< داوران 5 >

آنگاه دبوره و باراق این سرود را به مناسبت پیروزی خود سراییدند: 1
Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị,
«خداوند را ستایش کنید! رهبران اسرائیل شجاعانه به جنگ رفتند، و قوم با اشتیاق از آنها پیروی نمودند. 2
“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!
«ای پادشاهان و ای حکام گوش کنید! من در وصف خداوند خواهم سرایید، و برای خدای اسرائیل سرود خواهم خواند. 3
“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
«ای خداوند، وقتی از سعیر بیرون آمدی و صحرای ادوم را ترک فرمودی، زمین متزلزل گردید و آسمان قطرات بارانش را فرو ریخت. 4
“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.
آری، حتی کوه سینا از حضور یهوه خدای اسرائیل به لرزه درآمد! 5
E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
«در ایام شمجر و یاعیل شاهراهها متروک بودند. مسافران از کوره راههای پر پیچ و خم عبور می‌کردند. 6
“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
اسرائیل رو به زوال می‌رفت، تا اینکه دبوره برخاست تا همچون مادری از اسرائیل حمایت کند. 7
Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
چون اسرائیل به دنبال خدایان تازه رفت، جنگ به دروازه‌های ما رسید. در میان چهل هزار مرد اسرائیلی، نه نیزه‌ای یافت می‌شد و نه سپری. 8
Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
قلب من مشتاق رهبران اسرائیل است که با اشتیاق تمام، خود را وقف کردند. خداوند را ستایش کنید، 9
Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị!
ای کسانی که بر الاغهای سفید سوارید و بر فرشهای گرانبها می‌نشینید، و ای کسانی که پای پیاده راه می‌روید. 10
“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ
گوش کنید! سرایندگان، گرد چاهها جمع شده‌اند تا پیروزیهای عادلانۀ خداوند را بسرایند. آری، آنان می‌سرایند که چگونه خداوند اسرائیل را توسط روستائیان پیروز ساخت، و چگونه قوم خداوند از دروازه‌های دشمن گذشتند! 11
olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.
«”بیدار شو ای دبوره! بیدار شو و سرود بخوان. برخیز ای باراق! ای فرزند ابینوعم، برخیز و اسیرانت را به اسارت ببر!“ 12
‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’
«مردان امین از کوه سرازیر شدند، قوم خداوند برای جنگ نزد او آمدند. 13
“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.
برخی از قبایل افرایم که ریشه در عمالیق دارند آمدند؛ بنیامین با مردانی بود که تو را پیروی می‌کردند. از ماخیر فرماندهان فرود آمدند، و از زبولون کسانی که عصای فرمانروایی در دست داشتند. 14
Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
رهبران یساکار با دبوره و باراق، به دره هجوم بردند. اما قبیلهٔ رئوبین مردد بود. 15
Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
چرا رئوبین در میان آغلها ماند؟ آیا می‌خواست به نوای نی شبانان گوش دهد؟ آری قبیلهٔ رئوبین مردد بود! 16
Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
چرا جلعاد در آن سوی رود اردن ماند؟ چرا دان نزد کشتی‌هایش توقف نمود؟ چرا اشیر کنار دریا نزد بنادر خود ساکت نشست؟ 17
Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
اما قبایل زبولون و نفتالی جان خود را در میدان نبرد به خطر انداختند. 18
Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
«پادشاهان کنعان در تعنک نزد چشمه‌های مجدو جنگیدند، اما پیروزی را به چنگ نیاوردند. 19
“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.
ستارگان از آسمان با سیسرا جنگیدند. 20
Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
رود خروشان قیشون، دشمن را با خود برد. ای جان من با شهامت به پیش برو. 21
Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!
صدای پای اسبان دشمن را بشنوید! ببینید چگونه چهار نعل می‌تازند و دور می‌شوند! 22
Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
فرشتهٔ خداوند می‌گوید:”میروز را لعنت کنید، ساکنانش را به سختی لعنت نمایید، زیرا به کمک خداوند نیامدند تا او را در جنگ با دشمنان یاری دهند.“ 23
Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’
«آفرین بر یاعیل، زن حابر قینی، خداوند او را برکت دهد، بیش از تمامی زنان خیمه نشین! 24
“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.
سیسرا آب خواست، اما یاعیل در جامی ملوکانه به وی شیر داد! 25
Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
آنگاه میخ چادر و چکش را برداشت و میخ را بر شقیقه‌اش کوبید و سرش را به زمین دوخت. 26
O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
او نزد پاهای یاعیل افتاد و جان سپرد. 27
Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
«مادر سیسرا از پنجرهٔ اتاقش چشم به راه او دوخته بود و می‌گفت:”چرا ارابه‌اش نمی‌آید؟ چرا صدای چرخهای ارابه‌اش را نمی‌شنوم؟“ 28
“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
«ندیمه‌های خردمندش با او همصدا شده گفتند: 29
Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,
”غنیمت فراوان به چنگ آورده‌اند و برای تقسیم آن وقت لازم دارند. یک یا دو دختر نصیب هر سرباز می‌شود. سیسرا جامه‌های رنگارنگ به ارمغان خواهد آورد، شالهای قلابدوزی برای گردن ما با خود خواهد آورد.“ 30
‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’
«ای خداوند تمامی دشمنانت همچون سیسرا نابود گردند. اما کسانی که تو را دوست دارند مثل خورشید باشند وقتی در قوّتش طلوع می‌کند.» بعد از آن، به مدت چهل سال آرامش در سرزمین بنی‌اسرائیل برقرار گردید. 31
“Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.

< داوران 5 >