နသျ ၑရီရသျ သံယောဂေ သမ္မိလနေ စ ဇာတေ ပြေမ္နာ နိၐ္ဌာံ လဘမာနံ ကၖတ္သ္နံ ၑရီရံ ဝၖဒ္ဓိံ ပြာပ္နောတိ၊
Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.
17 ယုၐ္မာန် အဟံ ပြဘုနေဒံ ဗြဝီမျာဒိၑာမိ စ, အနျေ ဘိန္နဇာတီယာ ဣဝ ယူယံ ပူန ရ္မာစရတ၊
Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.
18 ယတသ္တေ သွမနောမာယာမ် အာစရန္တျာန္တရိကာဇ္ဉာနာတ် မာနသိကကာဌိနျာစ္စ တိမိရာဝၖတဗုဒ္ဓယ ဤၑွရီယဇီဝနသျ ဗဂီရ္ဘူတာၑ္စ ဘဝန္တိ,
Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.
19 သွာန် စဲတနျၑူနျာန် ကၖတွာ စ လောဘေန သရွွဝိဓာၑော်စာစရဏာယ လမ္ပဋတာယာံ သွာန် သမရ္ပိတဝန္တး၊
Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.
20 ကိန္တု ယူယံ ခြီၐ္ဋံ န တာဒၖၑံ ပရိစိတဝန္တး,
Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst,
21 ယတော ယူယံ တံ ၑြုတဝန္တော ယာ သတျာ ၑိက္ၐာ ယီၑုတော လဘျာ တဒနုသာရာတ် တဒီယောပဒေၑံ ပြာပ္တဝန္တၑ္စေတိ မနျေ၊
ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs.
22 တသ္မာတ် ပူရွွကာလိကာစာရကာရီ ယး ပုရာတနပုရုၐော မာယာဘိလာၐဲ ရ္နၑျတိ တံ တျက္တွာ ယုၐ္မာဘိ ရ္မာနသိကဘာဝေါ နူတနီကရ္တ္တဝျး,
Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,
23 ယော နဝပုရုၐ ဤၑွရာနုရူပေဏ ပုဏျေန သတျတာသဟိတေန
ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ.
24 ဓာရ္မ္မိကတွေန စ သၖၐ္ဋး သ ဧဝ ပရိဓာတဝျၑ္စ၊
Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.
25 အတော ယူယံ သရွွေ မိထျာကထနံ ပရိတျဇျ သမီပဝါသိဘိး သဟ သတျာလာပံ ကုရုတ ယတော ဝယံ ပရသ္ပရမ် အင်္ဂပြတျင်္ဂါ ဘဝါမး၊
Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.
26 အပရံ ကြောဓေ ဇာတေ ပါပံ မာ ကုရုဓွမ်, အၑာန္တေ ယုၐ္မာကံ ရောၐေသူရျျော'သ္တံ န ဂစ္ဆတု၊
Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.
27 အပရံ ၑယတာနေ သ္ထာနံ မာ ဒတ္တ၊
Enyela ekwensu ohere.
28 စောရး ပုနၑ္စဲရျျံ န ကရောတု ကိန္တု ဒီနာယ ဒါနေ သာမရ္ထျံ ယဇ္ဇာယတေ တဒရ္ထံ သွကရာဘျာံ သဒွၖတ္တျာ ပရိၑြမံ ကရောတု၊
Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
29 အပရံ ယုၐ္မာကံ ဝဒနေဘျး ကော'ပိ ကဒါလာပေါ န နိရ္ဂစ္ဆတု, ကိန္တု ယေန ၑြောတုရုပကာရော ဇာယတေ တာဒၖၑး ပြယောဇနီယနိၐ္ဌာယဲ ဖလဒါယက အာလာပေါ ယုၐ္မာကံ ဘဝတု၊
Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.
30 အပရဉ္စ ယူယံ မုက္တိဒိနပရျျန္တမ် ဤၑွရသျ ယေန ပဝိတြေဏာတ္မနာ မုဒြယာင်္ကိတာ အဘဝတ တံ ၑောကာနွိတံ မာ ကုရုတ၊
Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
31 အပရံ ကဋုဝါကျံ ရောၐး ကောၐး ကလဟော နိန္ဒာ သရွွဝိဓဒွေၐၑ္စဲတာနိ ယုၐ္မာကံ မဓျာဒ် ဒူရီဘဝန္တု၊
Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.
32 ယူယံ ပရသ္ပရံ ဟိတဲၐိဏး ကောမလာန္တးကရဏာၑ္စ ဘဝတ၊ အပရမ် ဤၑွရး ခြီၐ္ဋေန ယဒွဒ် ယုၐ္မာကံ ဒေါၐာန် က္ၐမိတဝါန် တဒွဒ် ယူယမပိ ပရသ္ပရံ က္ၐမဓွံ၊
Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.

< ဣဖိၐိဏး 4 >