< Salmos 150 >
1 Aleluia! Louvai a Deus em seu santuário; louvai-o no firmamento de seu poder.
Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
2 Louvai-o por suas proezas; louvai-o conforme a imensidão de sua grandeza.
Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
3 Louvai-o com com de trombeta; louvai-o com lira e harpa.
Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
4 Louvai-o com tamborim e flauta; louvai-o com instrumentos de cordas e de sopro.
jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
5 Louvai-o com címbalos bem sonoros; louvai-o com címbalos de sons de alegria.
werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
6 Tudo quanto tem fôlego, louve ao SENHOR! Aleluia!
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.