< جامعه 4 >
سپس ظلمهایی را که در زیر این آسمان میشد مشاهده کردم. اشکهای مظلومانی را دیدم که فریادرسی نداشتند. قدرت در دست ظالمان بود و کسی نبود که به داد مظلومان برسد. | 1 |
Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
پس گفتم کسانی که قبل از ما مردهاند از آنانی که هنوز زندهاند خوشبختترند؛ | 2 |
Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, ka ndị dị ndụ mma, bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.
و خوشبختتر از همه کسانی هستند که هنوز به دنیا نیامدهاند، زیرا ظلمهایی را که زیر این آسمان میشود ندیدهاند. | 3 |
Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.
همچنین متوجه شدم که به سبب حسادت است که مردم تلاش میکنند موفقیت کسب کنند. این نیز مانند دویدن به دنبال باد، بیهوده است. | 4 |
Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.
کسی که دست روی دست میگذارد و گرسنگی میکشد، نادان است. | 5 |
Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
یک مشت پُر با آرامش بهتر است از دو مشت پُر با مشقت و به دنبال باد دویدن. | 6 |
Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
و نیز در زیر آسمان بیهودگی دیگری دیدم: | 7 |
Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.
مردی بود که تنها زندگی میکرد؛ نه پسری داشت و نه برادری. با این حال سخت تلاش میکرد و از اندوختن مال و ثروت سیر نمیشد. او برای چه کسی زحمت میکشید و خود را از لذتهای زندگی محروم میکرد؟ این نیز رنج و زحمت بیهودهای است. | 8 |
Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.
دو نفر از یک نفر بهترند، زیرا نفع بیشتری از کارشان عایدشان میشود. | 9 |
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
اگر یکی از آنها بیفتد، دیگری او را بلند میکند؛ اما چه بیچاره است شخصی که میافتد ولی کسی را ندارد که به او کمک کند. | 10 |
Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
وقتی دو نفر کنار هم میخوابند، گرم میشوند؛ اما کسی که تنهاست چطور میتواند خود را گرم کند؟ | 11 |
Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
اگر شخص، تنها باشد و کسی بر او حمله کند، از پای درمیآید، اما اگر دو نفر باشند میتوانند از خود دفاع کنند. ریسمان سه لا به آسانی پاره نمیشود. | 12 |
Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
یک جوان فقیر و حکیم بهتر از پادشاه پیر و نادانی است که نصیحت نمیپذیرد. | 13 |
Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
چنین جوان فقیری حتی ممکن است از کنج زندان به تخت پادشاهی برسد. | 14 |
Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
مردمی که زیر این آسمان زندگی میکنند از چنین جوانی که جانشین پادشاه شده است حمایت مینمایند. | 15 |
Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
او میتواند بر عدهٔ زیادی حکومت کند؛ اما نسل بعدی، او را نیز برکنار میکند! این نیز مانند دویدن به دنبال باد، بیهوده است. | 16 |
A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.