< اشعیا 15 >

این است پیغام خدا برای سرزمین موآب: شهرهای عار و قیرِ موآب در یک شب ویران می‌شوند. 1
Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
در دیبون قوم عزادار موآب به بتخانه‌ها پناه می‌برند تا برای شهرهای نبو و میدبا گریه کنند. همهٔ مردم موی سر و ریش خود را تراشیده، 2
Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
لباس عزا پوشیده‌اند و در کوچه‌ها راه می‌روند. از هر خانه‌ای صدای شیون و زاری بلند است. 3
Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.
صدای گریهٔ شهرهای حشبون و العاله تا یاهص نیز شنیده می‌شود. حتی جنگاوران موآب نیز ناله می‌کنند و از شدت ترس می‌لرزند. 4
Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.
دلم برای موآب نالان است. مردم موآب به صوغر و عجلت شلشیا فرار می‌کنند؛ با گریه از گردنهٔ لوحیت بالا می‌روند؛ صدای نالهٔ ایشان در طول راه حورونایم به گوش می‌رسد. 5
Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
رودخانهٔ نمریم خشک شده است! علف سرسبز کنار رودخانه‌ها پلاسیده و نهالها از بین رفته‌اند. 6
Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
مردم اندوختهٔ خود را برمی‌دارند تا از راه درهٔ بیدها فرار کنند. 7
Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
شیون موآب در مرزهای آن طنین افکنده است و صدای زاری آن تا به اجلایم و بئرایلیم رسیده است. 8
Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
رودخانهٔ دیمون از خون سرخ شده است، ولی خدا باز هم اهالی دیمون را مجازات خواهد کرد. بازماندگان و فراریان موآب نیز جان به در نخواهند برد و طعمهٔ شیر خواهند شد. 9
Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara, ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn! Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụ tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.

< اشعیا 15 >