< حِزِقیال 18 >

بار دیگر خداوند به من پیغامی داد و فرمود: 1
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, sị,
«چرا مردم در سرزمین اسرائیل این مَثَل را به کار می‌برند که”غوره را پدران خوردند و دندان فرزندانشان کُند شد“؟ 2
“Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel? “‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha, eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’
به حیات خود قسم که شما دیگر در اسرائیل این مَثَل را به کار نخواهید برد، 3
“Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel.
چون جان همه، برای داوری و محاکمه در دست من است، چه جان پدران، چه جان پسران؛ و قانون من برای داوری این است: هر که گناه کند، فقط خودش خواهد مرد. 4
Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.
«کسی که عادل و با انصاف و درستکار باشد، 5
“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
و به کوهها برای پرستش بتهای اسرائیل نرود؛ زنا نکند و با زنی که در دوران قاعدگی‌اش است، همبستر نشود؛ 6
onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị, onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya, maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
ظلم نکند؛ گرو بدهکار را به او برگرداند؛ مال مردم را نخورد، بلکه گرسنگان را سیر کند و برهنگان را بپوشاند؛ 7
Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ, kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe, ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
قرض بدهد و سود نگیرد؛ از ستم دوری کند و در مورد دیگران درست و بدون غرض قضاوت نماید؛ 8
Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa, ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha. Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
و خلاصه تمام دستورها و قوانین مرا اطاعت کند، چنین شخص درستکار و نیکوکردار است و به یقین زنده خواهد ماند. این را خداوند یهوه می‌گوید. 9
Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
«ولی اگر یک چنین شخصی، پسری ستم‌پیشه و یا آدمکش داشته باشد و مرتکب تمام این کارهای زشت بشود، 10
“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,
و نخواهد آن اعمال نیک را بجا آورد، بلکه بر کوهها بت‌پرستی نماید؛ همسر مرد دیگری را اغفال کند؛ 11
ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a: “Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu, na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;
به فقرا و مستمندان ظلم کند؛ مال مردم را بخورد؛ گرو بدهکاران را پس ندهد؛ بتها را دوست بدارد و آنها را بپرستد؛ 12
Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
و رباخوار باشد؛ آیا این شخص زنده خواهد ماند؟ به هیچ وجه! او به سبب همه کارهای زشتی که انجام داده است، خواهد مرد و خونش بر گردن خودش خواهد بود. 13
Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma. O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.
«ولی اگر این پسر گناهکار نیز پسری داشته باشد که تمام گناهان پدرش را ببیند و تصمیم بگیرد خداترس باشد و برخلاف روش پدرش زندگی کند؛ 14
“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.
برای پرستش بتها به کوهها نرود؛ زنا نکند؛ 15
“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel. Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
ظلم نکند؛ گرو نگیرد؛ مال دیگران را نخورد، بلکه گرسنگان را سیر کند و برهنگان را بپوشاند؛ 16
Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;
مستمندان را دستگیری نماید و رباخوار نباشد و دستورها و قوانین مرا اطاعت کند، او به سبب گناهان پدرش نخواهد مرد، بلکه بی‌گمان زنده خواهد ماند. 17
ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla, na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego, na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile. Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.
اما پدرش به سبب گناهان خودش خواهد مرد، چون نسبت به دیگران بی‌رحم بوده و مال مردم را غصب کرده و اعمال نادرست در میان قوم انجام داده است. 18
Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.
«ممکن است بپرسید که چرا پسر برای گناهان پدرش مجازات نمی‌شود؟ به این دلیل که پسر درستکار و راستکردار بوده و احکام و قوانین مرا اطاعت نموده است. بنابراین بی‌گمان زنده خواهد ماند. 19
“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ.
هر که گناه کند، خودش خواهد مرد! نه پسر برای گناهان پدرش مجازات خواهد شد و نه پدر برای گناهان پسرش. انسان خوب و درستکار، پاداش خوبی و نیکوکاری خود را خواهد یافت و انسان بدکردار نیز به سزای اعمال خود خواهد رسید. 20
Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.
اما اگر شخص شروری از تمام بدیها و گناهان خود دست بکشد و مطیع احکام و قوانین من گردد و راستی و انصاف را پیشهٔ خود سازد، به یقین زنده مانده، نخواهد مرد. 21
“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
تمام گناهان گذشته او آمرزیده خواهد شد و به سبب راستکرداری‌اش، زنده خواهد ماند.» 22
Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere.
خداوند یهوه می‌فرماید: «آیا فکر می‌کنید که من از مردن شخص شریر، شاد می‌شوم؟ هرگز! شادی من در این است که او از راههای بد خویش بازگردد و زنده بماند. 23
Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?
اما اگر شخص درستکار عدالت را ترک گوید و مرتکب گناه گردد و مانند سایر گناهکاران رفتار کند، آیا او زنده خواهد ماند؟ البته که نه! تمام خوبی‌های گذشته‌اش نادیده گرفته می‌شود و به سبب خیانت و گناهانی که کرده است، خواهد مرد. 24
“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ.
«ولی شما می‌گویید:”روش خداوند منصفانه نیست!“ای قوم اسرائیل به من گوش دهید! آیا من بی‌انصافم یا شما؟ 25
“Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
وقتی شخص خوب از درستکاری دست کشد و به گناه روی آورد، به‌یقین خواهد مرد؛ او به سبب گناهانی که کرده است، خواهد مرد. 26
Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ.
و اگر شخص بدکار از بدی‌هایش دست بکشد و درستکار و با انصاف گردد، جان خود را نجات خواهد داد، 27
Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya.
زیرا به وضع بد خود پی برده و تصمیم گرفته است که از گناهان خود دست بکشد و زندگی درستی را در پیش بگیرد. بنابراین، او زنده مانده، نخواهد مرد. 28
Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.
«با وجود این، شما ای قوم اسرائیل می‌گویید:”روش خداوند منصفانه نیست!“ای قوم اسرائیل، آیا روش من غیرمنصفانه است، یا روش شما؟ 29
Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
ای بنی‌اسرائیل، من هر یک از شما را مطابق اعمالتان داوری خواهم نمود. پس تا فرصت دارید توبه کنید و از گناهان خود دست بکشید، تا باعث هلاکتتان نگردد! 30
“Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ.
گناهانتان را از خود دور نمایید و دل و روحی تازه در خود ایجاد کنید! ای قوم اسرائیل، چرا باید هلاک شوید؟ 31
Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ?
من از مرگ شما شاد نمی‌شوم. پس توبه کنید و زنده بمانید!» این را خداوند یهوه می‌گوید. 32
Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!

< حِزِقیال 18 >