< Hebrajczyków 6 >
1 Przetoż zaniechawszy początkowych nauk o Chrystusie, miejmy się ku doskonałości, nie znowu zakładając grunty pokuty od uczynków martwych i wiary w Boga.
Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
2 Nauki o chrzcie i o wkładaniu rąk, i o powstaniu umarłych, i o sądzie wiecznym; (aiōnios )
na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. (aiōnios )
3 A to uczynimy, jeźli tylko Bóg dopuści.
Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.
4 Albowiem niemożebne jest, aby ci, którzy są raz oświeceni i skosztowali daru niebieskiego, i uczestnikami się stali Ducha Świętego,
Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ,
5 Skosztowali też dobrego słowa Bożego i mocy przyszłego wieku, (aiōn )
ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, (aiōn )
6 Gdyby odpadli, aby się zaś odnowili ku pokucie, jako ci, którzy sobie znowu krzyżują Syna Bożego i jawnie go sromocą.
ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.
7 Albowiem ziemia, która często na się przychodzący deszcz pije i rodzi ziele przygodne tym, którzy ją sprawują, bierze błogosławieństwo od Boga;
Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
8 Lecz która przynosi ciernie i osty, odrzucona jest i bliska przeklęstwa, która na koniec bywa spalona.
Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.
9 A wszakże, najmilsi! pewniśmy o was coś lepszego i zbawienia bliższego, chociaż tak mówimy.
Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa.
10 Albowiem nie jest Bóg niesprawiedliwy, aby zapamiętał pracy waszej i pracowitej miłości, którąście okazali ku imieniu jego, gdyście służyli świętym i jeszcze służycie.
Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.
11 A żądamy, aby każdy z was toż staranie pokazywał ku nabyciu zupełnej nadziei aż do końca.
Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru.
12 Abyście nie byli gnuśnymi, ale naśladowcami tych, którzy przez wiarę i cierpliwość odziedziczyli obietnicę.
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.
13 Albowiem Bóg obietnicę czyniąc Abrahamowi, gdy nie miał przez kogo większego przysiąc, przysiągł przez siebie samego,
Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
14 Mówiąc: Zaiste błogosławiąc błogosławić ci będę i rozmnażając rozmnożę cię.
na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
15 A tak długo czekając, dostąpił obietnicy.
Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
16 Ludzieć wprawdzie przez większego przysięgają, a przysięga, która się dzieje ku potwierdzeniu, jest między nimi końcem wszystkich sporów.
Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
17 Dlatego też Bóg chcąc dostatecznie okazać dziedzicom obietnicy nieodmienność rady swojej, uczynił na to przysięgę,
Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.
18 Abyśmy przez dwie rzeczy nieodmienne (w których niemożebne, aby Bóg kłamał), warowną pociechę mieli, my, którzyśmy się uciekli ku otrzymaniu wystawionej nadziei,
Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị.
19 Którą mamy jako kotwicę duszy, i bezpieczną, i pewną, i wchodzącą aż wewnątrz za zasłonę,
Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi
20 Gdzie przewodnik dla nas wszedł, Jezus, stawszy się według porządku Melchisedekowego najwyższym kapłanem na wieki. (aiōn )
ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. (aiōn )