< خروج 26 >

«خیمۀ عبادت را با ده پرده از کتان ریزبافتِ تابیده و نخهای آبی، ارغوانی و قرمز درست کن. روی آنها نقش کروبیان با دقت گلدوزی شود. 1
“Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
همه پرده‌ها به یک اندازه باشند، چهارده متر درازا و دو متر پهنا داشته باشند. 2
Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
ده پرده را پنج پنج به هم بدوز به طوری که دو قطعهٔ جداگانه تشکیل دهند. 3
Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
بر لبۀ آخرین پرده از دستۀ اول، حلقه‌هایی از پارچۀ آبی بساز و بر لبۀ آخرین پرده از دستۀ دوم نیز چنین کن. 4
Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
پنجاه حلقه بر یک پرده و پنجاه حلقه بر آخرین پرده از دستۀ دیگر بساز، به گونه‌ای که حلقه‌ها در برابر هم قرار داشته باشند. 5
Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
سپس پنجاه گیره از طلا بساز و پرده‌ها را با آنها به هم متصل کن تا پرده‌های دور خیمۀ عبادت به صورت یکپارچه درآیند. 6
Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu.
«پوشش سقف خیمۀ عبادت را از پشم بز به شکل چادر بباف. بر روی هم یازده قطعه پارچه. 7
“Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
این یازده قطعه پارچه به یک اندازه باشند، هر کدام به درازای پانزده متر و به عرض دو متر. 8
Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
پنج تا از آن قطعه‌ها را به هم بدوز تا یک قطعهٔ بزرگ تشکیل شود. شش قطعهٔ دیگر را نیز به همین ترتیب به هم بدوز. (قطعهٔ ششم از قسمت بالای جلوی خیمهٔ مقدّس آویزان خواهد شد.) 9
Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ.
در حاشیهٔ آخرین پرده از یک دسته، پنجاه حلقه درست کن و در حاشیۀ آخرین پرده از دستۀ دیگر نیز پنجاه حلقه بساز. 10
Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
سپس پنجاه گیرۀ مفرغین بساز و آنها را در حلقه‌ها قرار بده تا پوشش خیمه به هم وصل شده، یکپارچه گردد. 11
Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
قسمت اضافۀ پرده‌های پوشش، یعنی نیم پرده‌ای که اضافه است، در پشت خیمه آویخته شود. 12
Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ.
پرده‌های پوشش خیمه در دو طرف نیم متر بلندتر خواهد بود؛ این قسمت اضافه از دو طرف خیمه آویزان خواهد بود تا آن را بپوشاند. 13
Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.
دو پوشش دیگر درست کن یکی از پوست قوچ که رنگش سرخ شده باشد و دیگری از پوست خز، و آنها را به ترتیب روی پوشش اولی بینداز. بدین ترتیب سقف خیمۀ عبادت تکمیل می‌شود. 14
Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya.
«چوب‌بست خیمهٔ عبادت را از تخته‌های چوب اقاقیا بساز. 15
“Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
درازای هر تخته پنج متر و پهنای آن ۷۵ سانتی متر باشد. 16
Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara.
در هر طرف تخته، زبانه‌ای باشد تا با تختهٔ پهلویی جفت شود. تمام تخته‌های خیمۀ عبادت را اینطور درست کن. 17
Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
برای طرف جنوبی خیمۀ عبادت بیست تخته بساز 18
Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
و برای زیر آنها چهل پایهٔ نقره‌ای، یعنی دو پایه برای دو زبانۀ هر تخته. 19
Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
برای طرف دیگر خیمۀ عبادت، یعنی طرف شمال بیست تخته بساز 20
Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
و چهل پایهٔ نقره‌ای برای زیر آنها، یعنی دو پایه برای هر تخته. 21
Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
برای قسمت آخر خیمۀ عبادت، یعنی آخر بخش غربی، شش تخته بساز 22
Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
و برای هر یک از گوشه‌های قسمت آخر خیمه، دو تخته. 23
Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ.
این دو تخته باید از بالا و پایین به‌وسیلۀ حلقه‌ها به تخته‌ها وصل شوند. 24
Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.
پس جمعاً در انتهای خیمۀ عبادت باید هشت تخته با شانزده پایهٔ نقره‌ای باشد، زیر هر تخته دو پایه. 25
Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
«پشت‌بندهایی از چوب اقاقیا بساز تا به طور افقی تخته‌ها را نگه دارند: پنج تیر پشت‌بند برای تخته‌هایی که در سمت شمال قرار دارند، 26
“Jiri osisi akashia mee osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute,
پنج تیر برای تخته‌های سمت جنوب و پنج تیر برای تخته‌هایی که در طرف غربی انتهای خیمه قرار دارند. 27
ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
تیر وسطی باید به طور سراسری از وسط تخته‌ها بگذرد. 28
Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
«روکش تمام تخته‌ها از طلا باشد. برای نگه داشتن تیرها، حلقه‌هایی از طلا بساز. تیرها را نیز با روکش طلا بپوشان. 29
Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.
می‌خواهم این خیمه را درست همان‌طور بسازی که طرح و نمونهٔ آن را در بالای کوه به تو نشان داده‌ام. 30
“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.
«در داخل خیمه، یک پرده از کتان ریز‌بافت تابیده و نخهای آبی، ارغوانی و قرمز درست کن و نقش کروبیان را با دقت روی آن گلدوزی نما. 31
“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
چهار ستون از چوب اقاقیا با روکش طلا که چهار قلاب طلا هم داشته باشد بر پا کن. ستونها باید در چهار پایهٔ نقره‌ای قرار گیرند. پرده را به قلابها آویزان کن. 32
Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ.
این پرده باید بین”قدس“و”قدس‌الاقداس“آویزان شود تا آن دو را از هم جدا کند. صندوق عهد را که دو لوح سنگی در آن است در پشت این پرده قرار بده. 33
Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.
«صندوق عهد را با تخت رحمت که روی آن قرار دارد در قدس‌الاقداس بگذار. 34
Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ.
میز و چراغدان را در مقابل هم بیرون پرده قرار بده، به طوری که چراغدان در سمت جنوبی و میز در سمت شمالی قدس باشد. 35
Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.
«یک پرده دیگر برای مدخل خیمۀ عبادت از کتان ریز‌بافت تابیده که با نخهای آبی، ارغوانی و قرمز گلدوزی شده باشد، تهیه کن. 36
“Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
برای این پرده، پنج ستون از چوب اقاقیا با روکش طلا درست کن. قلابهایشان نیز از طلا باشد. برای آنها پنج پایهٔ مفرغین هم بساز. 37
Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.

< خروج 26 >