< Matayu 27 >

1 Mandawira putiputi watambika wakulu woseri na wazewi waliwoniti pamuhera watenditi mpangu gwa kumlaga Yesu.
Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya.
2 Womberi wamtawa pingu na wamjega kwa Pilatu mkulu gwa mkowa yakasyagulitwi na mlongoziya gwa sirikali ya Rumi.
Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.
3 Yuda mgalambuka, pakawoniti kuwera Yesu wamtoza kala, yomberi moyu gumtamiti nentu na kawawuzilira watambika wakulu pamuhera na wazewi magwala malongu matatu galii ga mpiya.
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.
4 Kalonga, “Neni ntenda vidoda kwa kumgalambuka muntu yakahera likosa, wamlagi!” Womberi wamwankula, “Gatuwusu shishi twenga? Aga ndo gaku gumweni!”
Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”
5 Yuda kaziyasa mpiya zilii Mnumba nkulu ya Mlungu, kalawa kunja kagenda kulilaga mulugoyi.
Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ.
6 Watambika wakulu wazitola mpiya zilii na walonga, “Azi ndo mpiya zya mwazi na ifaa ndiri kuzitula mluhanja lwa Numba nkulu ya Mlungu.”
Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.”
7 Pawajimilirana kala kuusu mpiya azi, womberi wazitumiya kuhemera lirambu lya ukaka, liweri pahala pa kusilira wahenga.
Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
8 Ndo mana mpaka leru lirambu ali walishema, “Lirambu lya Mwazi.”
Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa.
9 Su visoweru vyakatakuliti Yeremiya mbuyi gwa Mlungu vitendeki, “Watoliti magwala malongu matatu ga mpiya, shyasi sha wantu wa Israeli wapangiti kumlipira yomberi,
Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya.
10 na wahemelera lirambu la ukaka, Mtuwa ntambu yakanagaliriti.”
Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”
11 Yesu wamgolosiyiti palongolu pa mkulu gwa mkowa, ndomweni yakamkosiyiti. Su Pilatu kamkosiya, “Hashi, gwenga ndo mfalumi gwa Wayawudi?” Yesu kamwankula, “Gwenga gulonga.”
Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
12 Kumbiti Yesu kankula ndiri shintu, watambika wakulu na wazewi pawaweriti wankumsitaki.
Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla.
13 Su Pilatu kamkosiya, “Hashi, gupikinira ndiri masitaka goseri aga gawalaviya kwa gwenga?”
Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?”
14 Kumbiti Yesu kawankula ndiri ata shisoweru shimu, ata mkulu gwa mkowa ayu kalikangasha nentu.
Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu.
15 Iweriti shitiba shawu mushipindi sha msambu gwa Pasaka mkulu gwa mkowa kumvugulira mtatirwa yumu yawamfiriti.
Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ.
16 Shipindi ashi kuweriti na muntu yumu yakamanikaniti nentu yawamtatiriti mushibetubetu litawu lyakuwi Baraba.
Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas.
17 Su wantu pawaliwoniti pamuhera, Pilatu kawakosiya, “Mfira numulaviyi yoshi pakati pa awili awa, Baraba ama Yesu yawamshema Kristu Mlopoziya?”
Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”
18 Yomberi kavimaniti weri kuwera walongoziya wa Shiyawudi wamjegiti Yesu kwakuwi kwajili ya weya.
Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya.
19 Pilatu pakaweriti kalivaga pashigoda sha kutoza, mdala gwakuwi kamjegeriti ujumbi, “Naguliyingiziya mulisitaka lya muntu ayu muheri, toziya leru ntabika nentu mukulota kuusu yomberi.”
Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.”
20 Watambika wakulu na wazewi waligambiriti lipinga lya wantu wamluwi Baraba wamvuguliri na Yesu wamlagi.
Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.
21 Kumbiti Pilatu kalikosiya lipinga lya wantu, “Hashi, yoshi pakati pa wawili awa yamfira nukuvugulirani?” Womberi wamwankula, “Baraba!”
Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!”
22 Pilatu kawakosiya, “Vinu ntendi ashashi kuusu Yesu yawamshema Kristu Mlopoziya?” Woseri wamwankula, “Gumpingiki mulupingika!”
Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!”
23 Kumbiti Pilatu kakosiya, “Hashi, yomberi katenda likosa gaa?” Shakapanu womberi wanjiti kushowangana, “Wampingiki mlupingika!”
Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
24 Pilatu pakawoniti kuwera kafanikiwa ndiri shoseri na kwana vidoda viweriti vyankwanja katoliti mashi na kaganaviya mawoku gakuwi palongolu pa lipinga lya wantu na kalonga, “Neni nahera lawama kuhowa kwa muntu ayu. Na shitwatila ashi mtendi maweni.”
Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.”
25 Lipinga lyoseri lya wantu limwankula, “Mwazi gwakuwi guweri kwa twenga na kwa wananguta wetu.”
Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!”
26 Shakapanu Pilatu kamvugulira Baraba kulawa mushibetubetu, kumbiti Yesu pawamsyatanga kala ntomondu, kamlaviyiti wampingiki mulupingika.
Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe.
27 Shakapanu wanjagila wa Pilatu wamtola Yesu wamwingiziya mumakawu makulu ga numba zya wanjagila wa Shirumi na wamjojinikira shipinga shoseri.
Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu.
28 Wamvula nguwu zyakuwi na wamvalisiya lihabiti lya langi nsheri.
Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie.
29 Su wapota lijenjeri lya misontu na wamvalisiya mumtuwi mwakuwi na wamtulira ludenki muliwoku lyakuwi lya kumliwu na wasuntama palongolu pakuwi na wamtendera lijonga. Womberi wamlamsiya, “Mwika Mfalumi gwa Wayawudi.”
Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!”
30 Wamtemera mata na walutola ludenki lulii na wamkoma nalu mumtuwi.
Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe.
31 Pawamaliriti kala kumtendera lijonga, wamvula lihabiti lilii na wamvalisiya nguwu zakuwi. Su wamjega yomberi kumpinjika mulupingika.
Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe.
32 Pawaweriti wankugenda wamwona muntu yumu litawu lyakuwi Simoni yakalawiriti lushi lwa Kureni na wanjagila wamlazimisha kulutola lupingika lwa Yesu.
Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
33 Pawasokiti pahala pawapashema Goligota, mana yakuwi, “Pahala pa vipalakasa vya mtuwi.”
Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”).
34 Wamupa muhanganu gwa Divayi na mtera gukaripa, kumbuti Yesu pakailawaliriti kalema kulanda.
Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ.
35 Wampingika mulupingika, shakapanu waligawirana nguwu zyakuwi kwa kugalambula simbi.
Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
36 Pa aga walivaga panu waweriti wankumlolera.
Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche.
37 Pampindi pa mtuwi gwakuwi mulupingika watula lisitaka limwusu yomberi lyawalembiti, “Ayu ndo Yesu, Mfalumi gwa Wayawudi.”
Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.
38 Shakapanu wawapingika wakwepula wawili pamuhera na Yesu, yumu uwega wa kumshigi kwakuwi na yumonga uwega wa kumliwu kwakuwi.
Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
39 Wantu yawaweriti wankupita pahala paliya wamwigilanga Yesu na kutikisiya mituwi yawu pawalonga,
Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha,
40 “Gwenga gulitumbiti kuyibomolanga Numba nkulu ya Mlungu na kuinyawa kwa mashaka matatu! Vinu gulilopoziyi gumweni handa gwenga gwa Mwana gwa Mlungu, su gusuluki palupingika!”
na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!”
41 Ntambu iraa ayi watambika wakulu na wafunda wa Malagaliru na wazewi wamtendiriti lijonga,
Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị,
42 “Kawalopoziyiti wamonga, kumbuti kasinda kulipoziya mweni! Hashi, yomberi mfalumi ndiri gwa Israeli? Vinu kasuluki palupingika na twenga hatumjimiri.
“Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya.
43 Kamtumbiliti Mlungu na kutakula eti yomberi ndo Mwana gwa Mlungu. Su tuleki tumloli Mlungu kamlopoziyi handa kamfira nakaka!”
Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’”
44 Ntambu iraa ayi na wakwepula walii yawawapingikiti pamuhera na Yesu wamuhigiranga viraa.
Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
45 Kwanjira saa sita mpaka saa tisa paliwala, pasipanu poseri paweriti na ntiti masaa matatu.
Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile.
46 Payiweriti saa tisa Yesu kalira kwa liziwu likulu, “Eloyi, Eloyi lama sabakitani?” Mana yakuwi, “Mlungu gwangu, Mlungu gwangu iwera ashi gundeka?”
Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
47 Wantu wamu yawagolokiti palii pawapikaniriti hangu, walonga, “Kankumshema Eliya!”
Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.”
48 Yumu gwawu katuga katola lidodoki, kalijwika mudivayi isheshema, kayitula mulupeleru lwa ludenki na wajera kumupa yomberi kalandi.
Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ.
49 Kumbiti wamonga walonga, “Guheperi, tuloli handa Eliya kankwiza kumlopoziya!”
Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”
50 Yesu kalira kayi kwa liziwu likulu, su kahowa.
Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume.
51 Shakapanu lipaziya lya Numba nkulu ya Mlungu lyalilekaniziya pahala pananagala nentu, lidegeka vipandi viwili kulawa kunani mpaka pasi. Pasipanu pabegiziwa na matalawu gapantika,
Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara.
52 na mapumba gagubutuka na wantu wa Mlungu wavuwa yawahowiti wawazyukusiwa.
Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie.
53 Womberi walawa mumapumba na Yesu pakazyukiti kala kulawa kwa wahowiti, womberi wagenditi Yerusalemu lushi lunanagala, wawonikaniti na wantu wavuwa.
Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha.
54 Mkulu gwa wawanjagila na wanjagila yawaweriti wankumlolera Yesu, wawoniti kubegiziwa pasipanu na vitwatira vyoseri vyavilawiriti, watiriti nentu na walonga, “Nakaka muntu ayu kaweriti Mwana gwa Mlungu!”
Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
55 Kuweriti na wadala wavuwa palii, pawalola kwa kutali. Wadala awa ndo walii yawamfatiti Yesu kulawa Galilaya na wamtangiti.
Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi.
56 Pakati pawu paweriti Mariya Magidalena na Mariya mawu gwa Yakobu na mlongu gwakuwi yawamshema Yosefu, pamuhera na mdala gwa Zebedayu.
Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi.
57 Payiweriti pamihi, kiziti muntu yumu kalunda mwenikaya gwa Arimatayu litawu lyakuwi Yosefu na yomberi kaweriti mfundwa gwa Yesu.
Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs,
58 Kamgenderiti Pilatu na kaluwa mawuti ga Yesu. Pilatu kalagalira wamupi Yosefu mawuti galii.
jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ.
59 Su Yosefu katola mawuti galii, kagatindiziya sanda iherepa,
Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya,
60 na Kagatula mulipumba lya mpanga lyakuwi, lyakalisongoliti palitalawu. Su kalibiringa litalawu likulu pamlyangu gwa lipumba na kagenda zyakuwi.
ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
61 Mariya Magidalena na Mariya gwingi ulii yawaweriti walivaga palii pawalola lipumba.
Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.
62 Shirawu yakuwi, lishaka lya Kwoyera, watambika wakulu na Mafalisayu wamgendiriti Pilatu,
Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.
63 na walonga, “Mtuwa, tulihola kuwera mpayu ulii katakuliti pamberi pa kuhowa kwakuwi kalongiti, ‘Pa mashaka matatu hanzyuki.’
Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.
64 Su gulagaliri lipumba lyakuwi waliloleri weri mpaka lishaka lya tatu, su wafundwa wakuwi hapeni wawezi kwiza kugatola mauti gakuwi na kuwagambira wantu kuwera kazyuka. Kupayira aku hakuweri kudoda kuliku kupayira kwa kwanja.”
Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”
65 Pilatu kawagambira, “Muwatoli walolera, mgendi na kulolera lipumba ntambu yamuweza.”
Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.”
66 Su wagenda na kulolera lipumba walimatira litalawu na kuwaleka wanjagila waloleri.
Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.

< Matayu 27 >