< ارمیا 30 >

پیام دیگری از جانب خداوند بر اِرمیا نازل شد: 1
Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
«یهوه خدای اسرائیل چنین می‌گوید: هر آنچه به تو گفته‌ام در طوماری بنویس، 2
“Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.
چون زمانی فرا خواهد رسید که بر قوم خود اسرائیل و یهودا نظر لطف خواهم انداخت و ایشان را به این سرزمین که به پدرانشان داده‌ام باز خواهم آورد تا دوباره مالک آن شوند و در آن زندگی کنند.» 3
Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
پس خداوند دربارهٔ اسرائیل و یهودا چنین فرمود: 4
Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.
«فریاد وحشت به گوش می‌رسد؛ ترس بر همه جا حکمفرماست و آرامشی نیست! 5
“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
آیا مرد، آبستن می‌شود؟ پس چرا مردان مانند زنانی که می‌زایند، دستهای خود را بر کمر گذاشته‌اند و رنگشان پریده است؟ 6
Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
روز هولناکی در پیش است! نظیر آن تا به حال دیده نشده است؛ آن روز، زمان سختی قوم من است، ولی از آن نجات خواهند یافت. 7
Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
«خداوند لشکرهای آسمان می‌فرماید: در آن روز، یوغ بندگی را از گردنشان برداشته، خواهم شکست، زنجیرها را از دست و پایشان باز خواهم کرد و دیگر بیگانگان را بندگی نخواهند نمود، 8
“‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
بلکه ایشان یهوه، خدای خود و داوود، پادشاه خویش را که بر آنها می‌گمارم، خدمت خواهند کرد. 9
Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
«پس ای فرزندان بندهٔ من یعقوب، نترسید! ای اسرائیل، هراس به خود راه ندهید! من شما و فرزندانتان را از نقاط دور دست و از سرزمین تبعید به وطنتان باز خواهم گرداند و در آنجا، در امنیت و آسایش زندگی خواهید کرد و دیگر کسی باعث ترس شما نخواهد شد. 10
“‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
من با شما هستم و نجاتتان خواهم داد؛ حتی اگر قومهایی را که شما را در میانشان پراکنده کردم، به کلی تارومار کنم، شما را از بین نخواهم برد؛ البته شما را بی‌تنبیه نخواهم گذاشت، اما تنبیه شما منصفانه و عادلانه خواهد بود.» 11
Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
این است آنچه خداوند می‌فرماید: «ای قوم من، گناه تو مانند زخمی است علاج‌ناپذیر! 12
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
کسی نیست که تو را یاری دهد یا زخمهایت را ببندد؛ دارو و درمان هم دیگر فایده ندارد. 13
O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
تمام دلباختگانت تو را ترک کرده‌اند و حتی حالت را نیز نمی‌پرسند. تو را بی‌رحمانه زخمی کرده‌ام گویی دشمنت بوده‌ام؛ تو را سخت تنبیه کرده‌ام، چون گناهانت بسیار و شرارتت بزرگ است! 14
Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
«چرا به مجازاتت اعتراض داری؟ درد تو، درمانی ندارد! تو را این گونه سخت مجازات کرده‌ام، چون گناهانت بسیار و شرارتت بزرگ است! 15
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
«ولی در آن روز، تمام کسانی که تو را می‌درند، دریده خواهند شد. تمام دشمنانت به اسارت خواهند رفت. کسانی که تو را غارت می‌کنند، غارت خواهند شد، و کسانی که به تو ظلم می‌کنند، مورد ظلم قرار خواهند گرفت. 16
“‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
سلامتی و تندرستی را به تو باز خواهم گرداند و زخمهایت را شفا خواهم داد، هر چند که اکنون تو را”فراموش شده“و اورشلیم را”شهر متروک“می‌نامند. 17
Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
«من، خداوند، قوم خود را به سرزمینشان باز خواهم گرداند و خانواده‌های ایشان را مورد لطف خود قرار خواهم داد. شهر اورشلیم بر روی خرابه‌هایش باز بنا خواهد شد، قصر پادشاهی آن بازسازی شده، مانند گذشته خواهد گشت 18
“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
و شهرها غرق خوشی و شکرگزاری خواهند شد. من ایشان را برکت خواهم داد تا افزوده شوند و قومی سربلند و محترم باشند. 19
Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.
کامیابی دوران گذشته را به ایشان باز خواهم گرداند و آنها را استوار و پایدار خواهم ساخت؛ و هر که را به ایشان ستم کند، مجازات خواهم نمود. 20
Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
حاکم ایشان دیگر از بیگانگان نخواهد بود بلکه از میان قوم خودشان برخواهد خاست. من او را خواهم خواند تا کاهن عبادتگاه من باشد و به نزد من آید، زیرا چه کسی جرأت دارد بدون آنکه او را خوانده باشم، نزد من آید؟ 21
Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
آنگاه ایشان قوم من خواهند بود و من خدای ایشان!» 22
‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’”
گردباد ویران کنندهٔ غضب خداوند ناگهان می‌خروشد و بر سر بدکاران نازل می‌شود. 23
Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.
غضب شدید خداوند فرو نخواهد نشست تا مقصود او را به طور کامل به انجام رساند! در روزهای آینده این را خواهید فهمید. 24
Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.

< ارمیا 30 >