< حِزِقیال 41 >
آنگاه آن مرد مرا به اتاق اول معبد یعنی قدس برد. او اول درگاه قدس را اندازه گرفت: از بیرون به داخل سه متر و | 1 |
Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ.
پهنای آن پنج متر بود. دیوارهای طرفین آن هر یک به عرض دو متر و نیم بودند. بعد خود قدس را اندازه گرفت؛ طول آن بیست متر و عرض آن ده متر بود. | 2 |
Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.
سپس به اتاق اندرون که پشت قدس بود رفت و چارچوب درگاه آن را اندازه گرفت؛ از بیرون به داخل یک متر و پهنای آن سه متر بود. دیوارهای طرفین آن هر یک به عرض یک متر و نیم بودند. | 3 |
Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.
سپس اتاق اندرونی را اندازه گرفت؛ ده مترمربع بود. او به من گفت: «این قدسالاقداس است.» | 4 |
Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”
بعد دیوار خانهٔ خدا را اندازه گرفت. ضخامتش سه متر بود. دور تا دور قسمت بیرونی این دیوار یک ردیف اتاقهای کوچک به عرض دو متر وجود داشت. | 5 |
Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.
این اتاقها در سه طبقه ساخته شده و هر طبقه شامل سی اتاق بود. قسمت بیرونی دیوار خانهٔ خدا به صورت پله بود و سقف اتاقهای طبقهٔ اول و دوم به ترتیب روی پلهٔ اول و دوم قرار میگرفت. به طوری که اتاقهای طبقهٔ سوم از اتاقهای طبقهٔ دوم، و اتاقهای طبقهٔ دوم از اتاقهای طبقهٔ اول، بزرگتر بودند. بدین ترتیب سنگینی اتاقها روی پلهها قرار میگرفت و به دیوار خانهٔ خدا فشار وارد نمیشد. در دو طرف خانهٔ خدا در قسمت بیرونی اتاقها، پلههایی برای رفتن به طبقات بالا درست شده بود. | 6 |
Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.
ضخامت دیوار بیرونی این اتاقها دو متر و نیم بود. یک در از طرف شمال خانهٔ خدا و یک در از طرف جنوب آن به سوی این اتاقها باز میشد. من متوجه شدم که دور تا دور خانهٔ خدا یک سکو، همکف با اتاقهای مجاور وجود داشت که سه متر بلندتر از زمین بود و با پهنای دو متر و نیم دور تا دور خانهٔ خدا را فرا گرفته بود. در دو طرف خانهٔ خدا در حیاط داخلی، به فاصلهٔ ده متر دورتر از سکوها، یک سری اتاق به موازات اتاقهای مجاور خانهٔ خدا ساخته شده بود. | 8 |
Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ.
Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ,
na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.
یک ساختمان در سمت غربی و روبروی حیاط خانهٔ خدا قرار داشت که عرض آن سی و پنج متر، و طولش چهل و پنج متر و ضخامت دیوارهایش دو متر و نیم بود. | 12 |
Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ.
سپس آن مرد از بیرون، طول خانهٔ خدا را اندازه گرفت؛ اندازهٔ آن پنجاه متر بود. در ضمن، از پشت دیوار غربی خانهٔ خدا تا انتهای دیوار ساختمان واقع در غرب خانهٔ خدا، که در واقع شامل حیاط پشتی خانهٔ خدا و تمام عرض آن ساختمان میشد، پنجاه متر بود. | 13 |
Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
پهنای حیاط داخلی جلوی خانهٔ خدا نیز پنجاه متر بود. | 14 |
Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ.
او طول ساختمان واقع در سمت غربی خانهٔ خدا را نیز اندازه گرفت. آن هم با احتساب دیوارهای دو طرفش، پنجاه متر بود. اتاق ورودی خانهٔ خدا، قدس و قدسالاقداس، | 15 |
Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,
همه از کف تا پنجرهها روکش چوب داشتند. پنجرهها نیز پوشانده میشدند. | 16 |
ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.
بر دیوارهای داخلی خانهٔ خدا تا قسمت بالای درها نقشهای کروبی و نخل، به طور یک در میان، حکاکی شده بودند. هر کدام از کروبیان دو صورت داشت: | 17 |
Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,
ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:
یکی از دو صورت که شبیه صورت انسان بود رو به نقش نخل یک سمت، و صورت دیگر که مثل صورت شیر بود رو به نقش نخل سمت دیگر بود. دور تا دور دیوار داخلی خانهٔ خدا به همین شکل بود. | 19 |
otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.
چارچوب درهای قدس مربع شکل بود و چارچوب در قدسالاقداس نیز شبیه آن بود. | 21 |
Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
یک مذبح چوبی به ارتفاع یک متر و نیم و مساحت یک مترمربع، در آنجا قرار داشت. گوشهها، پایه و چهار طرف آن همه از چوب بود. آن مرد با اشاره به مذبح چوبی به من گفت: «این میزی است که در حضور خداوند میباشد.» | 22 |
Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
در انتهای راه ورودی قدس یک در بود و نیز در انتهای راه ورودی قدسالاقداس در دیگری وجود داشت. | 23 |
Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
این درها دو لنگه داشتند و از وسط باز میشدند. | 24 |
Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.
درهای قدس نیز مانند دیوارها با نقشهای کروبیان و نخلها تزیین شده بودند. بر بالای قسمت بیرونی اتاق ورودی، یک سایبان چوبی قرار داشت. | 25 |
A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.
بر دیوارهای دو طرف این اتاق نیز نقشهای نخل حکاکی شده بود، و پنجرههایی در آن دیوارها قرار داشت. اتاقهای مجاور خانهٔ خدا نیز دارای سایبان بودند. | 26 |
Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.