< Rzymian 2 >
1 Przetoż jesteś bez wymówki, o człowiecze! który osądzasz; bo w czem drugiego osądzasz, samego siebie osądzasz, ponieważ toż czynisz, który drugiego osądzasz.
Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.
2 Lecz wiemy, iż sąd Boży jest według prawdy przeciwko tym, którzy takowe rzeczy czynią.
Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi.
3 Czy mniemasz, o człowiecze! który osądzasz tych, co takowe rzeczy czynią, a sam je czynisz, że ty ujdziesz sądu Bożego?
Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke?
4 Czy bogactwy dobrotliwości jego i cierpliwości, i nieskwapliwości pogardzasz, nie wiedząc, iż cię dobrotliwość Boża do pokuty prowadzi?
Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
5 Ale podług zatwardziałości twojej i serca niepokutującego skarbisz sobie samemu gniew na dzień gniewu i objawienia sprawiedliwego sądu Bożego.
Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi.
6 Który odda każdemu podług uczynków jego;
Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị.
7 Tym, którzy przez wytrwanie w uczynku dobrym szukają sławy i czci i nieskazitelności, odda żywot wieczny; (aiōnios )
Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
8 A zaś swarliwym i prawdzie nieposłusznym, lecz posłusznym niesprawiedliwości, odda zapalczywość i gniew;
Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma.
9 Utrapienie i ucisk duszy każdego człowieka, który złość popełnia, Żyda najprzód, potem i Greka;
Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ.
10 A chwałę i cześć, i pokój wszelkiemu czyniącemu dobre, Żydowi najprzód, potem i Grekowi.
Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.
11 Albowiem nie masz względu na osoby u Boga.
Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.
12 A którzykolwiek bez zakonu zgrzeszyli, bez zakonu też poginą; a którzykolwiek w zakonie zgrzeszyli, przez zakon sądzeni będą.
Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.
13 (Gdyż nie słuchacze zakonu sprawiedliwymi są u Boga; ale czyniciele zakonu usprawiedliwieni będą.)
Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume.
14 Bo ponieważ poganie nie mający zakonu, z przyrodzenia czynią, co jest w zakonie, ci, zakonu nie mając, sami sobie są zakonem;
Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
15 Którzy ukazują skutek zakonu, napisany na sercach swych, z poświadczaniem sumienia ich i myśli wespół siebie oskarżających albo też wymawiających,
Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.
16 W dzień, gdy sądzić będzie Bóg skryte rzeczy ludzkie według Ewangielii mojej przez Jezusa Chrystusa.
Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.
17 Oto się ty nazywasz Żydem i polegasz na zakonie, a chlubisz się Bogiem.
Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke,
18 I znasz wolę jego i rozeznajesz rzeczy różne od niej, wyćwiczony będąc z zakonu;
ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu;
19 I masz za to, żeś jest wodzem ślepych, światłością tych, którzy są w ciemności;
ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị,
20 Mistrzem bezrozumnych, nauczycielem niemowlątek, mając kształt znajomości i prawdy w zakonie.
ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu.
21 Który tedy uczysz drugiego, siebie samego nie uczysz? Który opowiadasz, żeby nie kradziono, kradniesz?
Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?
22 Który mówisz, żeby nie cudzołożono, cudzołożysz? który się brzydzisz bałwany, święte rzeczy kradniesz?
Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?
23 Który się chlubisz zakonem, przez przestępstwo zakonu Boga lżysz?
Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ?
24 Albowiem imię Boże dla was bluźnione bywa między pogany, jako napisano.
Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.”
25 Boć obrzezanie jest pożyteczne, jeźlibyś pełnił zakon; ale jeźlibyś był przestępcą zakonu, twoje obrzezanie stało się nieobrzezką.
Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu.
26 Jeźliby tedy nieobrzezka przestrzegała praw zakonnych, azaż jego nieobrzezka nie będzie przyczyną za obrzezkę?
Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu?
27 I osądzi nieobrzezka z przyrodzenia zakon pełniąca ciebie, który przez literę i obrzezkę jesteś przestępcą zakonu.
Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu.
28 Albowiem nie ten jest Żydem, który jest Żydem na jawie, ani to jest obrzezka, która jest na jawie na ciele;
Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ.
29 Ale który jest w skrytości Żydem i obrzezka serca, która jest w duchu, nie w literze, której chwała nie jest z ludzi, ale z Boga.
Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.