< اعداد 15 >
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
«این دستورها را به قوم اسرائیل بده: وقتی ساکن سرزمینی شدید که من به شما میدهم، | 2 |
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu,
قربانیهای مخصوص به خداوند تقدیم خواهید کرد تا هدایای خوشبو برای خداوند باشد. این هدایا میتوانند به شکل قربانی سوختنی، قربانی نذری، قربانی اختیاری و یا قربانی اعیاد باشند که از میان گلۀ گوسفند و بز یا رمۀ گاو تقدیم میشوند. | 3 |
ọ bụrụ na unu echee nʼihu Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme.
هرگاه این هدایا را به خداوند تقدیم میکنید، باید هدیۀ آردی شامل یک دهم ایفه آرد مرغوب مخلوط با یک چهارم هین روغن نیز تقدیم کنید. | 4 |
Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu Onyenwe anyị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa.
همچنین همراه قربانی سوختنی یا قربانی مخصوص، برای هر برّه یک چهارم هین شراب نیز به عنوان هدیهٔ نوشیدنی تقدیم شود. | 5 |
Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
«اگر قربانی قوچ باشد، دو دهم ایفه آرد مرغوب، آمیخته با یک سوم هین روغن تقدیم شود، | 6 |
“‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita,
و نیز یک سوم هین شراب بهعنوان هدیۀ نوشیدنی. این را همچون هدیهای خوشبو به خداوند تقدیم کنید. | 7 |
tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
«هرگاه گوسالۀ نری به عنوان قربانی سوختنی یا قربانی نذری یا قربانی سلامتی به خداوند تقدیم میکنید، | 8 |
“‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị,
هدیهٔ آردی همراه آن باید شامل سه دهمِ ایفه آرد مرغوب، آمیخته با نیم هین روغن | 9 |
tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.
و هدیهٔ نوشیدنی آن، نیم هین شراب باشد. این هدیه، هدیهای مخصوص و خوشبو برای خداوند خواهد بود. | 10 |
Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
«پس برای قربانی هر گاو، قوچ یا برّه یا بزغاله چنین عمل کنید. | 11 |
Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.
برای هر قربانیای که تقدیم میکنید، این دستورها باید رعایت شود. | 12 |
Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
هر اسرائیلی بومی که هدیۀ مخصوص به عنوان هدیۀ خوشبو به خداوند تقدیم میکند، باید این دستورها را رعایت کند. | 13 |
“‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
و اگر میهمان شما یا غریبی که در میان شما ساکن است بخواهد هدیۀ مخصوصی به عنوان هدیۀ خوشبو به خداوند تقدیم کند، باید همین دستورها را رعایت کند. | 14 |
Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya.
اسرائیلی بومی و شخص غریب در پیشگاه خداوند یکسانند و تابع یک قانونند. این است قانونی ابدی برای همۀ نسلهای شما. | 15 |
Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
برای شما و غریبی که در میان شما ساکن است یک حکم و یک قانون خواهد بود.» | 16 |
Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’”
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
«این دستورها را به قوم اسرائیل بده: «وقتی به سرزمینی که میخواهم به شما بدهم وارد شدید، | 18 |
“Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,
هرگاه از محصول آن زمین بخورید باید قسمتی از آن را به عنوان هدیهٔ مخصوص به خداوند تقدیم کنید. | 19 |
ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
قرص نانی از نخستین گندمی که آرد میکنید درست کنید و آن را بهعنوان هدیه مقدّس تقدیم کنید، همانگونه که در نخستین برداشت خرمن انجام میدهید. | 20 |
Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.
این هدیهای است سالیانه از نخستین خمیر نان شما که باید نسل اندر نسل به خداوند تقدیم شود. | 21 |
Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
«هرگاه شما ناخواسته در انجام این دستورهایی که خداوند بهوسیلهٔ موسی به شما داده است کوتاهی کنید، | 22 |
“‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
و نسلهای شما در آینده از انجام آنچه خداوند به موسی داده است کوتاهی کنند، | 23 |
bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
اگر این کار، ناخواسته و بدون آگاهی جماعت انجام شده باشد، آنگاه تمامی جماعت باید یک گوسالۀ نر برای قربانی سوختنی به عنوان هدیۀ خوشبو برای خداوند تقدیم کنند. این قربانی باید طبق معمول با هدیهٔ آردی و هدیهٔ نوشیدنی و نیز یک بز نر برای قربانی گناه تقدیم گردد. | 24 |
Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
کاهن برای تمام قوم اسرائیل کفاره نماید و ایشان بخشیده خواهند شد، زیرا ندانسته مرتکب اشتباه شدهاند و برای این عمل خود، به حضور خداوند قربانی سوختنی و نیز قربانی گناه تقدیم نمودهاند. | 25 |
Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
تمام بنیاسرائیل و غریبانی که در میان ایشان ساکنند، آمرزیده میشوند، زیرا این اشتباه متوجه تمام جماعت میباشد. | 26 |
A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.
«اگر این اشتباه را فقط یک نفر مرتکب شود، در آن صورت باید یک بز مادهٔ یک ساله را به عنوان قربانی گناه تقدیم نماید | 27 |
“‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie.
و کاهن در حضور خداوند برایش کفاره کند و او بخشیده خواهد شد. | 28 |
Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.
این قانون شامل حال غریبانی که در میان شما ساکنند نیز میشود. | 29 |
Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.
«ولی کسی که دانسته مرتکب چنین اشتباهی شود، خواه اسرائیلی باشد، خواه غریب، نسبت به خداوند، گناه کرده است و باید از میان قوم خود منقطع شود، | 30 |
“‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
زیرا او کلام خداوند را خوار شمرده و از حکم او سرپیچی کرده است. او بدون شک باید منقطع شود و تقصیرش بر گردنش خواهد بود.» | 31 |
Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’”
یک روز که قوم اسرائیل در بیابان بودند، مردی به هنگام جمعآوری هیزم در روز شبّات، غافلگیر شد. | 32 |
Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
پس او را گرفته، پیش موسی و هارون و سایر رهبران بردند. | 33 |
Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
ایشان او را به زندان انداختند، زیرا روشن نبود که در این مورد چه باید کرد. | 34 |
Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.
خداوند به موسی فرمود: «این شخص باید کشته شود. تمام قوم اسرائیل او را در خارج از اردوگاه سنگسار کنند تا بمیرد.» | 35 |
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”
پس او را از اردوگاه بیرون برده، همانطور که خداوند امر فرموده بود وی را کشتند. | 36 |
Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
«به قوم اسرائیل بگو که برای لبۀ لباسهای خود منگولههایی درست کنند. این حکمی است که باید نسل اندر نسل رعایت شود. منگولهها را با نخ آبی به حاشیهٔ لباس خود وصل نمایند. | 38 |
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya.
هدف از این قانون آنست که هر وقت منگولهها را ببینید، احکام خداوند را به یاد آورده، آنها را اجرا کنید و به دنبال شهوتهای دل و چشم خود که شما را به هرزگی میکشند، نروید. | 39 |
Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile Onyenwe anyị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu.
این قانون به شما یادآوری خواهد کرد که همۀ فرمانهای مرا به یاد آورده، آنها را اجرا کنید، و برای خدای خود مقدّس باشید. | 40 |
Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu.
من یهوه، خدای شما هستم که شما را از مصر بیرون آوردم. من یهوه، خدای شما هستم!» | 41 |
Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”