< یوشع 18 >

تمام قوم اسرائیل در شیلوه جمع شدند و خیمهٔ ملاقات را بر پا کردند. هر چند آنها بر تمام سرزمین مسلط شده بودند، ولی هنوز هفت قبیله باقی مانده بودند که ملکی نداشتند. 1
Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,
2
ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.
پس یوشع به آنها گفت: «تا کی می‌خواهید سهل‌انگاری کنید؟ چرا نمی‌روید و زمینهایی را که خداوند، خدای اجدادتان به شما داده است، تصرف نمی‌کنید؟ 3
Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?
از هر قبیله سه مرد انتخاب کنید. من آنها را می‌فرستم تا آن زمینها را بررسی کنند و از وضع آنها به من گزارش دهند تا بتوانم زمینها را بین شما تقسیم کنم. 4
Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.
آنها باید زمین را به هفت قسمت تقسیم کنند و گزارش آن را برای من بیاورند تا من در حضور خداوند، خدایمان سهم هفت قبیله را به حکم قرعه تعیین نمایم. «قبیلهٔ یهودا و قبیلهٔ یوسف که قبلاً به ترتیب زمینهای جنوب و شمال را گرفته‌اند در همان جا می‌مانند. 5
Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.
6
Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.
قبیلهٔ لاوی هم از زمین سهمی ندارند، زیرا آنها کاهن هستند و خدمت خداوند سهم ایشان است. قبایل رئوبین و جاد و نصف قبیلهٔ منسی هم که قبلاً سهم خود را در سمت شرقی رود اردن که موسی برای ایشان تعیین نموده بود، گرفته‌اند.» 7
Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”
پس آن افراد رفتند تا زمینها را بررسی کنند و گزارش آن را برای یوشع بیاورند تا او در شیلوه در حضور خداوند سهم هفت قبیله را به حکم قرعه تعیین کند. 8
Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”
فرستادگان یوشع مطابق دستوری که یافته بودند عمل کردند. زمینها را به هفت قسمت تقسیم نمودند و نام شهرهای هر قسمت را نوشتند. سپس به اردوگاه شیلوه نزد یوشع بازگشتند. 9
Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo.
یوشع در حضور خداوند قرعه انداخت و زمینها را بین آن هفت قبیله تقسیم کرد. 10
Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.
اولین قرعه به نام بنیامین درآمد. زمین خاندانهای این قبیله، بین زمینهای دو قبیلهٔ یهودا و یوسف قرار داشت. 11
Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.
مرز آنها در شمال از رود اردن شروع شده، به طرف شمال اریحا بالا می‌رفت. سپس از وسط کوهستان گذشته، به صحرای بیت‌آون در غرب می‌رسید. 12
Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.
بعد به طرف جنوب لوز (که همان بیت‌ئیل است) کشیده شده، به طرف عطاروت ادار که در منطقهٔ کوهستانی جنوب بیت‌حورون پایین واقع است سرازیر می‌شد. 13
Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.
مرز غربی از کوهستان جنوب بیت‌حورون به طرف جنوب کشیده شده، به قریۀ بعل (همان قریهٔ یعاریم) که یکی از شهرهای یهوداست می‌رسید. 14
Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.
مرز جنوبی از انتهای قریهٔ بعل در غرب شروع می‌شد و به طرف چشمه‌های نفتوح کشیده شده، 15
Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.
از آنجا به دامنهٔ کوهی که مقابل درهٔ هنوم (واقع در شمال درهٔ رفائیم) است، امتداد می‌یافت. سپس، از درهٔ هنوم می‌گذشت و جنوب سرزمین یبوسیان را قطع می‌کرد و به عین روجل می‌رسید. 16
O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.
این خط مرزی از عین روجل به طرف شمال به عین شمس می‌رفت و بعد به جلیلوت که در مقابل گذرگاه ادومیم قرار دارد، می‌رسید. سپس به طرف سنگ بوهن (بوهن پسر رئوبین بود) سرازیر شده، 17
Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
از شمال زمینی که مقابل درهٔ اردن است می‌گذشت. سپس به درهٔ اردن سرازیر می‌شد 18
O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,
و از آنجا به سمت شمال بیت‌حجله کشیده می‌شد و به خلیج شمالی دریای مرده که در انتهای جنوبی رود اردن است، منتهی می‌شد. این بود مرز جنوبی. 19
ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.
رود اردن، مرز شرقی زمین بنیامین را تشکیل می‌داد. این زمینی است که برای خاندانهای قبیلهٔ بنیامین تعیین گردید. 20
Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile.
شهرهایی که به خاندانهای قبیلهٔ بنیامین تعلق داشت، از این قرارند: اریحا، بیت‌حُجله، عِیمَق قصیص، 21
Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị: Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz,
بیت‌عربه، صمارایم، بیت‌ئیل، 22
Bet-Araba, Zemaraim, Betel,
عَویم، فاره، عُفرَت، 23
Avim, Para, Ofra,
کَفَرعمونی، عُفنی و جابع، جمعاً دوازده شهر با روستاهای اطراف. 24
Kefa Amoni, Ofni, Geba, obodo iri na abụọ na obodo nta ha ndị ọzọ.
جبعون، رامه، بئیروت، 25
Na Gibiọn, Rema, Beerọt,
مصفه، کفیره، موصه، 26
Mizpa, Kefira, Moza,
راقم، یرفئیل، تراله، 27
Rekem, Iapeel, Tarala,
صیله، آلف، یبوسی (اورشلیم)، جِبعه و قریهٔ یعاریم، جمعاً چهارده شهر با روستاهای اطراف. این بود ملکی که به خاندانهای قبیلهٔ بنیامین داده شد. 28
Zela, Haelef na obodo ndị Jebus, nke aha ya bụ Jerusalem, Gibea na Kiriat Jearim, obodo iri na anọ na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin maka ikwu ya niile.

< یوشع 18 >