< Wyjścia 17 >
1 Ruszyło się tedy wszystko mnóstwo synów Izraelskich z puszczy Zyn stanowiskami swemi, według rozkazania Pańskiego, i położyli się obozem w Rafidym, gdzie wody nie było, aby pił lud.
Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ.
2 Przetoż swarzył się lud z Mojżeszem, mówiąc: Dajcie nam wody, abyśmy pili. Którym odpowiedział Mojżesz: Cóż się swarzycie ze mną? a czemu kusicie Pana?
Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”
3 I pragnął tam lud wody, a szemrał przeciwko Mojżeszowi, mówiąc: Po cóżeś nas wywiódł z Egiptu, abyś pomorzył mnie, i syny moje, i bydło moje pragnieniem?
Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”
4 Zawołał tedy Mojżesz do Pana, mówiąc: Cóż mam czynić ludowi temu? blisko tego, że mię ukamionują.
Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”
5 I rzekł Pan do Mojżesza: Idź przed ludem, a weźmij z sobą niektóre z starszych Izraelskich; laskę też twoję którąś uderzył w rzekę, weźmij w rękę twoję, a idź.
Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.
6 Oto, Ja stanę przed tobą tam na skale w Horeb, i uderzysz w skałę, a wynijdą z niej wody, które będzie pił lud. I uczynił tak Mojżesz przed oczyma starszych Izraelskich.
Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.
7 I nazwał imię onego miejsca Masa i Meryba, dla swarów synów Izraelskich, a iż kusili Pana mówiąc: I jestże Pan między nami czyli nie?
Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”
8 Tedy przyciągnął Amalek, aby walczył z Izraelem w Rafidym.
Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.
9 I rzekł Mojżesz do Jozuego: Wybierz nam męże, a wyszedłszy, stocz bitwę z Amalekity: a jutro stanę na wierzchu pagórka, mając laskę Bożą w ręce mojej.
Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.”
10 I uczynił Jozue, jako mu rozkazał Mojżesz, i stoczył bitwę z Amalekiem; a Mojżesz, Aaron i Chur wstąpili na wierzch pagórka.
Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ.
11 A gdy podnosił Mojżesz rękę swoję, przemagał Izrael; a gdy opuszczał rękę swoję, przemagał Amalek.
Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya.
12 Ale ręce Mojżeszowe ociężały były; wziąwszy tedy kamień, podłożyli podeń, i usiadł na nim; a Aaron, i Chur podpierali ręce jego, jeden z jednej, drugi z drugiej strony; i nie ustały ręce jego aż do zajścia słońca.
Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara.
13 Tedy poraził Jozue Amaleka i lud jegoż ostrzem miecza.
Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.
14 Potem rzekł Pan do Mojżesza: Wpisz to dla pamięci w księgi, a włóż to w uszy Jozuego, że pewnie wygładzę pamiątkę Amaleka pod niebem.
Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”
15 I zbudował Mojżesz ołtarz, a nazwał imię jego: Pan chorągiew moja;
Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m.
16 Bo rzekł: Iż ręka stolicy Pańskiej, i wojna Pańska, będzie przeciwko Amalekowi od rodzaju do rodzaju.
Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze Onyenwe anyị dị. Onyenwe anyị ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”